Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Aug. 15
“Taa, ndị mmadụ na-achọ okwu ndụmọdụ n’ọtụtụ ebe banyere alụmdi na nwunye nakwa ịzụlite ụmụaka. Olee ebe i chere a pụrụ isi nweta ndụmọdụ kasị mma? [Nye ohere maka nzaghachi.] Mbipụta Ụlọ Nche a na-atụle ụfọdụ ndụmọdụ ndị ezi uche dị na ha, bụ́ ndị Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ nyere banyere ndụ ezinụlọ.” Gụọ Abụ Ọma 32:8.
Teta! Sept. 8
“Ókè há aṅaa ka i chere ọ dịruru ná mkpa ka ndị nna na-ekere òkè ná ndụ ụmụ ha? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ sapeta ebe isiokwu ndị ahụ dị.] Mbipụta Teta! a na-atụle nsogbu na-arịwanye elu nke ndị nna ịgbahapụ ụmụ ha. Ọ na-akọwakwa otú ndị nna pụrụ isi nwee mmetụta dị mma n’ebe ụmụ ha nọ.” Gụọ Ilu 13:1.
Ụlọ Nche Sept. 1
“Anyị nile chọrọ inwe obi ụtọ. Ì chere na ihe ndị e kwuru n’ebe a pụrụ iweta obi ụtọ n’ezie? [Gụọ Matiu 5:4a, 6a, 10a. Mgbe ahụ nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-akọwa ihe okwu ndị ahụ sitere n’Ozizi Elu Ugwu ahụ a ma ama pụtara, ọ na-akọwakwa ihe ọzọ a ga-eme iji na-enwe obi ụtọ.”