Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche Apr. 15
“Ihe ọmụma e nwere n’ụwa taa ọ́ karịghị akarị? [Chere ka ọ zaa.] Ma, ọ dịghị nke bara uru karịa nke a kọwara n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ a. [Gụọ Jọn 17:3.] Magazin a na-akọwa ihe okwu ahụ bụ́ ‘ndụ ebighị ebi’ pụtara na otú anyị pụrụ isi nweta ihe ọmụma na-eduba na ya.”
Ụlọ Nche May 1
“Mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ, ọ bụ ihe e bu pụta ụwa ịchọ ịhụ ya ọzọ. Ọ́ bụghị ya? [Chere ka ọ zaa.] Nkwa Bible kwere banyere mbilite n’ọnwụ akasiwo ọtụtụ mmadụ obi. [Gụọ Jọn 5:28, 29.] Magazin a na-atụle oge a ga-enwe mbilite n’ọnwụ nakwa kpọmkwem ndị ga-erite uru na ya.”
Teta! May 8
“N’agbanyeghị na, ma eleghị anya, a ma Jizọs ama karịa mmadụ ọ bụla ọzọ dịtụrụla ndụ n’ụwa, ọtụtụ na-eche banyere onye ọ bụ n’ezie. Ị̀ maara na ọbụna ndịozi Jizọs chekwara echiche dị otú ahụ? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Mak 4:41.] Magazin a na-atụle ihe Bible na-ekwu banyere onye Jizọs bụ n’ezie.”
“Ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna na-elezi anya ahọrọ ụdị fim ha chọrọ ka ụmụ ha kirie. Ọ̀ nọwo na-esiri gị ike ịchọta ezigbo fim ezinụlọ gị ga na-ekiri? [Chere ka ọ zaa. Mgbe ahụ, gụọ Ndị Efesọs 4:17.] Magazin a na-atụle otú ndị nne na nna pụrụ isi nyere ụmụ ha aka ịhọrọ ntụrụndụ dị mma.”