Abụ Solomọn
6 “Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara, gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma?+ Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara, ka anyị soro gị chọwa ya?”
2 “Onye m hụrụ n’anya gara n’ubi ya a gbara ogige,+ n’ubi a kọrọ akọ, nke a kụrụ ahịhịa na-esi ísì ụtọ,+ ịga zụọ atụrụ+ n’ubi a gbara ogige, na ịga kụrụ okooko lili. 3 Abụ m nke onye m hụrụ n’anya, onye m hụrụ n’anya bụkwa nke m.+ Ọ na-azụ atụrụ+ n’ebe okooko lili juru.”
4 “Enyi m nwaanyị,+ ị mara mma dị ka Obodo Ọma,+ ị mara mma dị ka Jeruselem,+ ị dị ebube dị ka ndị agha+ gbara ọkọlọtọ gburugburu.+ 5 Kwụsị ile m anya,+ n’ihi na o mewo ka ahụ́ kpaghasịa m. Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu si na Gilied madata.+ 6 Ezé gị dị ka ìgwè nne atụrụ si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta, ha niile na-amụ ejima ejima, ọ dịghịkwa nke ọ bụla n’ime ha ụmụ ya nwụnahụrụ.+ 7 Agba ntị gị abụọ, nke i kpuchiri ákwà,+ yiri mkpụrụ pọmigranet a pịwara abụọ. 8 A pụrụ inwe ndị nwunye eze iri isii na ndị iko nwaanyị iri asatọ na ụmụ agbọghọ a na-apụghị ịgụta ọnụ.+ 9 Ma m nwere otu onye bụ́ nduru m,+ onye nke m, onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta.+ Ọ bụ nwa agbọghọ nke nne ya hụrụ n’anya. Ọ bụ onye na-enweghị ntụpọ nke nne ya mụrụ. Ụmụ nwaanyị hụrụ ya, ha wee kpọọ ya onye obi ụtọ; ndị nwunye eze na ndị iko nwaanyị hụkwara ya, ha wee jaa ya mma,+ 10 ‘Ònye bụ nwaanyị a+ nke na-eledata anya dị ka chi ọbụbọ,+ nke mara mma dị ka ọnwa gbazuru agbazu,+ nke dị ọcha dị ka anyanwụ na-achasi ike,+ dịkwa ebube dị ka ndị agha gbara ọkọlọtọ gburugburu?’”+
11 “Agbadara m n’ubi+ osisi ụkpa,* ka m hụ ifuru ndị mara na ndagwurugwu,+ ka m hụ ma osisi vaịn ò puola, ma osisi pọmigranet ọ̀ maala ifuru.+ 12 Tupu mụ amara ihe na-eme, agụụ m nwere ịhụ ihe ndị a mere ka m bịa n’ebe ụgbọ ịnyịnya nke ndị m, bụ́ ndị na-enye onwe ha n’afọ ofufo, dị.”
13 “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem! Lọghachi, lọghachi, ka anyị hụ gị!”+
“Gịnị ka unu hụrụ n’ahụ́ nwa agbọghọ Shulem?”+
“Ọ bụ ihe yiri ìgwè abụọ na-agba egwú!”