Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/00 p. 8
  • “Èkwesịrị M Ịkwaga Ebe Ọzọ?”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Èkwesịrị M Ịkwaga Ebe Ọzọ?”
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kwaga Ebe A Chọkwuru Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Ì Nwere Ike ‘Ịgafe na Masedonia’?
    Ozi Alaeze Anyi—2011
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Ì Nwere Ike Ịgafeta Masedonia?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 9/00 p. 8

“Èkwesịrị M Ịkwaga Ebe Ọzọ?”

1 N’irube isi n’iwu Jisọs nyere ‘ịga mee mba nile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ,’ ọtụtụ ndị ohu Jehova raara onwe ha nye akwagawo ebe ọzọ iji jee ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. (Mat. 28:19) Ha na-eṅomi Pọl, bụ́ onye zara òkù ahụ bụ́: “Gabita na Masedonia, nyere anyị aka.” (Ọrụ 16:9) Olee otú a pụrụ isi mee nke a n’ụzọ kwesịrị ekwesị?

2 Were Otu Nzọụkwụ n’Otu Oge: È nwere ókèala a na-adịghị arụkebe ọrụ na ya n’ọgbakọ unu? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ itinye mgbalị n’ebe ndị ahụ. Tupu i kpebie ịkwaga ebe ọzọ, gwa ndị okenye gị iji hụ ma hà chere na i ruru eru ịkwaga ebe ọzọ. Ị pụkwara ịjụ onye nlekọta sekit gị ma ọ̀ maara ọgbakọ dị nso bụ́ ebe ị pụrụ ịmụba ozi gị. N’aka nke ọzọ, mgbe i jisịrị nlezianya gụkọọ ihe ọ ga-ewe, ị pụrụ ịchọ ịtụle inye aka n’akụkụ ọzọ nke mba gị ma ọ bụ n’ala ọzọ. Ọ bụrụ na nke a bụ ọchịchọ gị, gị na òtù ndị okenye nke ọgbakọ gị kwesịrị idegara alaka ụlọ ọrụ ebe i nwere mmasị ije ozi akwụkwọ, na-akọwapụta ọnọdụ gị n’ọchịchị Chineke. Ọ pụrụ ịbụ ihe amamihe dị na ya ileta ebe ahụ tupu i kpebie ma ị̀ ga-akwaga n’ebe ahụ kpam kpam ma ọ bụ na ị gaghị akwaga.

3 Kpachara Anya Banyere Ịkwaga Ebe Ọzọ: Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ụmụnna anyị na-akwaga n’ala dị iche iche n’ihi na ha na-achọ ọnọdụ ndụ ka mma ma ọ bụ nnwere onwe pụọ ná mmegbu. Ka ha na-eme nke a, ụfọdụ adabawo n’aka ndị na-enweghị ụkpụrụ bụ́ ndị na-ekwe nkwa inyere ha aka inweta ebe ha ga-anọ n’ala ọhụrụ ahụ ma na-emesị bụrụ ndị na-ewere ego ha ma gbahapụ ha. N’ọnọdụ ụfọdụ, ndị a na-agbalị ọbụna ịmanye ndị ahụ si mba ọzọ kwabata itinye aka n’omume rụrụ arụ. Mgbe ha jụrụ, a na-agbahapụ ha ná mba ahụ ha kwabatara na ya. N’ụzọ dị otú a, ọnọdụ ndị ahụ si mba ọzọ kwabata na-adị njọ karịa ka ọ dị ná mba ha. Ọ pụrụ ịdị ha mkpa ọbụna ịrịọ ụmụnna ka ha nye ha ụlọ ma ọ bụ nyere ha aka, na-atụkwasị ibu arọ n’ubu ezinụlọ ndị Kraịst ndị ọzọ bụ́ ndị na-agbalị ịnagide nsogbu na ihe isi ike ndị nke ha. Nkwagharị dị otú ahụ ezi uche na-adịghị na ya ekewawo ụfọdụ ezinụlọ n’ụzọ anụ ahụ, ọ kụdawokwa ezinụlọ dị iche iche aka n’ụzọ ime mmụọ.—1 Tim. 6:8-11.

4 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịkwaga ebe ọzọ maka ọdịmma gị, buru n’uche na n’agbanyeghị ebe i bi, e nwere nsogbu ndị ị ga-eche ihu. Ọ dị mfe imeri nsogbu n’ebe ị ma asụsụ na ọdịbendị ya karịa ịmalite n’isi n’ebe ị na-amaghị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya