Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Jenụwarị 1
“Olee otú i chere ụwa a ga-adị ma mmadụ niile na-eme ihe a Baịbụl kwuru? [Gụọ Ndị Hibru 13:18. Chere ka ọ zaa.] Amaokwu Baịbụl a na-agwa anyị ka anyị na-akwụwa aka ọtọ n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi na-eme ya.
Teta! Jenụwarị–Febụwarị
“Ozizi ụgha a na-ezi na chọọchị dị iche iche na àgwà ọjọọ ndị chọọchị na-akpa agwụla ọtụtụ ndị ike. Gịnị ka i chere ga-eme okpukpe ụgha niile n’ọdịnihu? [Chere ka ọ zaa.] Teta! a kwuru gbasara amụma e buru n’akwụkwọ Mkpughe nke gosiri na ndị mmadụ ga-akwụsị ịna-aga chọọchị nakwa na Chineke ga-ebibi okpukpe ụgha niile.”