Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche May 15
“Ì chere na e nwere mgbe ịda ogbenye na-agaghịzi adị n’ụwa a? [Chere ka ọ zaa.] Lee nkwa Chineke kwere. [Gụọ Aịsaịa 65:21.] Ụlọ Nche a na-akọwa otú a ga-esi mezuo nkwa a.” Gwa ya na ị ga-abịa n’oge ọzọ iji zaa ajụjụ bụ́: Olee mgbe a ga-emezu nkwa a?
Ụlọ Nche June 1
“N’agbanyeghị na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile na-ekwu okwu udo, ụmụ mmadụ adịghị n’otu. Ì chere na ịtụwa anya na ụmụ mmadụ ga-adị n’otu bụ mmadụ ịrọ nrọ efu? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-eme ka a mara ọchịchị nke ga-enwe ike ime ka ụwa dị n’otu.” Gụọ Abụ Ọma 72:7, 8, ma gwa ya na ị ga-abịa n’oge ọzọ iji kọwaara ya otú nke a ga-esi mee.
Teta! June 8
“Ọtụtụ mmadụ anụwo na ọ dị mkpa ka mmadụ na-emega ahụ́ iji nwee ezi ahụ́ ike, ma ọtụtụ n’ime ha na-ekweta na ha anaghị emega ahụ́ otú ahụ́ ha chọrọ. Ọ́ bụghị eziokwu? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle uru ndị a na-erite n’imega ahụ́ mgbe nile ma na-atụ aro banyere ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi wepụta oge iji na-eme ya.”