Ìhè Chineke Na-eme Ka Ọchịchịrị Ghara Ịdị
Na Baịbụl, a na-ejikarị ìhè atụnyere eziokwu, jirikwa ọchịchịrị atụnyere ụgha. (Ọma 43:3; Aịza. 5:20) Jọn onyeozi kwuru, sị: “Chineke bụ ìhè, ọ dịghịkwa ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ma ọlị.” (1 Jọn 1:5) Ị̀ chọpụtara na amaokwu a kwuru na ìhè ime mmụọ si n’ebe Jehova nọ abịa nakwa na o nweghị ihe jikọrọ ya na ọchịchịrị ime mmụọ? Oleezi onye ọchịchịrị ime mmụọ si n’aka ya abịa? Ihe anyị ga-atụle ugbu a ga-enyere anyị aka ịma azịza ajụjụ a. Anyị ga-atụlekwa ihe anyị ga-eme ka anyị ghara ịnọ n’ọchịchịrị ime mmụọ nakwa otú anyị ga-esi na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ìhè ime mmụọ Chineke nyere anyị.
Anyị kwesịrị ịna-eto Jehova maka otú o si nye anyị ìhè nke eziokwu Baịbụl. Eze Devid gwara Jehova, sị: “Ị bụ oriọna m, Jehova, ọ bụkwa Jehova na-eme ka ìhè nwuo n’ọchịchịrị m.” Ihe ahụ Devid kwuru ka anyịnwa na-ekwukwa. (2 Sam. 22:29) Ma, nke a ekwesịghị ime ka anyị tụsara ahụ́, chee na ụka agwụla. Anyị mee otú ahụ, ọ gaghị adị anya, anyị alaghachi n’ọchịchịrị ahụ anyị si pụta. Anyị kwesịrị iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka ndị nọ n’ọchịchịrị n’ụwa a hụ ìhè nke eziokwu. Ka anyị jisie ike ‘na-eje ije dị ka ụmụ nke ìhè.’—Efe. 5:8.