Ndị Ntorobịa—Tọọnụ Ezi Ntọala Maka Ọdịnihu
1. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị ntorobịa bụ́ Ndị Kraịst mkpa inwe okwukwe siri ike?
1 Olee ihe kasị dịrị gị n’obi? Gịnị ka ị na-eche banyere ya? Nchegbu ndị bụ́ isi ị na-enwe hà bụ banyere ihe ndị dị ugbu a ka ha na-agbatị ruo n’ọdịnihu ma na-elekwasị anya n’ihe ndị Chineke kwere ná nkwa? (Mat. 6:24, 31-33; Luk 8:14) Ọ dị mkpa inwe okwukwe siri ike iji mee ihe dabere ná nkwa Chineke, dị ka a pụrụ ịhụ n’ihe nlereanya nke Ebreham na Mozis. (Hib. 11:8-10, 24-26) Olee otú ị pụrụ isi nwee okwukwe dị otú ahụ ma tọọ “ezi ntọala maka ọdịnihu”?—1 Tim. 6:19.
2. Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe nlereanya nke Eze Josaịa?
2 Na-achọ Jehova: Ọ bụrụ na ị na-esoro ezinụlọ gị na-eme ihe omume ime mmụọ mgbe nile, nke ahụ kwesịrị ịja mma. Ma echela na ihe omume dị otú ahụ pụrụ ime ka i nwee okwukwe siri ike ma ọ bụrụ na i tinyeghị mgbalị. Iji chọta “ihe ọmụma Chineke,” ị ghaghị ịchọ Jehova n’onwe gị. (Ilu 2:3-5; 1 Ihe 28:9) Eze Josaịa na-eto eto mere nke ahụ. N’agbanyeghị na o tolitere n’ebe na-adịghị mma maka uto ime mmụọ, mgbe ọ dị afọ 15, “ọ malitere ịchọ Chineke nke Devid nna ya.”—2 Ihe 34:3.
3. Olee otú Ndị Kraịst na-eto eto taa pụrụ isi chọọ Jehova?
3 Olee otú ị pụrụ isi chọọ Jehova? Ọ bụ site n’inyocha ihe i kweere na ‘ịnwapụta n’onwe gị’ na ọ bụ nnọọ eziokwu. (Rom 12:2) Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ ịkọwa ihe Bible na-ekwu banyere ọbara ma ọ bụ gosi na Alaeze Chineke malitere ịchị n’eluigwe n’afọ 1914? Inweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu” bụ akụkụ dị mkpa nke ịtọ ezi ntọala maka ọdịnihu.—1 Tim. 2:3, 4.
4. Olee otú ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ isi mee ka ọganihu ha pụta ìhè?
4 Ọchịchọ Josaịa chọrọ Chineke rụpụtara ezi ihe. Tupu ya eruo afọ 20, o mere ihe iji kpochapụ ofufe ụgha n’ala ahụ n’atụghị egwu. (2 Ihe 34:3-7) N’otu aka ahụ, ọganihu ime mmụọ gị ga-apụta ìhè n’omume gị. (1 Tim. 4:15) Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, na-agbalịsi ike ime ka ụzọ i si ekwusa ozi ọma ka mma. Enwela afọ ojuju nanị n’inyefe akwụkwọ. Mee ka ọ bụrụ ihe mgbaru ọsọ gị iji Bible na-eme ihe, isoro ndị mmadụ na-atụgharị uche, na ime ka ndị gosiri mmasị nwekwuo mmasị. (Rom 12:7) Nke a ga-enyere gị aka ito eto n’ụzọ ime mmụọ.
5. Ohere ndị dị aṅaa ka Ndị Kraịst e mere baptizim nwere ịmụba ozi ha?
5 Na-enye Jehova Ihe Kasị Mma Ị Pụrụ Inye Ya: Mgbe i gosipụtara nrara ị raara onwe gị nye Jehova site n’ịbụ onye e mere baptizim, ị na-aghọ onye ozi a họpụtara ahọpụta nke Chineke. (2 Kọr. 3:5, 6) Nke a na-emeghere gị ohere iji jeere Jehova ozi oge nile. Ha na-agụnye ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ na ije ozi Betel nakwa ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. Ụzọ ndị ọzọ ị pụkwara isi mụbaa ozi gị bụ site n’ịmụ asụsụ ọzọ ma ọ bụ site n’ịkwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu iji jee ozi n’ebe ahụ.
6. Olee otú anyị nile pụrụ isi tọọ ezi ntọala maka ọdịnihu?
6 N’ezie, ọ bụghị mmadụ nile ga-enwe ike ikere òkè n’ihe ùgwù ije ozi ndị a, ma onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ inye Jehova ihe kasị mma ọ pụrụ inye ya. (Mat. 22:37) N’agbanyeghị ihe bụ́ ọnọdụ gị, mee ka ijere Jehova ozi bụrụ ihe ị ga-elekwasị anya ná ndụ gị. (Ọma 16:5) Site n’ime otú ahụ, ị ga-atọ ezi ntọala maka ọdịnihu.