Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche May 15
“Ọ̀ dịtụla mgbe i chere echiche ma ihe ndị mmadụ na-eme n’ụwa ọ̀ na-enwe mmetụta ọ bụla n’ebe Chineke nọ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Rịba ama otú ihe anyị na-eme pụrụ isi metụta Chineke. [Gụọ Ilu 27:11.] Magazin a na-atụle ihe atụ ụfọdụ nke ndị mere ka obi Chineke ṅụrịa, ọ na-akọwakwa otú anyị pụrụ isi mee otu ihe ahụ.”
Ụlọ Nche June 1
“Ụfọdụ ndị na-eche na ọ dịghị mkpa ịbanye n’òtù okpukpe iji fee Chineke ofufe. Ì chetụla echiche banyere nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle ihe ndekọ banyere otú Chineke na ndị mmadụ si mekọọ ihe n’oge ndị gara aga. Ọ na-atụlekwa ihe ife Chineke ofufe n’eziokwu pụtara.” Gụọ Jọn 4:24.
Teta! June 8
“Sayensị ọgwụ na ahụ́ ike enwewo ọganihu dị ịrịba ama n’ịlụso ọrịa ọgụ, ma ì chere na ọ dị mgbe anyị ga-ahụ ụwa nke ọrịa na-agatụghị adị na ya? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-akọwa na otu ụbọchị, onye ọ bụla nọ n’ụwa ga-enwe ahụ́ ike zuru ezu ná mmezu nke nkwa a.” Gụọ Aịsaịa 33:24.
“Owu na-ama ọtụtụ mmadụ taa. Nke a na-agụnye mmetụta nke ịbụ onye e kewapụrụ n’ebe ndị ọzọ nọ. Í kwetaghị na nke ahụ pụrụ ịkpata mwute? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ, gụọ Abụ Ọma 25:16.] Mbipụta Teta! a na-atụ aro ndị dị irè maka ịlụso owu ọmụma ọgụ.”