OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ì Nwere Ike Inye Jehova Oge Gị na Ike Gị?
Anyị na-ahụ otú nzukọ Jehova n’ụwa si na-amụba n’ike n’ike, otú ahụ Aịzaya buru n’amụma. (Aịza. 54:2) Ihe a mere ka ọ dị mkpa na a ga-arụkwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, nakwa alaka ụlọ ọrụ dị iche iche. A rụchaa ụlọ ndị a, e kwesịrị ịna-elekọta ha. Ka oge na-aga, o nwekwara ike ịdị mkpa ka a rụzigharịa ụfọdụ n’ime ha. Olee ohere ihe a nyere anyị inye Jehova oge anyị na ike anyị?
Anyị nwere ike iso ìgwè ozi ubi anyị debe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma ọ bụrụ ìgwè anyị ketara ime ya
Anyị nwere ike iwepụta onwe anyị ka a zụọ anyị maka ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị
Anyị nwere ike idejupụta fọm a na-akpọ Local Design/Construction Volunteer Application (DC-50) iji na-enye aka mgbe ụfọdụ n’ịrụ na ilekọta ụlọ ndị nzukọ Jehova na-arụ dị nso n’ebe anyị bi
Anyị nwere ike idejupụta fọm a na-akpọ Application for Volunteer Program (A-19), wepụtakwa onwe anyị inye aka n’alaka ụlọ ọrụ anyị ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ alaka ụlọ ọrụ anyị na-elekọta. Mmadụ nwere ike iwepụta onwe ya inye aka otu izu ma ọ bụ karịa
LEENỤ VIDIO BỤ́ ANYỊ NA-EME ATỤMATỤ ỊRỤ ỤLỌ ỌHỤRỤ—NKEBI YA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee otú nzukọ Jehova si jirikwuo vidio akụzi ihe kemgbe afọ 2014?
Olee ihe a na-eme atụmatụ iwu iji nwee ike ịna-emepụtakwu vidio ndị a dị mkpa e ji akụzi ihe? Oleekwa mgbe e bu n’obi ịmalite ya na ịrụcha ya?
Olee otú ndị wepụtara onwe ha ga-esi nye aka n’ọrụ a?
Ọ bụrụ ị chọrọ inye aka n’ụlọ a a ga-arụ na Ramapo, gịnị mere i ji kwesị idejupụta fọm a na-akpọ DC-50 ma soro ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’obodo unu na-arụ ọrụ?
Gịnị na-egosi na aka Jehova dị n’ọrụ a?
Olee otú anyị nwere ike isi kwado ọrụ a ọ bụrụgodị na anyị agaghị agali nye aka?