Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ
Ụlọ Nche Apr. 15
“N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ ndị achọpụtawo na e nwere ndalata n’iji ụkpụrụ ime mmụọ akpọrọ ihe. Ị̀ chọpụtawo nke a? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ, gụọ Abụ Ọma 119:105.] Iji ụkpụrụ ime mmụọ akpọrọ ihe pụrụ inyere ndị mmadụ aka izere ọtụtụ ọnyà ná ndụ. Magazin a na-ezo aka n’ebe a pụrụ ịchọta ụkpụrụ ime mmụọ ndị bara uru n’ezie.”
Ụlọ Nche May 1
“Mmadụ agaghị azali ajụjụ ụfọdụ. Lee otu ihe atụ a. [Gụọ Job 21:7.] Ọ̀ dịtụwo mgbe i nwere ajụjụ nke ị ga-achọ ịjụ Chineke? [Nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a na-akọwa otú ndị mmadụ n’akụkụ nile nke ụwa siworo chọta azịza ndị na-eju afọ nye ajụjụ atọ ndị kasị mkpa ná ndụ.”
Teta! May 8
“N’ime ụwa nke oge a, ebe ihe nile na-aga ọkụ ọkụ, ọtụtụ ndị na-eche ma ụmụaka hà na-eto oké ngwa ngwa. Nke a ọ̀ na-echegbu gị? [Nye ohere maka nzaghachi. Mgbe ahụ gụọ Eklisiastis 3:1, 4.] Oge mmadụ dị na nwata ekwesịghị ịbụ oge iji na-ebu ibu ọrụ dịịrị ndị toruworo ogo mmadụ. Mbipụta Teta! a na-atụle otú ndị nne na nna pụrụ isi chebe ụmụ ha n’oge ha ka bụ ụmụaka.
“Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị maara onye na-arịa ọrịa shuga. Ị̀ maara ihe dị ukwuu banyere ọrịa a? [Gosi ya ihu magazin ahụ ma nye ohere maka nzaghachi.] Magazin a nyochara ihe ndị na-akpata ọrịa shuga na ụzọ isi gwọọ ya. Ọ na-atụlekwa nkwa e kwere n’ime Bible banyere ngwọta nke ọrịa nile kpam kpam.” Mechie site n’ịgụ Aịsaịa 33:24.