Ì Nwere Ike Iwepụtakwu Oge Maka Ozi Ọma?
1. Olee otú anyị kwesịrị isi were ozi anyị, ọ̀ bụkwa maka gịnị?
1 Mgbe Jizọs hụrụ otú ọtụtụ ndị si egosi mmasị n’ozi ọma Alaeze ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha ‘rịọwa Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.’ (Mat. 9:37, 38) Ebe ọ bụ na oge owuwe ihe ubi ahụ agwụwala, anyị kwesịrị iji ọrụ a kpọrọ ihe ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ikpe ekpere ma tụlee otú anyị nwere ike isi wepụtakwuo oge maka ozi ọma.—Jọn 14:13, 14.
2. Olee otú ụfọdụ sirila wepụta onwe ha ịrụkwu ọrụ n’ubi ahụ?
2 Otú Anyị Ga-esi Ewepụtakwu Oge Maka Ozi Ọma: Jehova eduziela ma nyere ọtụtụ ndị aka iwere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile. (Ọma 26:2, 3; Fil. 4:6) Ụfọdụ gbara mbọ pụrụ iche rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa n’afọ a. Otú a ha si wepụtakwuo oge jee ozi ọma amaka. Obi ụtọ ha nwetara n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka mere ka ọtụtụ n’ime ha chebawaziere ọrụ ọsụ ụzọ oge niile echiche.—Ọrụ 20:35.
3. Ọ bụrụ na ị rụbuola ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, olee ihe i nwere ike ịtụle ugbu a?
3 Ì Nwere Ike Iwereghachi Ọrụ Ọsụ Ụzọ Oge Niile?: Ọ bụrụ na ị rụbuola ọrụ ọsụ ụzọ oge niile, o doro anya na ị ka na-echeta otú o si tọọ gị ụtọ n’oge ahụ. Ì kpeela ekpere ma tụlee ma ị̀ ga-enweli ike iwereghachi ọrụ ọsụ ụzọ oge niile? O nwere ike nsogbu mere i ji kwụsị ịsụ ụzọ oge niile n’oge ahụ adịghịzi ugbu a. Ọ ga-abụ na oge eruola ka i nwetaghachi ihe ùgwù a pụrụ iche i nweburu.—1 Jọn 5:14, 15.
4. Olee ohere pụrụ iche onye ọ bụla n’ime anyị nwere?
4 Ọrụ owuwe ihe ubi ahụ na-aga nnọọ n’ihu, ọ gwụwakwala. (Jọn 4:35, 36) Ka anyị niile leruo ọnọdụ anyị ugbu a anya, chọpụta ma ànyị nwere ike hazigharịa ihe ndị anyị na-eme n’ụbọchị iji nwee ike wepụtakwuo oge maka ozi ọma. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na anyị ejiri obi ọcha anyị chọpụta na anyị agaghị emeli ya, ànyị nwere ike ịchọ ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi? (Mak 12:41-44) Ndị niile ọnọdụ ha ugbu a kwere ka ha rụọ ọrụ ọsụ ụzọ nwere ihe ùgwù na Jehova ji ha na-arụ ọrụ a pụrụ iche!—Ọma 110:3.