Mgbe Dị Mma Anyị Kwesịrị Igere Abụ Anyị
Ndị ohu Chineke ma na abụ bụ otu n’ime onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị. (Jems 1:17) Ọtụtụ ọgbakọ na-akpọnyekarị abụ tupu ha amalite ọmụmụ ihe, ha na-akpọnyekwa ya mgbe ha gbasara. Ịkpọnye abụ tupu a malite ọmụmụ ihe bụ ụzọ dị mma e kwesịrị isi na-anabata ụmụnna ndị bịara ọmụmụ ihe. Ọ na-eme ka uche anyị kpakọọ ọnụ tupu ọmụmụ ihe ahụ amalite. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-enyere anyị aka ịmụta otú e si abụ abụ ọhụrụ ndị dị n’akwụkwọ abụ anyị. A kpọnye ha mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, ọ na-eme ka obi dị anyị jụụ ka anyị na ụmụnna anyị na-akparịta ụka. N’ihi ya, ndị okenye ọgbakọ ọ bụla kwesịrị ịhụ na a na-akpọnye abụ anyị tupu ọmụmụ ihe ebido nakwa mgbe a gbasara. E kwesịrị ịna-akpọnye nke ahụ a kpọrọ Sing to Jehovah—Piano Accompaniment. E kwesịkwara ịkpọnye ya otú ọ na-agaghị adachi ndị mmadụ ntị mgbe ha na ibe ha na-akparịta ụka.