Jiri Ohere Ọ Bụla Dapụtaranụ Na-ekwusa Ozi Ọma
1 Ndị mejupụtara ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ndị ọnọdụ ha dịgasị iche iche. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị dị n’otu ma a bịa ná mkpebi anyị na-eme inye Jehova otuto. (Ọma 79:13) Ọ bụrụ na ọrịa ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ emee ka anyị gharazie ikwusaru ozi ọma otú anyị gaara achọ, olee otú anyị pụrụ isi jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusa ozi ọma?
2 Mgbe Anyị Na-eme Ihe Ndị Dịịrị Anyị n’Ụbọchị: Jizọs ji oge ya na ndị mmadụ mekọrọ ihe n’ụbọchị kwusaara ha ozi ọma. O ziri Matiu ozi ọma mgbe O si n’ihu ụlọ ọrụ ndị ọnaụtụ na-agafe, zie Zakịọs ozi ọma mgbe Ọ na-eme njem, ziekwa nwanyị Sameria ozi ọma mgbe Ọ na-ezu ike. (Mat. 9:9; Luk 19:1-5; Jọn 4:6-10) Mgbe anyị na-eme ihe ndị dịịrị anyị n’ụbọchị, anyị onwe anyị pụkwara izi ndị mmadụ ozi ọma mgbe anyị na ha na-akpa nkata. Ọ bụrụ na anyị ana-eji Bible na traktị ma ọ bụ broshuọ n’ebe ọ bụla anyị nọ, nke a ga na-akpali anyị ịgwa ndị ọzọ banyere ihe ndị anyị na-atụ anya ha n’ọdịnihu.—1 Pita 3:15.
3 Ókè ị na-ekere n’ọrụ ụlọ n’ụlọ ò belatala n’ihi na ị pụghịzi ịgagharị agagharị? Ọ bụrụ otú ahụ, hụ na ị na-eji ohere ọ bụla dapụtaranụ agbara ndị dọkịta na ndị gị na ha na-emekọ ihe àmà. (Ọrụ 28:30, 31) Ọ bụrụ na ọnọdụ gị adịghịzi ekwe ka ị na-apụ apụ, ị̀ nwaleela iji telifon ma ọ bụ akwụkwọ ozi na-agba àmà? Otu nwanna nwanyị na-edekarịrị ndị ikwu ya na-abụghị Ndịàmà akwụkwọ ozi. N’akwụkwọ ozi ndị ahụ, ọ na-edenye okwu agbamume ndị sitere na Bible nakwa ahụmahụ ndị o nwetara mgbe ọ na-ekwusa ozi ọma.
4 N’ebe Ọrụ Ma Ọ Bụ n’Ụlọ Akwụkwọ: Ọchịchọ anyị nwere inye Jehova otuto ga-emekwa ka anyị chọọ ohere anyị ga-eji kụọ mkpụrụ nke eziokwu ahụ n’obi ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ n’obi ụmụ akwụkwọ ibe anyị. Otu onye nkwusa dị afọ asatọ kọọrọ ụmụ klas ya ihe ọ gụtara na Teta! banyere ọnwa. Mgbe onye nkụzi ya matara ebe ọ gụtara ihe ahụ, onye nkụzi ahụ malitere ịnata Ụlọ Nche na Teta! n’esepụghị aka. N’ebe anyị na-arụ ọrụ, ọ bụrụ na anyị edebe nnọọ akwụkwọ Bible Na-akụzi n’ebe ndị ọzọ ga-ahụ ya, ọ pụrụ ime ka ha jụọ anyị ajụjụ ndị ga-eme ka anyị gbaara ha àmà.
5 Ị̀ pụrụ icheta ohere ndị ị pụrụ iji kwusaara ndị mmadụ ozi ọma mgbe ị na-eme ihe ndị dịịrị gị n’ụbọchị? Ka anyị na-agbalịsi ike kwa ụbọchị ‘ịchụrụ Chineke àjà otuto’ site n’iji ohere ọ bụla dapụtaranụ na-ekwusa ozi ọma.—Hib. 13:15.