Ije Ije n’Okporo Ụzọ Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya
Jehova bụ Onye na-enye ìhè ime mmụọ. (Abụ Ọma 43:3) N’agbanyeghị na ụwa anyị a nọ n’ezigbote ọchịchịrị ime mmụọ, ezi Chineke anyị na-amụkwasị anyị ìhè ime mmụọ ya mgbe niile. Olee uru nke a baarala anyị? Baịbụl zara, sị: “Ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè nke na-enwupụ enwupụ ka chi na-abọwanye ruo mgbe chi bọchara.” (Ilu 4:18) N’eziokwu, ìhè nke Okwu Chineke emeela ka ndị Jehova nwee ọganihu n’otú e si hazie ha, n’ihe ha na-akụzi nakwa n’otú ha si akpa àgwà. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ gbasara ọgbakọ Jehova ma hụ otú ìhè Okwu Chineke sirila nyere anyị aka n’ụzọ ebe atọ a.
N’ezie, ụwa anyị bi n’ime ya nọ n’ezigbote ọchịchịrị. Ka Jehova na-amụkwasị ndị ya ìhè ya, ndị mmadụ ga na-ahụkwu ọdịiche dị n’etiti anyị na ha. Olee uru ìhè a na-abara anyị? Ọ bụrụ na anyị agbaa ọkụ n’olulu dị n’okporo ụzọ gbara ọchịchịrị, olulu ahụ agaghị apụ. Otú ahụkwa ka ìhè nke Okwu Chineke na-agaghị ewepụ ọnyà dị iche iche Setan siiri anyị. Ma, ìhè ahụ ga-enyere anyị aka izere ha, ka anyị nwee ike ịnọgide na-eje ije n’okporo ụzọ Jehova. N’ihi ya, ka anyị nọgide na-ege ntị n’okwu amụma Jehova, n’ihi na ọ bụ “oriọna nke na-enwu n’ebe gbara ọchịchịrị.”—2 Pita 1:19.