Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche June 15
“Í cheghị na ịzụlite ụmụ n’ụwa nke oge a bụ ihe ịma aka? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama okwu a na-emesi obi ike nke na-egosi na ndị nne na nna pụrụ inwe ihe ịga nke ọma. [Gụọ Ilu 22:6.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-enye ndụmọdụ bara uru iji nyere ndị nne na nna aka imeri ihe ịma aka a.”
Ụlọ Nche July 1
“N’oge ọdachi, ọtụtụ mmadụ na-ajụ ma Chineke ọ̀ na-eche banyere ndị mmadụ n’ezie ma na-ahụ ahụhụ ha na-ata. Ì chetụla banyere ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle ụzọ Chineke na-esi egosi nchegbu ọ na-enwe banyere anyị taa na ụzọ o siworo nye ihe ndabere maka ịkwụsị ahụhụ nile.” Gụọ Jọn 3:16.
Teta! July 8
“Nye ọtụtụ ndị, oge a dị afọ iri na ụma bụ oge na-eweta ma ọṅụ ma ihe ịma aka, í cheghị otú ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-ekwu banyere mgbanwe ndị nọ n’oge uto na-enwe. Ọ na-atụlekwa ụfọdụ ndụmọdụ amamihe dị na ha bụ́ ndị pụrụ inyere ha aka iji oge ha nọ n’afọ iri na ụma mee ihe n’ụzọ ga-akasị abara ha uru.” Gụọ Eklisiastis 12:1.