Mgbanwe Ndị E Mere n’Akwụkwọ bụ́ Mkpughe —Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Ihe ndị e depụtara n’okpuru ebe a bụ mgbanwe ndị bụ́ isi e mere n’akwụkwọ bụ́ Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, nke e bipụtara n’afọ 1994. Ọ bụghị mgbanwe nile e mere na ya ka e depụtara ebe a. Dị ka ihe atụ, e depụtaghị mgbanwe nke ọnụ ọgụgụ ụfọdụ, bụ́ ndị a pụrụ ịchọta na Yearbook kasị ọhụrụ nakwa n’akwụkwọ anyị ndị ọzọ.
ISI NKE 4
Peeji nke 18, para. 4, kagbuo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ikpeazụ e hotara n’ebe ahụ: Matiu 25:31-33
ISI NKE 5
Peeji nke 24, para. 3, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * Iji nweta nkọwa zuru ezu, lee akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? peeji nke 88-92, 215-218, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
ISI NKE 6
Peeji nke 30, para. 11, ahịrị nke 4-5, n’ebe e dere “2 Pita 3:1-3,” dee: 2 Pita 2:1-3
Peeji nke 30, para. 12, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke isii: E mesịa, Onye Eze Rom bụ́ Constantine kwadoro okpukpe “Ndị Kraịst,” nke a mekwara ka e nwee Krisendọm, bụ́ ebe Chọọchị na Ọchịchị jikọtara aka n’ịchị achị ruo otu puku afọ.
Peeji nke 32, igbe, jiri nke a dochie ihe e dere na paragraf nke mbụ: E mere Jisọs baptizim, teekwa ya mmanụ dị ka Eze A họpụtaworo n’Osimiri Jọdan n’ihe dị ka October nke afọ 29 O.A. Mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, na 33 O.A., ọ bịara n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem wee chụpụsịa ndị ahụ na-eme ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe. O yiri ka e nwere ihe kwekọrọ na nke a n’ogologo oge ahụ dị afọ atọ na ọkara site na mgbe Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze n’eluigwe n’October 1914 ruo mgbe ọ bịara inyocha ndị ahụ kpọrọ onwe ndị Kraịst mgbe ikpe ikpe ahụ malitere n’ụlọ Chineke. (Matiu 21:12, 13; 1 Pita 4:17) Ná mmalite afọ 1918, ọrụ Alaeze nke ndị Jehova zutere oké mmegide. Ọ bụ oge ile ule gburugburu ụwa, a yọchapụkwara ndị na-atụ egwu. Na May 1918, ndị ụkọchukwu Krisendọm mere ka a tụọ ndị ọrụ nke Watch Tower Society mkpọrọ, ma mgbe ọnwa itoolu gasịrị a tọhapụrụ ndị a. E mesịa, a kachapụrụ ebubo ụgha ndị ahụ e boro ha. Site 1919 gaa n’ihu, nzukọ ndị Chineke nke a nwapụtaworo, nụchaakwa ya, gara n’ihu n’ịnụ ọkụ n’obi ịkpọsa Alaeze Jehova nke dị n’aka Kraịst Jisọs dị ka olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.—Malakaị 3:1-3.
ISI NKE 8
Peeji nke 40, para. 8, ahịrị nke 8-9, n’ebe e dere “125 ihe ndị e mehiere emehie,” dee: 130 ihe ndị e mehiere emehie
Peeji nke 40, para. 10, jiri nke a dochie ahịrịokwu ikpeazụ: Nanị n’ụlọikpe Supreme Court nke mba United States, Ndịàmà Jehova enwewo mmeri n’ikpe 50.
ISI NKE 10
Peeji nke 50, para. 11, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * Dị ka ihe atụ, lee isiokwu bụ́ “Ndị Inyom Ndị Kraịst Kwesịrị Ntụkwasị Obi—Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-efe Chineke Ofufe” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 2003.
