9 Ma m nwere otu onye bụ́ nduru m,+ onye nke m, onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ Ọ bụ nwa agbọghọ nke nne ya hụrụ n’anya. Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ nke nne ya mụrụ. Ụmụ nwaanyị hụrụ ya, ha wee kpọọ ya onye obi ụtọ; ndị nwunye eze na ndị iko nwaanyị hụkwara ya, ha wee jaa ya mma,+