Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Apr. 1
“Ebe ọ bụ na a na-emetọ ihe ndị dị n’ụwa, ò nwetụla mgbe i chere na ụwa a ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi? [Chere ka ọ zaa.] Legodị nkwa a na-akasi obi dị na Baịbụl. [Gụọ Abụ Ọma 104:5.] Isiokwu a na-akọwa otú Baịbụl kwuru na ụwa ga-adị n’ọdịnihu.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
Ụlọ Nche May 1
“Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha na-ekwere naanị n’ihe ndị ha nwere ike ịhụ anya. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ndị Rom 1:20.] Magazin a mere ka àgwà Chineke atọ ndị anyị nwere ike ịghọta nke ọma site n’ihe ndị o kere eke pụta ìhè, ọ na-ekwukwa otú ịma àgwà ndị a nwere ike isi metụta anyị.”
Teta! Apr.–June
“Ụfọdụ ndị kweere na Chineke na-edekọ ihe ọjọọ niile anyị na-eme. Ndị ọzọ chere na ọ na-agbaghara mmehie niile, n’agbanyeghị otú ha dịruru ná njọ. Gịnị ka i chere? [Chere ka ọ zaa. Gụzie Ndị Rom 3:19.] Magazin a na-ekwu banyere ihe atọ Baịbụl sịrị na a ga-eme iji nweta ebere Chineke.” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 10.
“Ì chere na okpukpe niile dịcha mma? [Chere ka ọ zaa.] Lee ihe Baịbụl kwuru banyere ụfọdụ ndị sị na ha na-efe Chineke. [Gụọ Mak 7:7.] Olee otú mmadụ nwere ike isi mara okpukpe nke na-akụzi eziokwu, nke na-adịghị akụzi “ihe mmadụ nyere n’iwu”? Ò nwedịrị okpukpe nke na-akụzi eziokwu?” Gosi ya isiokwu malitere na peeji nke 25 nke magazin a.