ISI NKE 11
Peeji nke 56, para. 9, jiri nke a dochie ihe e dere n’akụkụ nke abụọ nke paragraf ahụ: N’ikwekọ na nke a, magazin Ụlọ Nche enyewo agbamume site n’ịtụle isiokwu ndị dị ka “Nọgidenụ Na-anwapụta Ihe Unu Onwe Unu Bụ,” na “Ịghara Ịdị Ndụ Ọzọ Maka Onwe Anyị.”* Ebe anyị nwere enyemaka Akwụkwọ Nsọ dị otú ahụ, ka anyị nyochaa onwe anyị nke ọma mgbe anyị na-agbalị iji obi umeala na ekpere na-eje ije n’ikwesị ntụkwasị obi n’ihu Jehova.—Abụ Ọma 26:1-3; 139:23, 24.
Peeji nke 56, para. 9, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * Lee Ụlọ Nche, July 15, 2005, na March 15, 2005.
ISI NKE 12
Peeji nke 61, para. 14, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: # Magazin Ụlọ Nche nke òtù Jọn ahụ na-ebipụta, anọgidewo na-emesi ike ịdị ngwa nke iji ohere a kere òkè n’ụzọ zuru ezu ruo ókè o kwere mee n’ọrụ nkwusa ahụ; dị ka ihe atụ, lee isiokwu bụ́ “Ka Mmadụ Nile Kpọsaa Ebube Jehova” nakwa “N’ime Ụwa Dum Ka Ụda Ha Garuru,” bụ́ ndị dị ná mbipụta January 1, 2004. Ná mbipụta June 1, 2004, n’isiokwu bụ́ “Ndị A Gọziri Agọzi Ka Ndị Na-enye Chineke Otuto Bụ,” e mesiri mkpa ọ dị ike ịbanye ‘n’ọnụ ụzọ nke e megheworo’ nke na-eduba n’ozi oge nile. E nwere ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 1,093,552 ndị ọsụ ụzọ nyere akụkọ ozi dị otú ahụ n’ime otu ọnwa n’afọ 2005.
ISI NKE 13
Peeji nke 69, para. 11, jiri nke a dochie ahịrịokwu ikpeazụ: Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 40 afọ tupu o ruo, ha zoro aka na 1914 dị ka afọ ahụ amụma Bible kara akara dị ka ọgwụgwụ nke oge ndị Jentaịl, nke ihe omume ndị na-akpali akpali ga-esochi n’elu ụwa.—Mkpughe 1:10.
Peeji nke 69, para. 12, ahịrị nke 15, n’ebe e dere “El Paso, Texas,” dee: Pampa, Texas,
Peeji nke 71, para. 14, ahịrị nke 9-10, n’ebe e dere “ihe karịrị 27 nde n’ime 1990,” dee: ihe karịrị 59 nde n’afọ 2006
Peeji nke 73, para. 23, ahịrị nke 15, kagbuo: Matiu 25:31
ISI NKE 16
Peeji nke 90, para. 4, jiri nke a dochie ihe odide nke abụọ dị n’ala ala peeji: Maka nkọwa miri emi nke na-akwado na Jisọs batara n’Alaeze ya na 1914, lee peji nke 215-218 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi, bụ́ nke Ndịàmà Jehova, bipụtara.
Peeji nke 90, para. 6, jiri nke a dochie paragraf ahụ: Ma, ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka Eze ahụ e kpubere okpueze ọhụrụ na-aghaghị ije agha? Ọ bụ n’ihi na e guzobere ọbụbụeze ya n’ihu oké mmegide sitere n’aka onyeisi ndị iro Jehova, Setan bụ́ Ekwensu, na ndị nọ n’elu ụwa ndị—ma hà maara ma ọ bụ na ha amaghị—na-emezu nzube Setan. Ọmụmụ nke Alaeze ahụ n’onwe ya mere ka e buo otu nnukwu agha n’eluigwe. Mgbe ọ na-ebu agha n’aha ahụ bụ́ Maịkael (nke pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?”), Jisọs meriri Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya, tụdakwa ha n’elu ala. (Mkpughe 12:7-12) Ọgịga Jisọs na-aga n’ihu inwe mmeri nọgidere gabiga afọ iri ndị mbụ nke ụbọchị Onyenwe anyị mgbe a nọ na-achịkọta ụmụ mmadụ ndị yiri atụrụ. Ọ bụ ezie na ụwa dum ka na-atọgbọkwa “n’aka ajọ onye ahụ,” Jisọs nọgidere jiri ịhụnanya na-elekọta ụmụnna ya ndị e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha, na-enyere nke ọ bụla n’ime ha aka inwe mmeri nke okwukwe.—1 Jọn 5:19.
