Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb19 Febụwarị p. 8
  • Jiri Ntachi Obi Na-echere

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jiri Ntachi Obi Na-echere
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekwela Ka Ihe Ọ Bụla Gbochie Gị Inweta Ihe Ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Ka Ntachi Obi Rụzuo Ọrụ Ya”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Ntachi Obi—Dị Ndị Kraịst Oké Mkpa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Iji Ntachi Obi Na-agba Ọsọ Ahụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
mwb19 Febụwarị p. 8

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Ntachi Obi Na-echere

Afọ ole ka ị nọrọla na-eche ka Alaeze Chineke bịa? Ì jirila ntachi obi na-echere ya n’agbanyeghị ihe isi ike? (Rom 8:25) A na-akpọ ụfọdụ Ndị Kraịst asị, na-echi ha ọnụ n’ala, na-atụ ha mkpọrọ ma ọ bụkwanụ na-eyi ha egwu na a ga-egbu ha. Enwekwara ọtụtụ ndị nsogbu nke ha bụ ọrịa na-anaghị ala ala ma ọ bụ nká.

Gịnị ga-enyere anyị aka iji ntachi obi na-edi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị? Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharị uche na ya iji mee ka okwukwe anyị sie ike. Anyị kwesịkwara ilekwasị anya n’olileanya anyị nwere. (2 Kọr. 4:​16-18; Hib. 12:2) Anyị kwesịrị ịna-arịo Jehova n’ekpere ka o jiri mmụọ nsọ ya nyere anyị aka. (Luk 11:​10, 13; Hib. 5:7) Nna anyị na-ahụ n’anya ga-enyeliri anyị aka ‘iji ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.’​—Kọl. 1:11.

LEENỤ VIDIO BỤ́ KA ANYỊ JIRI “NTACHI OBI NA-AGBA ỌSỌ”​—OBI SIE GỊ IKE NA Ị GA-EMERI, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  • Ebe Jamie na nwunye ya nọ n’ozi ọma

    Gịnị bụ ụfọdụ “ihe a na-atụghị anya ya” nwere ike ịdapụtara mmadụ? (Ekli. 9:11)

  • Ebe Carl ji Baịbụl na-agba Jamie ume mgbe ọ dachara stroke

    Olee otú ekpere na-esi enyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị?

  • Ebe Jamie na Carl gaara otu di na nwunye nleta ọzụzụ atụrụ

    Ọ bụrụ na anyị anaghịzi enwe ike ime ihe buru ibu n’ozi Jehova otú anyị na-emebu, gịnị mere anyị kwesịrị iji lekwasị anya n’ihe ndị anyị na-emeli ugbu a?

  • Ebe Jamie na-eche otú ihe ga-adị ma ahụ́ gbasie ya ike na Paradaịs

    Lekwasị anya n’ụgwọ ọrụ

    Olee ihe ga-enye aka mee ka obi sie gị ike na ị ga-emerili?

Olee ihe ndị i nwere ike ime iji nyere ndị nọ ná nsogbu na ndị ezinụlọ ha aka?

  • Na-agwa ha okwu ọma. Ejila ha na-atụnyere ndị ọzọ

  • Na-ege ha ntị nke ọma

  • Na-ekpe ekpere maka ha, sorokwa ha kpee ekpere

  • Siere ha nri ma ọ bụ nyere ha aka rụọ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya