AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌPỤPỤ 25-26
Ihe Kacha Mkpa n’Ụlọikwuu Ahụ
Igbe ahụ bụ ihe kacha mkpa dị n’ụlọikwuu ahụ nakwa n’ebe ụmụ Izrel bi. Urukpuru dị n’etiti cherọb abụọ ahụ dị n’ihe mkpuchi igbe ahụ na-egosi na Chineke nọ n’ebe ahụ. N’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie a na-eme kwa afọ, nnukwu onyeisi nchụàjà na-abanye n’Ebe Kasị Nsọ, fesa ọbara oké ehi na nke mkpi n’ihu ihe mkpuchi ahụ iji kpuchie mmehie ụmụ Izrel. (Lev. 16:14, 15) Ihe a nọchiri anya mgbe Jizọs, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà ka nke ndị Izrel, banyere n’eluigwe n’ihu Jehova ma gosi Jehova uru àjà ahụ ọ chụrụ bara.—Hib. 9:24-26.
Chọpụta amaokwu Baịbụl ndị dabara na nke ọ bụla n’ime uru ndị anyị na-erite n’ihi àjà Jizọs chụrụ:
AMAOKWU BAỊBỤL
URU
olileanya ịdị ndụ ebighị ebi
mgbaghara mmehie
akọnuche dị ọcha
Olee ihe anyị ga-eme iji rite uru ndị a?