Usoro Ihe Omume Ọhụrụ Maka Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche
Ọ bụrụ na anyị ahụ ma ọ bụ nụ ihe mgbaàmà na-adọ aka ná ntị ma ghara ime ihe banyere ya, ọ pụrụ ịkpatara anyị ọdachi. Ọ dị mkpa ọbụna karị ịgbaso ntụziaka ime mmụọ Jehova na-enye. A ga-emesi nke a ike n’ụbọchị mgbakọ pụrụ iche maka afọ na-abịanụ. Isiokwu ya bụ “Lezienụ Anya Otú Unu Si Aṅa Ntị.”—Luk 8:18.
N’okwu mbụ ya, ọkà okwu si esi bịa ga-atụle otú ndụmọdụ dị n’isi akwụkwọ ndị mbụ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Hibru si metụta anyị taa. N’okwu ikpeazụ ya bụ́, “Na-aṅa Ntị ná Ntụziaka Chineke Mgbe Nile,” ọ ga-enyere mmadụ nile aka inyocha ma hà na-ege Jehova, Ọkpara ya, na “ohu ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi, nke nwekwara uche” ntị n’ezie.—Mat. 24:45.
Ọtụtụ akụkụ nke usoro ihe omume ahụ ga-abara ezinụlọ dị iche iche uru karịsịa. “Ezinụlọ Ndị Na-aṅa Ntị n’Okwu Chineke n’Enweghị Ndọpụ Uche” ga-enyere anyị aka ịghara ikwe ka ihe nke ụwa kpagbuo ọnọdụ ime mmụọ anyị. Ọ ga-agụnye ajụjụ ọnụ nke a ga-agba ndị meworo mgbanwe iji bute ihe ime mmụọ ụzọ. “Otú Ịṅa Ntị nke Ọma n’Okwu Chineke Si Ewusi Ndị Ntorobịa Anyị Ike” ga-agụnye ajụjụ ọnụ a ga-agba ndị ntorobịa bụ́ ndị kwụsiworo ike n’akụkụ nke eziokwu ahụ n’ụlọ akwụkwọ, n’ihu ndị ọgbọ ha, ma ọ bụ n’ozi ubi. Isiokwu bụ́ “Ụmụaka Ndị Na-aṅa Chineke Ntị Ma Na-amụta Ihe” ga-enyere anyị aka ịghara ileda ikike ụmụaka nwere ịmụta ihe anya. Ajụjụ ọnụ a ga-agba ụmụaka na ndị mụrụ ha ga-enyere anyị aka ịhụ ezi ihe ịzụ ụmụaka n’ụzọ nke Jehova site ná mgbe ha bụ ụmụ ọhụrụ na-arụpụta.
Ka Setan “na-eduhie ụwa dum mmadụ bi,” Jehova na-egosi ndị ohu ya na-ekwesị ntụkwasị obi ụzọ ha kwesịrị ije ije na ya. (Mkpu. 12:9; Aịsa. 30:21) Ịṅa ntị nke ọma na ndụmọdụ ya na iji nrubeisi na-etinye ya n’ọrụ ná ndụ anyị na-eme ka anyị bụrụ ndị maara ihe, na-ewetara anyị obi ụtọ, ma na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Ilu 8:32-35.