Peeji nke 91, para. 9, jiri nke a dochie ahịrịokwu ikpeazụ: E nwewo ito eto pụtara ìhè ná mba ndị bụ́ nke ndị Katọlik na ná mba ndị e nweburu mkpagbu siri oké ike—dị ka Germany, Itali, na Japan, bụ́ ebe ndị e nwere ugbu a ngụkọta nke Ndịàmà karịrị nnọọ 600,000 ndị na-arụsi ọrụ ike n’ozi ubi.—Aịsaịa 54:17; Jeremaịa 1:17-19.
Peeji nke 94, para. 18, jiri nke a dochie paragraf ahụ: À pụrụ ịkpọ nke a mmeri nke nkànụzu ibu agha? Kama nke ahụ, ọ bụ ihe àmà nke na-egosi na ịnyịnya ahụ na-acha uhie uhie nke na-enweghị obi ebere ọ bụla na-agbafe. Oleekwa ebe ọ ga-agbaru? Ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na a pụrụ ịmalite agha nuklia n’amaghị ama—ma ya fọdụkwa oké mkpochapụ agha nuklia e leziri anya mee! Ma, ọ bụ ihe obi ụtọ na Onye ahụ Na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ọcha ahụ nke na-enwe mmeri nwere echiche dị iche banyere nke a.
Peeji nke 97, para. 28, jiri nke a dochie paragraf ahụ: Otu ihe dị mkpa n’oge a bụ ‘ajọ ọrịa na-efe efe.’ Dị ka ihe sitere n’Agha Ụwa Mbụ ahụ pụta, oké ahụ ọkụ sitere Spain gburu ihe karịrị nde mmadụ 20 n’ime nanị ọnwa ole na ole dị n’agbata 1918 na 1919. Nanị ókèala ajọ ihe otiti nke a na-emetụtaghị bụ agwaetiti nta nke St. Helena. N’ebe ndị e belatara ọnụ ọgụgụ mmadụ bi na ha n’ụzọ dị ukwuu, e sunyere nnukwute ọkụ dị iche iche e ji na-esure mkpọkọba nke ozu ndị nwụrụ anwụ n’ọkụ. Taakwa, e nwere ọnụ ọgụgụ na-eyi egwu nke ọrịa obi na ọrịa cancer nke ihe na-akpata ọtụtụ n’ime ya bụ mmetọ nke ụtaba. N’ime ihe a kọwara dị ka “iri afọ nke jọrọ njọ” nke afọ ndị 1980, ụzọ ndụ nke megidere iwu ma ọ bụrụ na a gbasoo ụkpụrụ Bible tụkwasịrị ihe otiti nke ọrịa AIDS ‘n’ajọ ọrịa na-efe efe’ ahụ. N’afọ 2000, a kọrọ na dọkịta ukwu na-awa ahụ́ na United States kpọrọ ọrịa AIDS “ihe pụrụ ịbụ ọrịa kasị njọ nke ụwa hụtụworo.” O kwuru na nde mmadụ 52 n’ụwa nile ebutewo nje HIV na ọrịa AIDS, nde mmadụ 20 n’ime ha anwụwokwa. Lee nnọọ ka ndị Jehova si nwee obi ụtọ na ezi ndụmọdụ nke Okwu ya na-eme ka ha zere ịkwa iko na iji ọbara eme ihe na-ekwesịghị ekwesị, bụ́ ebe e si na-enweta ọtụtụ ọrịa taa!—Ọrụ 15:28, 29; tụlee 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
ISI NKE 18
Peeji nke 106, para. 7, jiri nke a dochie paragraf ahụ: Agha Ụwa nke Abụọ wetara usoro ọgba aghara ndị ọzọ. Ụmụ obere agha nakwa iyi ọha egwu anọgidewo na-akwagharị ụwa. Oké iyi egwu nke ndị na-eyi ọha egwu ma ọ bụ mba ndị nwere ngwá agha ọgwụrụ mba emewo ka ọtụtụ mmadụ na-eche echiche.
