Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/01 p. 1
  • ‘Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike’
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Okwu Chineke . . . Na-akpa Ike”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • Na-eru n’Obi Ndị Ị Na-akụziri Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Jiri Bible Na-eme Ihe nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Ị̀ Na-eji Okwu Chineke Eme Ihe Mgbe Nile?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 5/01 p. 1

‘Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike’

1 “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike,” ka Pọl onyeozi dere. (Hib. 4:12) Gịnị ka o bu n’uche kwuo nke ahụ? Okwu Chineke, ma ọ bụ ozi ya, nke dị n’ime Bible pụrụ inwe mmetụta dị ike n’ahụ ndị mmadụ. Amamihe nke dị n’ime Bible nwere ikike ịgbanwe ndụ mmadụ ịghọ nke ka mma. Nkasi obi na olileanya ọ na-enye na-adọta ụmụ mmadụ n’ebe Onye Na-enye Ndụ, bụ́ Jehova Chineke, nọ. Ozi dị n’ime ya pụrụ ime ka ndị nwere obi eziokwu malite ịga ije n’okporo ụzọ nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi. Otú ọ dị, iji hụ mmetụta ndị a, anyị aghaghị iji Bible na-eme ihe mgbe anyị na-agbara ndị ọzọ àmà.

2 Gụọ Otu Akụkụ Akwụkwọ Nsọ n’Ohere Ọ Bụla Dapụtaranụ: O yiri ka ọtụtụ ndị nkwusa hà enweela àgwà nke ejikebeghị Bible eme ihe n’ọnụ ụzọ. Ọ̀ dị gị otú ahụ? N’ihi na ọtụtụ ndị na-eyi ka ha enweghị ohere inwe mkparịta ụka dị ogologo, ikekwe i jiriwo nwayọọ nwayọọ nwee àgwà nke inyefe nanị akwụkwọ ma ọ bụ nanị ịkọwa otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Anyị na-agba ndị nkwusa nile ume ime ezigbo mgbalị ịgụ otu amaokwu ma ọ dịkarịa ala site na Bible mgbe ha na-eche ozi ọma ahụ n’ihu mmadụ, si otú a na-enye onye ahụ ohere ịhụ na ozi anyị dị n’ezie n’ime Okwu Chineke.

3 Ọ bụ ezie na ọ bụ mmadụ ole na ole na-eme ka ịgụ Bible bụrụ omume ha, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ka na-akwanyere ya ùgwù. Ọbụna ndị ji ọrụ n’aka, ọtụtụ mgbe, ga-ewepụta otu minit ma ọ bụ abụọ iji gee ntị n’ozi si kpọmkwem n’Okwu Chineke. Mgbe e ji ikpo ọkụ gụọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ kwesịrị ekwesị ma kọwaa ya ná mkpirikpi, ike nke okwu Jehova pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ onye ahụ na-ege ntị. Ma olee otú ị pụrụ isi jikọta okwu mmeghe gị na ịgụ otu amaokwu site na Bible?

4 Nwalee Nke A n’Ọrụ Magazin: Otu onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na-eji Akwụkwọ Nsọ eme ihe n’ụzọ dị irè mgbe ọ na-ekere òkè n’ọrụ magazin. Ọ na-etinye otu obere Bible n’ime akpa ya. Mgbe o chesịrị magazin n’ihu mmadụ ma kọwaa otu isiokwu n’ụzọ dị mkpirikpi, ọ na-emeghe Bible n’egbughị oge ma gụọ otu amaokwu nke dabara n’isiokwu ahụ. A pụrụ ime nke a nanị site n’ịjụ, sị, “Gịnị ka i chere banyere nkwa a na-enye agbamume?” wee gazie n’ihu ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ a họọrọ.

5 Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị isoro onye ọ bụla gere ntị tụlee otu amaokwu ma ọ bụ abụọ site na Bible. Ike ya na-akpali akpali pụrụ imeghere ọtụtụ ndị ọzọ ụzọ ịbụ ndị a dọtara n’ebe Chineke nọ.—Jọn 6:44.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya