AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 12
Ihe Ememme Ngabiga Na-akụziri Ndị Kraịst
Ihe mere ka ihe otiti nke iri ahụ ghara imetụta ụmụ Izrel bụ n’ihi na ha rubere isi n’iwu Chineke nyere ha. (Ọpụ. 12:28) Jehova gwara ụmụ Izrel ka ezinụlọ ọ bụla zukọta n’ụlọ ha n’abalị Naịsan 14. Ha ga-egbu nwa atụrụ ma ọ bụ nwa ewu gbara otu afọ ahụ́ dị mma. Ọ ga-abụkwa oké. Ha ga-efesa ọbara ya n’awara ụzọ ha nakwa n’elu ụzọ ha. Ha ga-ahụ anụ ya n’ọkụ ma rie ya ngwa ngwa. Ha agaghịkwa esi n’ụlọ ha pụta ruo ụtụtụ.—Ọpụ. 12:9-11, 22.
Olee ụzọ ụfọdụ nrubeisi si echebe anyị taa?