Abụ Solomọn
5 “Abatawo m n’ubi m a gbara ogige,+ nwanne m nwaanyị,+ nwaanyị m na-alụ ọhụrụ.+ Ewerewo m ihe m na-esi ísì ụtọ bụ́ mea,+ kparakwa ahịhịa m nke na-esi ísì ụtọ. Arachawo m mmanụ aṅụ m, taakwa ụgbụgbọ ya;+ aṅụwo m mmanya m na mmiri ara ehi m.”
“Ndị enyi m, rienụ ihe! Ṅụọnụ ihe ọṅụṅụ, ka otú unu si egosi ịhụnanya gbuokwa unu ka mmanya!”+
2 “Ana m arahụ ụra, ma obi m mụ anya.+ Ana m anụ ụda aka onye m hụrụ n’anya na-akụ!”+
“Megheere m ụzọ,+ nwanne m nwaanyị, enyi m nwaanyị, nduru m, onye nke m, onye na-enweghị ihe a ga-eji taa ya ụta!+ N’ihi na igirigi ejuwo m isi, ntutu isi m jupụtara n’igirigi dara n’abalị.”+
3 “‘Eyipụwo m uwe mwụda m. Olee otú m ga-esi yiri ya ọzọ? Asawo m ụkwụ m. Olee otú m ga-esi metọọ ya?’ 4 Onye m hụrụ n’anya seere aka ya n’oghere ibo ụzọ, ahụ́+ wee malite ịgba m ghara ghara. 5 Mụ onwe m biliri ọtọ ka m megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ, ihe na-esi ísì ụtọ bụ́ mea wee si n’aka m na-agụsị, mmanụ mea sikwa na mkpịsị aka m na-atapụ, na-atasa n’oghere ugodi. 6 Mụ onwe m wee megheere onye m hụrụ n’anya ụzọ, ma onye m hụrụ n’anya anọkwaghị ya, ọ pụọla. Obi mapụrụ m mgbe o kwuru okwu. Achọrọ m ya, ma ahụghị m ya.+ M kpọrọ ya òkù, ma ọ zaghị m. 7 Ndị nche+ ndị na-agagharị n’obodo hụrụ m. Ha tiri m ihe, ha merụrụ m ahụ́. Ndị na-eche mgbidi+ nche dọọrọ ákwà m gbokwasịrị n’ahụ́.
8 “Ụmụ nwaanyị Jeruselem,+ emewo m ka unu ṅụọ iyi+ na ọ bụrụ na unu ahụ onye m hụrụ n’anya,+ gwanụ ya na ịhụnanya eriela m obi.”+
9 “Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara onye ọ bụla ọzọ a hụrụ n’anya,+ gị nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma?+ Olee ihe onye ị hụrụ n’anya ji kara onye ọ bụla ọzọ a hụrụ n’anya, nke mere i ji mee ka anyị ṅụọ ụdị iyi a?”+
10 “Onye m hụrụ n’anya na-eti ka ọnwa, na-achakwa uhie uhie, ọ bụ ọpụrụiche n’etiti puku ndị ikom iri.+ 11 Isi ya bụ ọlaedo, ọlaedo a nụchara anụcha. Ntutu isi ya bụ ụyọkọ mkpụrụ nkwụ.* Ntutu isi ojii ya dị ka ugoloọma. 12 Anya ya yiri nduru ndị nọ n’akụkụ ọwa mmiri, bụ́ ndị nọ n’ọnụ ọnụ ya na-asa ahụ́ n’ime mmiri ara ehi. 13 Ntì ya yiri ala ubi a kọrọ akọ nke a kụrụ ahịhịa na-esi ísì ụtọ,+ bụ́ ụlọ elu nke ahịhịa na-esi ísì ụtọ juru. Egbugbere ọnụ ya bụ okooko lili, nke mmanụ mea si na ya na-atasị.+ 14 Mkpịsị aka ya bụ ọlaedo, nke nwere nkume krisolaịt. Elu afọ ya bụ efere ọdụ́ e ji safaya kpuchie. 15 Ụkwụ ya bụ ogidi e ji mabụl rụọ nke ntọala ya bụ ọlaedo a nụchara anụcha. O yiri Lebanọn, o nweghị atụ, dị ka osisi sida.+ 16 Okpo ọnụ ya dị ụtọ nke ukwuu,+ ihe niile banyere ya magburu onwe ya. Ụmụ nwaanyị Jeruselem, ọ bụ onye a bụ onye m hụrụ n’anya, ọ bụkwa ya bụ enyi m nwoke.”