Ị̀ Pụrụ Inye Aka?
1 Jehova na-achọ mgbe nile ụzọ ndị ọ ga-esi nyere ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe aka. (2 Ihe 16:9; Aịsa. 41:10, 13) N’iji ya tụnyere onye ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, Aịzaịa dere, sị: “N’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.” (Aịsa. 40:11) Tụlee ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi ṅomie mmasị Jehova ji ịhụnanya na-egosi.
2 Nyere Ndị Ọhụrụ Aka: Anyị pụrụ inyere ndị ọhụrụ aka site n’ịkpọ ha ka ha soro anyị nwee mkpakọrịta na-ewuli elu. (Ilu 13:20) N’icheta otú ndị ọzọ si nyere ya aka mgbe ọ malitere iso ọgbakọ na-akpakọrịta, otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ọtụtụ oge, otu ezinụlọ kpọrọ m isonyere ha n’ọmụmụ ihe ezinụlọ ha. Ka m nọ na-enwe ọganihu, otu di na nwunye na-akatabeghị ahụ́ na-akpọ m mgbe mgbe iso ha jee ozi ogologo ụbọchị dum. Anyị nwere mkparịta ụka ime mmụọ ndị magburu onwe ha.” Ọ gbakwụnyere, sị: “Tupu m ghọọ Onye Kraịst, ana m eme mkpapụ n’abalị Friday na Saturday nile. Ma oge ndị mụ na ụmụnna ji nọrịa gboro mkpa ndị m nwere maka mkpakọrịta.” Mmasị ọgbakọ ahụ ji ịhụnanya na-egosi n’ebe nwanna nwoke a nọ nyeere ya aka ịgbanyesi mkpọrọgwụ ike ma kwụsie ike n’okwukwe, ọ na-ejekwa ozi ugbu a dị ka onye òtù nke ezinụlọ Betel.—Kọl. 2:6, 7.
3 Ka Anyị Na-ewuli Ibe Anyị Elu: Anyị pụrụ ịhụ ohere iji nyere ụmụnna anyị aka mgbe ha nọ n’ihe isi ike. Ị̀ pụrụ ime ndokwa ka gị na onye nkwusa ahụ́ na-adịkwaghị ike soro jiri telifon gbaa àmà ma ọ bụ kpọọ ya ka o soro gị gaa duzie ọmụmụ Bible, ikekwe ọbụna kpọta onye ahụ a na-amụrụ ihe n’ebe obibi ya? Enyemaka ọ̀ ga-adị nne ma ọ bụ nna nke nwere obere ụmụaka mkpa n’oge a nọ n’ozi ubi? È nwere ndị na-eme ihere bụ́ ndị ga-achọ ka i nyere ha aka mgbe ha na-eme nletaghachi ma ọ bụ mgbe ha na-ekere òkè n’akụkụ ndị ọzọ nke ozi ubi? Inwe mmasị ịhụnanya n’ebe ụmụnna anyị nọ ga-akwali anyị ịchọ ụzọ ndị anyị ga-esi wulie ha elu.—Rom. 14:19.
4 Ka anyị na-eṅomi mmasị Jehova ji obiọma na-egosi n’ebe ndị ohu ya nọ, anyị na-ewusi ibe anyị ike, na-enye aka n’ime ka ọgbakọ dịrị n’otu n’ịhụnanya, ma na-ewetara Nna anyị nke eluigwe otuto.—Efe. 4:16.