Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ụlọ Nche Mee 1
“Nsogbu juru n’ụwa taa. Ọ bụrụ na i nwere ike ịkwụsị otu n’ime ha, olee nke ị ga-akwụsị? [Chere ka ọ zaa.] Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị ya, kwụsịkwa nsogbu ndị ọzọ e nwere taa. [I nwere ike ịgụrụ ya amaokwu Baịbụl dabara n’ihe unu na-ekwu. Amaokwu ndị dị ka Daniel 2:44; Ilu 2:21, 22; Matiu 7:21-23; ma ọ bụkwanụ 2 Pita 3:7.] Ụlọ Nche a kwuru otú Chineke ga-esi akwụsị nsogbu niile anyị na-enwe n’ụwa taa nakwa mgbe ọ ga-akwụsị ha.”
Teta! Mee–Jun
“Anyị na-enye ndị mmadụ Teta! a taa. [Gosi ya ihe e dere n’ihu ya.] Ajụjụ mbụ a jụrụ ebe a bụ, ‘Chineke Ọ̀ Dị?’ Onye ọ bụla a jụrụ ya ga-enwe ihe ọ ga-ekwu. Ma ka m jụgodị gị, olee ndị i chere nwere olileanya na ihe ga-emecha dị mma, ọ̀ bụ ndị kwere na Chineke dị ka ọ̀ bụ ndị na-ekweghị? [Chere ka ọ zaa.] E nwere nkwa Chineke kwere nke na-eme ka ọtụtụ ndị nwee olileanya na ihe ga-emecha dị mma. [Gụọ Abụ Ọma 37:10, 11.] Teta! a kwuru ụzọ ihe anọ mere anyị kwesịrị iji gbaa mbọ chọpụta ma Chineke ọ̀ dị n’eziokwu.”