OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ | KPEBIE IHE NDỊ Ị GA-EME N’AFỌ IJE OZI NA-ABỊANỤ
Na-enye Aka n’Ebe A Na-arụ Ụlọ Ndị Nzukọ Jehova Nwe
Iso na-arụ ụlọ ndị nzukọ Jehova nwe bụ otu ụzọ anyị si ejere Jehova ozi dị nsọ (Ọpụ. 36:1) Lee ma ị̀ ga-enwe ike iso na-arụ ụlọ ndị a mgbe ụfọdụ n’ebe dị nso n’ebe i bi. Dejupụta fọm a na-akpọ Local Design/Construction Volunteer Application (DC-50). I nwekwara ike ikpebi iji ọtụtụ izu ma ọ bụ ọtụtụ ọnwa soro na-arụ ụlọ ndị nke dị anya n’ebe i bi. Ị chọọ ime nke ahụ, dejupụta fọm nke a na-akpọ Application for Volunteer Program (A-19). Ọ bụghị iwu na ị ga-ama ihe banyere ịrụ ụlọ tupu gị ewepụta onwe gị maka ọrụ a.—Nehe. 2:1, 4, 5.
LEENỤ VIDIO BỤ́ JIRI OKWUKWE NA-EME ỌTỤTỤ IHE N’ỌRỤ ONYENWE ANYỊ—NA-ENYE AKA N’EBE A NA-ARỤ ỤLỌ NDỊ NZUKỌ JEHOVA NWE, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ndị nọ na-eche Sarah uche, oleekwa ihe nyeere ya aka?