Peeji nke 107, para. 11, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke atọ: E mewo ka usoro ihe elu ala nke Setan nụ ịdọ aka ná ntị nke a zuru ụwa ọnụ.*
ISI NKE 20
Peeji nke 123, para. 11, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke anọ: N’oge e bipụtara akwụkwọ a, e ji ụdị ígwè MEPS dị iche iche na-eme ihe n’ihe karịrị ebe 125 gburugburu ụwa, nke a enyewokwa aka n’ime ka o kwe omume ibipụtakọ magazin ha nke na-apụta ugbo abụọ n’ọnwa, bụ́ Ụlọ Nche, n’ihe karịrị 130 asụsụ n’otu mgbe.
Peeji nke 128, para. 30, jiri nke a dochie ahịrịokwu ikpeazụ: Ọ bụ nanị ọnụ ọgụgụ dị nta nke ihe a kpọrọ mmadụ, gụnyere onye ọ bụla so na 144,000 ahụ a kara akara ndị ka pụrụ ịnọ n’anụ ahụ na oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ndị ha na ha ga-eso ‘guzo,’ ya bụ, lanarị.—Jeremaịa 35:19; 1 Ndị Kọrint 16:13.
ISI NKE 22
Peeji nke 143, degharịa isiokwu nta ahụ ka ọ bụrụ: Ihe Otiti nke Igurube Taa
Peeji nke 146, para. 16, jiri nke a dochie ahịrịokwu ndị sochiri ebe e hotara Mkpughe 9:10: Gịnị ka nke a pụrụ ịbụ? Ka ha na-arụ ọrụ Alaeze ha, Ndịàmà Jehova na-eji ọnụ nakwa akwụkwọ ndị e biri ebi agwa ndị mmadụ okwu ndị siri ike dabeere n’Okwu Chineke. Ozi ha na-agbakwa agba dị ka akpị n’ihi na ha na-adọ aka ná ntị banyere ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Jehova nke na-abịa nso. (Aịsaịa 61:2) Tupu ọgbọ dị ugbu a nke igurube ime mmụọ ndị a adịchapụ ndụ ha, a gaje ịrụzu ọrụ ahụ Chineke họpụtara ha maka ya, bụ́ ịkpọsa ikpe Jehova—iji mejọọ ndị nkwutọ nile kwesiri olu ha ike.
Peeji nke 146, para. 17, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * A kpọgharịrị magazin nke a aha ịbụ Consolation na 1937, e mesịakwa kpọọ ya Awake! (Teta!) na 1946.
ISI NKE 24
Peeji nke 160, para. 21, ahịrị nke 11-12, n’ebe e dere “nye ndị ahụ yiri ewu,” dee: n’ebe ndị mmegide nọ
Peeji nke 160, para. 21, ahịrị nke 16-17, n’ebe e dere “Matiu 25:31-34, 41, 46,” dee: Ndị Filipaị 1:27, 28
Peeji nke 160, jiri ajụjụ a dochie ajụjụ nke 21 (b): N’ihi gịnị ka ozi ọma ahụ ji bụrụ ozi ọjọọ nye ndị mmegide?
ISI NKE 25
Peeji nke 162, para. 4, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * Iji nweta nkọwa zuru ezu banyere oké ụlọ nsọ ime mmụọ nke a, lee isiokwu bụ́ “Oké Ụlọ Nsọ Ime Mmụọ nke Jehova” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke July 1, 1996 nakwa “Otu Ezi Ụlọ Nsọ Ebe A Ga-efe Ofufe” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke August 1, 1973.
