Nwee Uche Zuru Okè Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
1 Okwu Chineke kọwara ugboro ugboro na ụbọchị Jehova ga-abịa “dị ka onye ohi”—ya bụ, na mberede, n’otu ntabi anya, n’agbaghị àmà. (1 Tesa. 5:2; Mat. 24:43; 2 Pita 3:10; Mkpu. 3:3; 16:15) “N’ihi nke a,” ka Jizọs na-ekwu, “gosipụtanụ na unu bụ ndị dị njikere, n’ihi na n’awa unu na-echeghị na ọ gaje ịbụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Mat. 24:44) Olee otú anyị pụrụ isi nọgide na-anọ na nche n’ụzọ ime mmụọ ka ọgwụgwụ na-abịaru nso? A na-ahụ ụzọ anyị pụrụ isi mee ya na ndụmọdụ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ bụ́: “Nweenụ uche zuru okè.”—1 Pita 4:7.
2 Inwe uche zuru okè gụnyere ile ihe anya n’ụzọ Jehova si ele ya anya. (Efe. 5:17) Ọ na-enyere anyị aka ile onwe anyị anya dị ka “ndị ala ọzọ na ndị na-ebi nwa oge” n’ime usoro ihe a. (1 Pita 2:11) Ọ na-enyere anyị aka ịghọta ihe dị mkpa n’ezie, ibute ihe ndị ka mkpa ụzọ, na ime mkpebi ndị dị mma.—Fil. 1:10.
3 Setịpụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ: Isetịpụ na iru ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ na-enyere anyị aka inwe uche zuru okè. Ì nwere ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ndị ị na-achụso ugbu a? Ị̀ na-agbalịsi ike ịgụ Bible kwa ụbọchị, ịga nzukọ nile nke Ndị Kraịst, ịgụ mbipụta ọ bụla nke Ụlọ Nche na Teta!, ma ọ bụ ikekwe, ịmụba òkè ị na-ekere n’ozi? Ọ bụrụ na i setịpụụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ ndị kwesịrị ekwesị, kpebisie ike iru ha, na-arịọkwa Jehova ka ọ gọzie mgbalị gị, ihe ndị ga-esi na ya pụta pụrụ iju gị anya.
4 Otu okenye jụrụ otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ ihe mgbaru ọsọ ime mmụọ ha setịpụrụ. Ajụjụ ahụ mere ka ha ghọta na ọ bụrụ na ha emee ka ndụ ha dịrị mfe ma kwụchapụ oké ụgwọ ndị ha ji, ha pụrụ ịsụ ụzọ. Ha kpebiri ime ka nke ahụ bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha. Ha gbalịsiri ike kwụchapụ ụgwọ ha ji ma chọọ ụzọ isi belata ihe omume ndị na-adịghị mkpa bụ́ ndị na-eri oge ha ma na-akpatara ha ike ọgwụgwụ. Mgbe otu afọ kpọmkwem gasịrị, ha ruru ihe mgbaru ọsọ ha. Gịnị si na ya pụta? Nke bụ́ di kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị esetịpụghị ihe mgbaru ọsọ, anyị agaraghị eru ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nwere obi ụtọ karị. Ndụ anyị dị jụụ ma ka mma. O nwere ezi nzube.”
5 Ka anyị na-echere ụbọchị Jehova, ka anyị nọgide na-anọ na nche n’ụzọ ime mmụọ site n’ibi ndụ n’uche zuru okè, na-elekwasị anya n’ime uche Chineke.—Taị. 2:11-13.