Otú E Kwesịrị Isi Akwadebe Nzukọ Ije Ozi
1. Olee ihe mere e ji enwe Nzukọ Ije Ozi, oleekwa ihe ga-akacha eme ka anyị rite uru na ya?
1 Ihe mere e ji enwe Nzukọ Ije Ozi bụ ka o nyere anyị aka ime nke ọma n’ozi anyị. Ihe ndị a na-amụ bụ otú anyị ga-esi ekwusa ozi ọma Alaeze, mee ndị na-eso ụzọ ma kwusaa na ụbọchị Jehova ga-eme ihe o kpere n’ikpe dị ezigbo nso. (Mat. 28:19, 20; Mak 13:10; 2 Pita 3:7) Anyị ga-akacha erite uru n’ọmụmụ ihe a dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ mụọ ihe a ga-amụ, dịkwa njikere itinye ọnụ.
2. Olee otú anyị ga-esi jikere ige ntị n’okwu a ga-ekwu ná Nzukọ Ije Ozi?
2 Okwu: A na-ede ebe ọkà okwu ga-ekwu ya ga-esi enweta ihe ọ ga-ekwu n’ebe ahụ e dere ihe ọ ga-eme. I nwere ike ịmụ ebe ihe omume ahụ sitere, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ya ma chee echiche otú ị ga-esi eme ihe ị mụtara ma ị gaa ozi ọma.
3. Olee otú anyị ga-esi akwadebe ihe omume ajụjụ na azịza?
3 Ihe Omume Ajụjụ na Azịza: A na-eduzi ihe omume a otú ahụ e si eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. A na-ekwu okwu dị nkenke tupu a malite na tupu e mechie. Ị mụwa ya, kanye akara n’okpuru ihe ndị dị mkpa e kwuru na paragraf nke ọ bụla, jikerekwa ikwu okwu bara uru ma dị nkenke n’ajụjụ ndị a ga-ajụ.
4. Olee otú anyị kwesịrị isi akwadebe ihe omume ndị na-ege ntị ga-eso atụle?
4 Okwu Ọkà Okwu na Ndị Na-ege Ntị Ga-atụle: Ọkà okwu ga-agwa ndị na-ege ntị okwu a, ma, ọ ga-agwa ha ka ha tinyetụ ọnụ n’ebe ụfọdụ. Ọ bụrụ na ị kaa ihe n’okpuru ihe ndị dị mkpa e kwuru n’akwụkwọ ebe ihe omume ahụ si, gụọkwa amaokwu Baịbụl ndị e dere na ya, ọ ga-eme ka i nwee ike itinye ọnụ ma a jụọ ajụjụ. Nwanna na-eme ihe omume a ga-eme ike ya niile iji hụ na ndị na-ege ntị tinyere ọnụ n’ihe ndị dị mkpa n’ihe omume ahụ.
5. Gịnị ga-enyere anyị aka irite ezigbo uru n’ihe ngosi?
5 Ihe Ngosi: Ihe omume ụfọdụ ga-enwe ihe ngosi dabara adaba ga-egosi otú ihe a mụrụ ga-esi aba uru n’ókèala ọgbakọ. A ga-agwa ndị okenye, ma ọ bụ ndị nkwusa ma nke a na-akọ ma ọ bụkwanụ ndị ọsụ ụzọ ka ha mee ihe ngosi ahụ. Mgbe ị na-akwadebe ihe omume a, chee echiche otú ndị ga-eme ya ga-esi eme ya. Ọ bụrụ na ihe ngosi ahụ si n’ihe e dere n’Ozi Alaeze, chee echiche otú ị ga-esi eme ya ma ị gaa ozi ọma dabere n’ụdị onye nwe ụlọ ị hụrụ. Hụ na i ji akwụkwọ ma ọ bụ magazin ahụ a ga-eji eme ihe ngosi. Ná mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ, ọ ga-abara unu uru ma unu mee ihe ngosi ndị ahụ n’ụlọ unu.
6. Olee ihe ụfọdụ mere anyị ga-eji akwadebe ihe omume Nzukọ Ije Ozi?
6 Ihe omume Nzukọ Ije Ozi na-aka ụtọ ma ọ bụrụ na anyị akwadebe ihe a ga-amụ ma chee echiche banyere ha tupu na-abịa. Anyị mee ihe a e kwuru, ọ ga-eme ka anyị gbarịta ibe anyị ezigbo ume. (Rom 1:11, 12) Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge kwadebe Nzukọ Ije Ozi, ọ ga-enyekwuru anyị aka ịrụ ọrụ e nyere anyị.—2 Tim. 3:17.