Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 24
  • Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Enweghị Ike Ime Ka Udo Dịrị n’Ụwa?—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Ònye Ga-eduru Ihe A Kporo Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ezi Udo—Site n’Ebee?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 24
Ụgbọelu e ji alụ agha

Gịnị Mere Udo Adịbeghị n’Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

Mbọ niile ụmụ mmadụ gbarala iji mee ka udo dịrị n’ụwa enwebeghị isi. Ndị nke ha ka ga-agba n’ọdịnihu agaghịkwa enwe isi. Lee ihe kpatara ya:

  • Jeremaya 10:23 kwuru, sị: “Ọ bụghị mmadụ ka ọ dịịrị ịtụziri onwe ya ụzọ nke ọ ga-eso.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Chineke ekeghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị onwe ha. N’ihi ya, ha emekataghị mee ka udo dịrị n’ụwa.

  • Abụ Ọma 146:3, 4 sịrị: “Atụkwasala obi gị na ndị ọchịchị, ma ọ bụkwa na mmadụ nkịtị, onye na-enweghị ike ịzọpụta gị. Mgbe o kubiri ume ka ọ na-alaghachi n’aja, atụmaatụ ya niile ga-ala n’iyi n’ụbọchị ahụ.” (Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ndị ọchịchị agaghị emeli ka agha kwụsị, otú ọ sọkwara ha gbaa ná mbọ.

  • 2 Timoti 3:1–4 kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ . . . ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye, ndị isi ike, ndị nganga fụliri elu.” Anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ ‘oge ikpeazụ.’ Àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa n’oge a agaghị ekwe ka e nwee udo n’ụwa.

  • Mkpughe 12:12 sịrị: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri, n’ihi na Ekwensu agbadatawo n’ebe unu nọ, ọ na-ewe oké iwe, ebe ọ maara na o nwere oge dị mkpirikpi.” Ekwensu bụ onye iro Chineke. Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na a chụdatara ya n’ụwa. Ọ bụ yanwa mere ụmụ mmadụ ji akpa arụ dị iche iche juru n’ụwa anyị a. Ebe ọ bụ yanwa na-achị ụwa ọjọọ a, udo emekataghị dịrị na ya.—Jọn 12:31.

  • Daniel 2:44 kwuru, sị: “[Alaeze Chineke] ga-egwepịa alaeze ndị a niile, mee ka ha ghara ịdịkwa, ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.” Mmadụ niile chọrọ ka udo dịrị n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Ma o nweghị ọchịchị mmadụ ọ bụla ga-emeli ya. Naanị Alaeze Chineke ga-emeli ya.—Abụ Ọma 145:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya