Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche May 15
“Kwa ụbọchị anyị na-anụ akụkọ banyere ime ihe ike. Ì chere na ọnọdụ ahụ adịtụwo na mbụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] Lee ihe Bible na-ekwu. [Gụọ Matiu 24:37.] Oge Noa dị oké njọ nke na Chineke kpochapụrụ mmadụ nile ma e wezụga Noa na ezinụlọ ya. Magazin a na-egosi otú ihe omume ndị ahụ si nwee ihe ha pụtara nye anyị taa.”
Ụlọ Nche June 1
“Akụkọ banyere iji ego ndị e nyere n’onyinye eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi emewo ka ụfọdụ ndị na-eche ma ọ̀ bụ ihe amamihe dị na ya inye ụlọ ọrụ ndị na-arụ ọrụ ebere onyinye. Ma, e nwere ọtụtụ ndị nọ ná mkpa. Gịnị ka i chere a pụrụ ime? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ, gụọ Ndị Hibru 13:16.] Magazin a na-akọwa ụdị inye ihe nke na-amasị Chineke.”
Teta! June 8
“Taa, ọrịa ụmụ ahụhụ na-ekesa bụ otu n’ime ọtụtụ ihe ize ndụ ndị e nwere megide ahụ́ ike anyị. Ị̀ maara na e nwere ihe ndị anyị pụrụ ime iji chebe onwe anyị? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-atụle ihe ndị a, nakwa nkwa ahụ dị n’ime Bible banyere oge mgbe ọrịa na-agaghị adịkwa.” Mechie site n’ịgụ Aịsaịa 33:24.
“O yiri ka ụmụ mmadụ taa ejighịzi omume ọma na ezi àgwà kpọrọ ihe dị ka ha ji ha kpọrọ n’afọ ndị gara aga. Ị̀ chọpụtawo nke ahụ? [Nye ohere maka nzaghachi.] N’ụzọ na-adọrọ mmasị, Bible buru nke a n’amụma. [Gụọ 2 Timoti 3:1-5.] Mbipụta Teta! nke a na-atụle ihe mere ihe ụmụ mmadụ ji akpọrọ ihe ji na-agbanwe nakwa ihe ọdịnihu ga-eweta.”