Ntụleghachi Dabeere n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Vidio Bụ́ The New World Society in Action
Ka ị na-ekiri vidio a e mepụtara film ya na 1954, chee echiche banyere azịza nye ajụjụ ndị a: (1) Gịnị mere e ji mepụta film a na mbụ, gịnịkwa ka ọ rụzuru? (2) Akwụkwọ ndị dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova na-ebipụta, ọ̀ bụ maka ole ndị, n’ihi gịnịkwa? (3) Olee otú a ga-esi jiri nkesa nke magazin Ụlọ Nche n’oge a tụnyere nkesa ya na 1954? (4) N’afọ ndị na-adịbeghị anya, olee otú e siworo mee ka ọrụ obibi akwụkwọ anyị kwekọkwuo n’ọnọdụ ọgbara ọhụrụ? (5) Gịnị na-amasị gị banyere mgbakọ mba nile nke 1953 nke e nwere n’Ámá Egwuregwu Yankee? (6) Gịnị bụ Trailer City, ihe ndị dị aṅaa pụtara ìhè ka ị rịbara ama banyere ya? (7) Gịnị na-egosi na ọrụ anyị abụghị nanị maka otu mba, ma ọ bụ otu ndị? (8) Olee ụzọ ndị i siworo hụ mmụọ ịhụnanya nke nzukọ Jehova ji arụ ọrụ? (Ọma 133:1) (9) Olee ndị i chere ọ ga-amasị ịhụ ntụleghachi a dabeere n’akụkọ ihe mere eme banyere ihe omume nke òtù ụwa ọhụrụ ahụ laa azụ n’afọ ndị 1950?