Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị A
Ụlọ Nche July 15
“Kemgbe ọtụtụ puku afọ ụmụ mmadụ dịwara ndụ, ha enwewo nkwenkwe dị iche iche. Ì chere na ọ ga-ekwe omume ịma ndị nke bụ́ eziokwu na ndị nke bụ́ ụgha? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle ebe ị pụrụ inweta ozizi ndị bụ́ eziokwu na-enye Chineke obi ụtọ.” Gụọ 2 Timoti 3:16.
Ụlọ Nche Aug. 1
“Ọ na-adị ọtụtụ mmadụ taa ka ha abaghị uru. Gịnị ka i chere a pụrụ ime iji nyere ha aka? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụle otú Bible pụrụ isi nyere ndị dị otú ahụ aka inweta ezi ọṅụ.” Mee ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’isiokwu bụ́ “Bible Pụrụ Inyere Gị Aka Inweta Ọṅụ” pụta ìhè, bụ́ ndị e dere n’aka akwụkwọ okpotokpo.
Teta! Aug. 8
“Ọ na-agbawa obi ịhụ ahụhụ ọdachi ndị na-emere onwe ha na-akpata. [Kwuo otu nke ndị bi n’ógbè unu maara maka ya.] Ì chere na ọdachi ndị dị otú ahụ na-akawanye njọ? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a lebara anya n’ajụjụ ahụ. Ọ na-enyekwa ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ n’ọdachi ndị dị otú ahụ ihe nkasi obi.” Gụọ 5:28, 29.
“Ọtụtụ mmadụ nọ n’ụjọ mgbe nile. Gịnị ka i chere kpatara ya? [Chere ka ọ zaa.] Magazin a na-atụ aro ndị bara uru banyere otú anyị pụrụ isi chebe onwe ya pụọ n’ihe ize ndụ ndị a na-ahụkarị. Ọ kọwakwara nkwa Bible na-ekwe banyere ụwa nke ụjọ na-agaghị adị na ya.” Gụọ Aịsaịa 11:9.