Peeji nke 162, para. 5, n’ahịrị nke 7, kagbuo: jirikwa obi ebere mejụọ ya.
Peeji nke 162, para. 7, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke abụọ ị ga-ahụ ma ị hụchaa ebe e hotara Mkpughe 11:2: Dị ka anyị ga-ahụ, ihe a na-ekwu n’ebe a bụ banyere ọnwa 42 efu malite na December 1914 ruo June 1918, mgbe ndị nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst banyere n’oké ule.
Peeji nke 165, jiri nke a dochie okwu e ji kọwaa foto dị na peeji ahụ: Ọrụ mwughachi ahụ Zerubabel na Joshua rụrụ gosiri na n’ụbọchị Onyenwe anyị, oké mmụba n’etiti Ndịàmà Jehova ga-esochi mmalite ndị dị nta. Ụlọ ọrụ obibi akwụkwọ ndị e gosiri n’elu, bụ́ ndị dị na Brooklyn, New York, abụrụwo nke e wusawanyeworo nke ukwuu iji nye aka igbo mkpa ha
ISI NKE 27
Peeji nke 185, para. 28, jiri nke a dochie ahịrịokwu mbụ na nke abụọ: Ajọ mmiri nke mmegide ahụ ruru ọnọdụ dị oké elu n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Na Europe, a tụrụ ihe dị ka Ndịàmà 12,000 mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche nke ndị Nazi, ihe dịkwa ka mmadụ 2,000 n’ime ha nwụkwara.
ISI NKE 28
Peeji nke 187, para. 4, jiri nke a dochie ihe odide dị n’ala ala peeji: * Iji nwetakwuo nkọwa, biko lee peji nke 165-179 nke akwụkwọ bụ́ “Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!” nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
Peeji nke 190, para. 15, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke mbụ ruo nke atọ: Agha ahụ bụụrụ isi nke asaa na-achị achị nke anụ ọhịa ahụ oké ọdachi. Gụnyere mba ndị ọzọ dị na Europe, Britain tụfuru ọnụ ọgụgụ na-eyi egwu nke ụmụ okorobịa ya. N’otu agha nanị, bụ́ Agha nke Osimiri Somme na 1916, e gburu ndị Britain 420,000 nakwa ihe dị ka ndị France 194,000 na ndị Germany 440,000—ihe karịrị 1,000,000 mmadụ bụ́ ndị agha riri!
ISI NKE 29
Peeji nke 202, para. 14, jiri nke a dochie ahịrị nke 1-4: Narị puku na iri puku anọ na puku anọ ahụ bụ ndị ‘a gbatara site n’ụwa,’ ndị “a gbatara n’etiti mmadụ.” A na-anabata ha dị ka ụmụ Chineke,
ISI NKE 30
Peeji nke 206, para. 3, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke abụọ: Ọ dị mma, gịnị mere mgbe afọ 539 T.O.A. gasịrị, bụ́ mgbe Babilọn ochie ahụ dara?
Peeji nke 209, para. 10, jiri nke a dochie ahịrị nke mbụ: Ka ọ na-erule n’afọ ndị 1870, ndị Kraịst e tere mmanụ malitere
Peeji nke 209, jiri ajụjụ a dochie ajụjụ nke 10: Gịnị weere ọnọdụ ka ọ na-erule n’afọ ndị 1870, oleekwa otú Babilọn Ukwu ahụ si meghachi omume na nke a?
Peeji nke 211, para. 23, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke atọ ruo nke ise: Ozugbo ahụ, Jisọs rubere isi wee mee ihe. Nke mbụ, site na 1919 gaa n’ihu, o mere ka ndị mmụọ ozi ya chịkọtazuo 144,000 ahụ. (Matiu 13:39, 43; Jọn 15:1, 5, 16) Ọzọ, nchịkọbata owuwe ihe ubi nke oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ na-ewere ọnọdụ. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9)
ISI NKE 32
Peeji nke 231, para. 27, jiri nke a dochie akụkụ ikpeazụ nke paragraf ahụ, malite n’ebe a kpọtụrụ uche na “Matiu 24:42, 44”: (Matiu 24:42, 44; Luk 12:37, 40) N’ikwughachi okwu ịdọ aka ná ntị nke a, Pọl onyeozi sịrị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha.” Ọ bụ Setan na-akpali ndị mmadụ ime mkpọsa ụgha ọ bụla dị otú ahụ nke “Udo na ntụkwasị obi”!—1 Ndị Tesalonaịka 5:2, 3.
