Anyị Nwere Ike Ịmụta Ihe n’Aka Ndị Nkwusa Bụ́ Aka Ochie
Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị nkwusa bụ́ aka ochie n’ọgbakọ Jehova, anyị anaghịkwa eji ha egwu egwu. Ụfọdụ n’ime ha ejeerela Jehova ozi ọtụtụ afọ, ebe ndị nke ọzọ ka malitere n’oge na-adịbeghị anya. Ha niile ejirila anya ha hụ na otú e si ekwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche n’oge ikpeazụ a na-egosi na Jizọs na-edu ọgbakọ ya. (Mat. 28:19, 20) Ozi a ha na-ejere Chineke na-eme ka ha nweta “ike karịrị ike nkịtị” mgbe ọ bụla nsogbu bịaara ha. (2 Kọr. 4:7) E nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ndị nkwusa bụ́ aka ochie. Obi na-atọkwa ha ụtọ ịkụziri ndị ọzọ ihe. (Ọma 71:18) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ mụta ihe n’aka ha. Ma, olee otú anyị nwere ike isi mee ya?
Mgbe Anyị Nọ n’Ozi Ọma. E kwesịrị inye ndị malitere ikwusa ozi ọma ọhụrụ ma ọ bụ ndị na-amachaghị otú e si ezi ozi ọma ọzụzụ ka ha nwee ike ịna-eme nke ọma n’ozi ọma. Ọ bụrụ na ha eleruo anya ala hụ otú ndị nkwusa bụ́ aka ochie si ekwusa ozi ọma, ha ga-amụta ihe ga-enyere ha aka n’ozi ọma. (Gụọ ihe dị n’isiokwu bụ́ “Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma” n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2015. Gaa na paragraf nke atọ n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Na-enyere Ndị Nkwusa Ọhụrụ Aka.”) È nwere ihe ị mụtara n’aka onye nkwusa bụ́ aka ochie mgbe gị na ya rụrụ n’ozi ọma?
I nwere ike ịgwa onye nkwusa bụ́ aka ochie ka gị na ya rụọ n’ozi ọma. Ọ bụrụ na ahụ́ adịghị ya, i nwere ike ịnọ n’ụlọ ya mgbe ụfọdụ mụọrọ mmadụ Baịbụl. Unu mụchaa, gwa ya ka o kwuo ebe o chere i kwesịrị ịrụ ọrụ.
Wepụta Oge Ka Gị na Ha Na-anọrị: Gbalịa ka gị na ndị nkwusa bụ́ aka ochie na-akọrị n’ihi na ọ ga-eme ka ị matakwuo ha. Unu nwewe ofufe ezinụlọ, i nwere ike ịkpọ otu n’ime ha ka ọ bịa nọnyere unu, gị agbaakwa ya ajụjụ ọnụ. Ọ bụrụ na ahụ́ esichaghị ya ike, unu nwere ike ịhazi ka unu nọrọ n’ụlọ ya nwee ofufe ezinụlọ. I nwere ike ịjụ ya ajụjụ ndị a: ‘Olee otú i si nata eziokwu? Olee ihe ọma ndị Jehova merela gị kemgbe ahụ? Olee otú ọrụ ikwusa ozi ọma sirila na-aga n’ókèala anyị a? Gịnị na-eme gị obi ụtọ n’ife Jehova?’
Atụla anya na ụmụnna ndị a bụ́ aka ochie ga-enwe ike imere gị ihe niile ị chọrọ. Ọ bụghị onyinye niile ka ha nwere otú ahụ anyịnwa na-enweghị onyinye niile ma a bịa n’ikwusa ozi ọma. (Rom 12:6-8) O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha agbadaala n’afọ ndụ, ya emezie ka ha ghara ịna-apụtacha èzí. Ma, e nwere ọtụtụ ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ha n’ihi na ha amụtala ọtụtụ ihe n’ozi ha na-ejere Jehova kemgbe.