AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | 1 NDỊ KỌRỊNT 7-9
Mmadụ Ịnọ n’Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye Bụ Onyinye
Kemgbe ọtụtụ afọ, Ndị Kraịst amatala na ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye na-aba ọtụtụ uru. Ọ na-eme ka mmadụ nwee ike ijekwuru Jehova ozi, ịbịarukwu ya nso na imeta ọtụtụ ndị enyi.
Ndị so gaa ozi ọma n’Ọstrelịa n’afọ 1937; mgbe nwa akwụkwọ Gilied rutere Meksiko, ebe ọ ga-ejewe ozi n’afọ 1947
Onye na-ekwusa ozi ọma na Brazil; ndị nọ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze na Malawi
AJỤJỤ NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, olee otú ị ga-esi jiri ohere ahụ jekwuoro Chineke ozi?
Olee otú ụmụnna ga-esi na-agba ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ume ma na-akwado ha?