Ọmụmụ Baịbụl Onwe Onye na nke Ezinụlọ Dị Oké Mkpa!
1. Olee nchegbu pụrụ iche Òtù Na-achị Isi na-enwe maka anyị n’oge a, n’ihi gịnịkwa?
1 Dị ka ọ dị na narị afọ mbụ, Òtù Na-achị Isi na-eche nnọọ banyere otú ihe ga-esi adịrị ndị Jehova mma. (Ọrụ 15:6, 28) Ka oké mkpagbu ahụ na-eru ezigbo nso, ọ dị oké mkpa ka onye nkwusa Alaeze ọ bụla soro Jehova na-emekọrịtachi ihe anya. Olee ihe ị ga-eji oge e jibu na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-eme? A na-agba ezinụlọ niile ume ka ha jiri oge a na-anọkọ maka ofufe. Ọ bụrụ na anyị ejiri oge a mee ihe bara uru, anyị ga-amụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ nke ọma ma rite uru n’ihe ndị ọ ga-akụziri anyị.—Ọma 1:1-3; Rom 11:33, 34.
2. Olee otú anyị nwere ike isi hazie ihe ná mgbede ahụ anyị ji efe ofufe dị ka ezinụlọ?
2 Mgbede Ezinụlọ Ji Efe Ofufe: A na-agba ndị isi ezinụlọ ume ka ha hụ na ha na-arụ ọrụ Jehova nyere ha nke bụ́ inwe ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ chiri anya nke ga na-abara ndị ezinụlọ ha uru. (Diut. 6:6, 7) Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di na nwunye, bụ́kwa ndị na-enweghịkwa ibu ọrụ ezinụlọ, ga na-eji oge a enwe ọmụmụ Baịbụl onwe onye, jirikwa ya na-eme nchọnchọ. Ọ dị oké mkpa ka anyị niile ‘na-azụtara onwe anyị oge kwesịrị ekwesị’ maka ọmụmụ ihe na ntụgharị uche ka anyị wee nwee ike ịnọgide na-ejere Jehova ozi ‘n’ụbọchị ndị a jọrọ njọ.’—Efe. 5:15, 16.
3, 4. Olee aro ndị a tụụrụ anyị banyere ihe ndị anyị nwere ike iji mụọ ihe, oleekwa ihe anyị ga-eburu n’obi?
3 Ihe A Ga-amụ: Akwụkwọ bụ́ Watch Tower Publications Index ma ọ bụ Watchtower Library nke dị na CD-ROM nwere ike inyere unu aka ịchọta ihe ga-eme ka ọmụmụ Baịbụl ezinụlọ unu na-atọ unu ụtọ. Ezinụlọ nwere ike ịmụ isiokwu ndị dị n’Ụlọ Nche, ndị dị ka “Ihe Ndị Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ,” “Kụziere Ụmụ Gị Ihe,” na “Maka Ndị Na-eto Eto.” Teta! na-enwekwa isiokwu bụ́ “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị” nakwa isiokwu ndị ọzọ na-atọ ụtọ, bụ́ ndị na-ekwu banyere ihe ndị dị ịtụnanya e kere eke.
4 Ọgụgụ Baịbụl a na-agụghị ọkụ ọkụ nwere ike ime ka mmadụ niile nọ n’ezinụlọ ghọta ụkpụrụ Chineke nke ọma ma rubere ha isi. (Hib. 4:12) N’oge ndị ọzọ, unu nwere ike ikiri ma kwurịta banyere otu n’ime vidio ndị nzukọ a wepụtara. E nwere ohere magburu onwe ya iji chọpụta ihe a ga-amụ na otú a ga-esi mụọ ya. Ọ bụrụkwanụ na ị jụọ ndị ezinụlọ gị ihe ga-amasị ha?
5. Olee ihe mere ọmụmụ Baịbụl onwe onye na nke ezinụlọ ji dị oké mkpa ná ndụ anyị ugbu a?
5 Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ugbu A: Ime ka mmekọrịta anyị na Jehova sikwuo ike ga-enyere anyị aka ‘iguzosi ike ma hụ nzọpụta Jehova.’ (Ọpụ. 14:13) Nduzi Chineke dị ndị nne na nna mkpa iji zụlite ụmụ ha “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, nke hịgọkwara ahịgọ.” (Fil. 2:15) Ọ dị mkpa inyere ụmụaka aka ka ha wee nwee ike izere omume rụrụ arụ a na-eme n’ụlọ akwụkwọ taa. (Ilu 22:3, 6) Ọ dị mma ka di na nwunye mee ka mmekọrịta ha na Jehova, bụ́ onye mere ha “ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ,” sikwuo ike. (Ekli. 4:12) N’ihi ya, ka anyị kpaa àgwà ka ndị maara ihe ma jiri oge fọdụrụnụ na-ewuli onwe anyị elu ‘n’okwukwe anyị nke kasị nsọ’!—Jud 20.