OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Jiri Akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi Na-akụzi Ihe n’Ozi Ọma
Obi dị anyị ezigbo ụtọ inweta broshọ na akwụkwọ ọhụrụ anyị ga-eji na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Ekpere anyị bụ ka Jehova gọzie mbọ anyị na-agba imekwu ka ọtụtụ ndị ghọọ ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:18-20; 1 Kọr. 3:6-9) Olee otú anyị ga-esi jiri akwụkwọ ọhụrụ ndị a na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl?
E nwere ụzọ ọhụrụ a ga-esi jiri akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl. Lee ihe ndị ị ga-eme ma ị kwadebewe ịmụrụ mmadụ Baịbụl nakwa ma ị mụwara onye ahụ Baịbụl.a
Gụọ paragraf ndị dị na ya ma leba anya n’ajụjụ ha
Gụọ amaokwu Baịbụl ndị e dere “gụọ” ma nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe ha pụtara
Lee vidio dị n’ebe unu na-amụ ma jiri ajụjụ ndị e depụtara tụlee ya
Gbalịanụ na-amụcha otu isi otu mgbe
Ị nọrọ n’ozi ọma, buru ụzọ nye mmadụ nke broshọ iji mara ma ò nwere mmasị ịmụ Baịbụl. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ, “Otú E Si Enye Mmadụ Broshọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi ná Mkparịta Ụka nke Mbụ.”) Unu mụchaa nke broshọ ahụ, ya abụrụ na ọ ka nwere mmasị ịmụrụ na-aga, nyezie ya nke akwụkwọ ya ma malitenụ n’isi nke 04 mụrụ gawa. Ọ bụrụ na o nwere onye gị na ya na-amụ akwụkwọ Baịbụl Na-akụziri Anyị ma ọ bụ akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke, gafeenụ n’akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi ma kpebie isi nke unu ga-eji malite.
LEENỤ VIDIO BỤ́ OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ NA Ị CHỌRỌ ỊMỤ BAỊBỤL, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Gịnị ka ndị ị na-amụrụ ihe ga-amụta n’akwụkwọ ọhụrụ a?
Gịnị mere i kwesịrị iji gosi ndị chọrọ ịmụ Baịbụl vidio a?
Ka unu na-amụ ihe na-aga, olee ihe ndị i kwesịrị ịgba onye ị na-amụrụ ihe ume ka o kpebie ime ma gbaakwa mbọ mee?—Lee chaatị bụ́ “Ihe E Kwuru ná Nkebi nke Ọ Bụla na Ihe Onye A Na-amụrụ Baịbụl Ga-eme”
a IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Unu mụwa ihe, ọ bụghị iwu na unu ga-atụle ihe ndị dị n’ebe e dere “Ihe Ị Ga-elebakwu Anya.” Ma, jiri oge nke aka gị leba anya n’ihe ndị ahụ. Ọ ga-eme ka ị mara ihe ga-akacha amasị onye ị na-amụrụ ihe na ihe ga-akacha enyere ya aka. Ọ bụrụ na i mepere akwụkwọ a n’ekwentị, ị pịtụ aka n’ihe ndị ahụ, ọ ga-emepere gị ebe ha dị.
IHE E KWURU NÁ NKEBI NKE Ọ BỤLA NA IHE ONYE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL GA-EME |
|||
---|---|---|---|
ISI |
IHE E KWURU NA YA |
IHE ONYE A NA-AMỤRỤ BAỊBỤL GA-EME |
|
01-12 |
Otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka nakwa otú ị ga-esi matakwuo onye e dere uche ya na ya |
Ihe ọma Chineke meere anyị na ụdị ofufe na-adị ya mma |
|
13-33 |
Ihe Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme |
Otú ị ga-esi nọgide n’ịhụnanya Chineke |
|
34-47 |
Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-agụ Baịbụl, na-akwadebe ọmụmụ ihe ya, malitekwa ịbịa ọmụmụ ihe |
Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka ọ na-akọrọ ndị ọzọ eziokwu ndị ọ na-amụta, ka ọ ghọọkwa onye nkwusa |
|
48-60 |
Gbaa onye ị na-amụrụ ihe ume ka o nyefee Jehova onwe ya, meekwa baptizim |
Kụziere onye ị na-amụrụ ihe otú ọ ga-esi amata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi na otú ọ ga-esi na-abịarukwu Jehova nso |