Ihe I Nwere Ike Ikwu
Akụkọ Alaeze nke 38
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-enye ndị mmadụ akwụkwọ a n’ọnwa a. Ngwanụ, were nke gị.”
Ihe I nwere ike ime: Ọ ga-adị mma ka i gbuo okwu gị nkenke, ka unu nwee ike ịrụzu ókèala unu. Ma, o nwere onye ị ga-abịa na nke ya, ya achọọ ka ị kọtụkwuoro ya ihe dị n’akwụkwọ ahụ. I nweta ụdị onye ahụ, i nwere ike ịjụ ya ma ò chere na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ. Ya zachaa, gụọrọ ya Ọrụ Ndịozi 24:15. Ị gụchaa, gwa ya ihe ole na ole dị na traktị ahụ. Tupu ị lawa, gụpụtara ya ajụjụ ahụ dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-echebara Echiche,” nke dị n’azụ akwụkwọ ahụ. Gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa na nke ya.
Ụlọ Nche Jenụwarị 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị bịara na nke unu ka anyị kwuo gbasara otu ihe na-enye anyị niile nsogbu. Ihe ahụ bụ ọnwụ. Olee otú obi na-adị anyị ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa, gị asị ya:] Ọ na-abụ ọtụtụ n’ime anyị gụọ amaokwu a dị na Baịbụl anyị na-aga ịgụ ugbu a obi ajụrụtụ ha. [Gụọ Aịzaya 25:8.] Ụlọ Nche a mere ka anyị mara ihe Baịbụl kwuru gbasara otú Chineke ga-esi eme ka ọnwụ ghara ịdị nakwa otú ọ ga-esi kpọlite ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụla anwụ.”
Teta! Jenụwarị–Febụwarị
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Ọtụtụ ndị na-ekwu na àgwà ọma alaala. Ì chere na ihe a ha na-ekwu bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa. Ọ zachaa gị asị ya:] Baịbụl kwuru na ụdị ihe a na-emenụ ugbu a ga-eme. [Gụọ 2 Timoti 3:1-5.] Teta! a kwuru otú Baịbụl ga-esi nyere anyị aka ịna-akpa àgwà ọma.”