ISI NKE 34
Peeji nke 246, para. 1, jiri nke a dochie ahịrịokwu na-esote nke ikpeazụ: Ma ọhụụ ahụ na-aghọ ihe mere eme n’ụzọ dị ịtụnanya taa.
Peeji nke 250, para. 12, ihe odide dị n’ala ala peeji, n’ebe e dere “1981,” dee: 1993:
Peeji nke 251, para. 14, jiri nke a dochie paragraf ahụ: N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọchịchị ejiwo okwu bụ́ “udo na ntụkwasị obi” kọwaa atụmatụ dịgasị iche iche ndị mmadụ na-eme. Mgbalị dị otú ahụ ndị ndú ụwa na-eme ọ̀ bụ mmalite nke mmezu nke 1 Ndị Tesalonaịka 5:3? Ka Pọl ọ̀ na-ezo aka nanị n’otu ihe kpọmkwem nke ga-adịkwa ịrịba ama ruo n’ókè nke ịdọta mmasị ụmụ mmadụ. Ebe ọ bụ na a na-aghọtazukarị amụmụ Bible nanị mgbe ha mezuchara ma ọ bụ mgbe ha na-emezu, anyị ga-echere iji ghọta ya. Ka ọ dịgodị, ndị Kraịst maara na n’agbanyeghị otú ọ pụrụ iyi ka mba dị iche iche hà nwetara udo na ntụkwasị obi, n’ụzọ bụ́ isi, ihe ka ga-adịkwa otú ọ dịbu. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ịkpọasị, mpụ, ndakpọ ezinụlọ, omume rụrụ arụ, ọrịa, iru újú, na ọnwụ ka ga-adịkwa. Ọ bụ ya mere mkpọsa ọ bụla e mere maka “udo na ntụkwasị obi” ekwesịghị iduhie gị ma ọ bụrụ na ị nọgide na-aghọta ihe ndị na-eme n’ụwa, na-aṅakwa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị e buru n’amụma n’Okwu Chineke.—Mak 13:32-37; Luk 21:34-36.
ISI NKE 36
Peeji nke 259, para. 4, jiri nke a dochie ahịrịokwu abụọ ndị ikpeazụ: Na 1914, Jisọs ghọrọ Eze eluigwe, kemgbe ahụkwa ọ nọwo na-enwe ike n’ebe ụwa dị dị ka Eze na Onyeikpe ya na Jehova na-arụkọ ọrụ. Ya mere, ọ dabara nnọọ nke ọma na ọ bụ ya kwesịrị ime mkpọsa banyere ọdịda nke Babilọn Ukwu ahụ.
Peeji nke 260, para. 9, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke mbụ ruo nke anọ: Ọdịda Babilọn oge ochie ahụ dara na 539 T.O.A. bụ mmalite nke ndalata were ogologo oge, nke jedebere n’ịtọgbọrọ n’efu ya. N’otu aka ahụ, kemgbe agha ụwa nke mbụ, mmetụta nke okpukpe Babilọn adalatawo n’ụzọ pụtara ìhè gburugburu ụwa. Na Japan, a machibidoro iwu ofufe ndị Shinto na-efe onye ọchịchị mgbe agha ụwa nke abụọ gasịrị.
Peeji nke 265, para. 22, kagbuo akụkụ Akwụkwọ Nsọ ikpeazụ e zoro aka na ya:—Tụlee Matiu 24:15, 16.
