Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ozi Ubi Ezinụlọ
1 Ọ na-atọ Jehova ụtọ ịhụ ụmụaka ka ha na-eto aha ya. (Ọma 148:12, 13) N’oge Jizọs, ọbụna “ụmụ ọhụrụ na ụmụ na-aṅụ ara” tokwara Chineke. (Mat. 21:15, 16) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ndị nne na nna, olee otú unu pụrụ isi nyere ụmụ unu aka ịghọ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-eto Jehova n’ozi Ndị Kraịst? Ọzọkwa, dị ka e mere ka ọ pụta ìhè n’isiokwu dị n’elu bụ́ nke kwuru banyere nzukọ ọgbakọ, ụzọ bụ́ isi unu pụrụ isi mee ya bụ site n’isetịpụ ihe nlereanya. Otu nna kwuru echiche ndị nne na nna nọ n’ebe nile, mgbe ọ sịrị: “Ụmụaka adịghị eme ihe i kwuru; ha na-eme ihe i mere!”
2 Otu nwanna nwanyị nke nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere, chetara, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe anyị tetara ụra n’ụtụtụ Saturday na-ajụ ma ànyị ga-aga ozi ọma. Anyị maara na anyị ga-aga.” N’otu aka ahụ, ị pụrụ ịkụnye n’obi ụmụ gị mkpa ọrụ nkwusa ahụ dị site n’ịhụ na ezinụlọ gị na-arụkọ ọrụ nkwusa ọnụ kwa izu. Ọ bụghị nanị na nke a ga-enye ụmụ gị ohere ịmụta ihe n’aka gị, kamakwa ọ ga-eme ka i nwee ike ịma àgwà ha, omume ha, na nkà ndị ha na-azụlite.
3 Ọzụzụ Na-aga n’Ihu: Ka ozi ọma wee na-atọ ụmụ gị ụtọ, ọ dị mkpa ka ha na-eme nkwadebe iji na-ekere òkè nke ọma. Nwanna nwanyị ahụ e hotara ihe o kwuru na mbụ kwukwara, sị: “Ọ dịghị mgbe anyị bụ ndị nsogharị na-eso nnọọ ndị mụrụ anyị aga ọrụ ha. Anyị maara na anyị nwere òkè n’ọrụ ahụ, ọ bụrụgodị nanị ịpị mgbịrịgba ụzọ na ịhapụ mpempe akwụkwọ e dere ozi Bible na ya. Site n’ịkwadebe nke ọma tupu anyị agawa ozi ná ngwụsị izu ọ bụla, anyị na-ama ihe anyị ga-ekwu.” Ị pụrụ inye ụmụ gị ọzụzụ dị otú ahụ site n’ịdị na-eji minit ole na ole kwa izu n’oge unu na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ma ọ bụ n’oge ọzọ, na-akụziri ha otú e si ezi ozi ọma.
4 Gị na ezinụlọ gị ịrụkọ ọrụ nkwusa ọnụ na-enyekwu gị ohere ịkụnye eziokwu ahụ n’obi ụmụ gị. Otu nna bụ́ Onye Kraịst na-akpọ nwa ya nwanyị aga kilomita iri abụọ uje na ụla n’ụkwụ, iji kesaa traktị n’obodo nta ọzọ dị n’ebe ndagwurugwu. Nwa ya nwanyị ahụ ji obi ụtọ cheta, sị “Ọ bụ n’oge ndị a anyị ji ụkwụ na-eme njem ka papa m kụnyere eziokwu ahụ n’obi m.” (Deut. 6:7) Ka a gọziekwa gị n’otu aka ahụ maka ịhụ na ozi ubi so n’ihe ezinụlọ gị na-eme kwa izu.