8 Ma ọ bụrụ na onye kwere nkwa ahụ dara ogbenye nke na ọ gaghị akwụli ọnụ ahịa e kwuru,+ onye ahụ e kwere ná nkwa ga-aga guzoro n’ihu onye nchụàjà. Onye nchụàjà ga-ekwu ego ole a ga-akwụ n’isi ya. Ọ bụ ego ole onye ahụ kwere nkwa ga-akwụli ka onye nchụàjà ga-eji ekpebi ego ole ọ ga-agwa ya kwụọ.+