Peeji nke 266, para. 28, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke atọ na nke anọ: Ọ ga-anata okpukpu abụọ nke ihe o mere ndị ọzọ. A gaghị emere ya ebere n’ihi na Babilọn Ukwu ahụ egosighị obi ebere ọ bụla n’ahụ́ ndị ọ na-emekpọ ọnụ.
ISI NKE 38
Peeji nke 277, para. 17, jiri nke a dochie ahịrịokwu abụọ ndị ikpeazụ: Ọ bụrụ na e nwere ndị e tere mmanụ fọdụrụ ndụ n’ụwa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-abanye n’ụgwọ ọrụ ha nke eluigwe n’oge na-adịghị anya mgbe Kraịst merisịrị, ha ga-esonyekwara ndị ibe ha so n’òtù nwunye ọhụrụ ahụ. Mgbe ahụ, n’oge nke Chineke, ọlụlụ nwanyị nke Nwa Atụrụ ahụ ga-ewere ọnọdụ!
Peeji nke 277, para. 18, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke mbụ: Ihe ndekọ amụma dị n’Abụ Ọma 45 na-akọwa usoro ihe ji mee.
ISI NKE 39
Peeji nke 281, para. 10, jiri nke a dochie ahịrịokwu abụọ ndị ikpeazụ: Ọzọkwa, “ndị mmụọ ozi nile” ga na-ejere Jisọs ozi ka ọ na-anọkwasị n’elu ocheeze ya dị ebube, na-agakwa n’ihu n’ikpe mba nile na ndị nile nke ụwa ikpe. (Matiu 25:31, 32) N’eziokwu, n’agha ikpeazụ ahụ, mgbe a ga-emezu ihe nile Chineke kpere n’ikpe, ndị mmụọ ozi Jisọs ga-esonyekwara ya ọzọ.
ISI NKE 41
Peeji nke 296, para. 5, jiri nke a dochie ahịrịokwu nke mbụ ruo nke atọ: Olee ndị ka ọ fọdụrụ ka e kpee ha ikpe mgbe ụwa na eluigwe ochie ahụ gbapụworo? Ọ bụghị ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ nke 144,000, n’ihi na e kpeworị ndị a ikpe, kaakwa ha akara. Ọ bụrụ na e nwere ndị e tere mmanụ ka dị ndụ n’elu ala mgbe Amagedọn gasịrị, ha aghaghị ịnwụ n’oge na-adịghị anya wee natakwa nkwụghachi ụgwọ eluigwe ha site ná mbilite n’ọnwụ. (1 Pita 4:17; Mkpughe 7:2-4)
ISI NKE 43
Peeji nke 311, para. 19, jiri nke a dochie ahịrịokwu nile na-esote “Mkpughe 11:15; 12:10”: N’oge ọgwụgwụ a, mmụọ ahụ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụụ anọwo na-akpọ ndị obi ha ziri ezi ịbịa nara mmiri nke ndụ ahụ n’efu. Ndị dị otú ahụ ga-anọgide na-enweta mmiri sitere n’osimiri ahụ ruo ọgwụgwụ nke usoro ihe a, mgbe nke ahụ gasịrị, mmiri ahụ ga-adịgide ruo n’ụwa ọhụụ, mgbe Jerusalem Ọhụrụ ‘siri n’eluigwe rịdata site n’ebe Chineke nọ.’—Mkpughe 21:2.
Peeji nke 312, para. 26, jiri nke a dochie ahịrịokwu abụọ ndị mbụ: Osisi ndị ahụ, nke na-enweta mmiri nke ọma site n’osimiri ahụ, pụrụ ịgụnye 144,000 ndị ahụ mejupụtara nwunye Nwa Atụrụ ahụ. Mgbe ha nọ n’elu ala, ndị a na-aṅụrụkwa ndokwa Chineke maka ndụ site n’aka Jisọs Kraịst dị ka mmiri. N’ụzọ na-akpali mmasị, n’amụma a kpọkwara ụmụnna Jizọs ndị a e ji mmụọ nsọ mụta “osisi oak nke ezi omume.” (Aịsaịa 61:1-3; Mkpughe 21:6)