Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche June 1
“Ì chere na Chineke na-anabata okpukpe niile? [Chere ka ọ zaa.] Ọ ga-amasị gị ịhụ ihe Chineke kwuru mgbe ndị Izrel oge ochie malitere ikpe okpukpe nke mba ndị gbara ha gburugburu. [Gụọ Ezikiel 6:6.] Isiokwu a zara ajụjụ bụ́, ‘Ò Nwere Ihe Otú Anyị Si Efe Chineke Mere?’” Gosi ya isiokwu nke malitere na peeji nke 9.
Ụlọ Nche July 1
“Ọ na-ewute anyị niile mgbe ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ. N’oge dị otú ahụ, ì chere na Baịbụl nwere ike inyere anyị aka? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Abụ Ọma 55:22.] Magazin a tụlere ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru anyị nwere ike ime iji nyere anyị aka idi ya.”
Teta! Apr.–June
“N’ihi ihe niile anyị nwere ime, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike iwepụta oge iji fee Chineke. Ọ̀ na-esikwuru gịnwa ike? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ndị Efesọs 5:15-17.] Isiokwu a gwara anyị ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke chọrọ ka anyị jiruo oge na ike anyị jeere ya ozi.” Gosi ya isiokwu nke malitere na peeji nke 14.”
“Ọtụtụ ndị na-akpọ iyi. Olee otú Chineke si ele ya anya? [Chere ka ọ zaa. Gụzie iwu Onye nyere anyị ikike ikwu okwu nyere ná Ndị Efesọs 4:31.] Isiokwu a bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị mere ka anyị mata ihe atọ ga-enyere anyị aka izere okwu ọjọọ.” Gosi ya isiokwu gbara na peeji nke 19.