7Ya mere, ebe anyị nwere nkwa ndị a,+ ndị m hụrụ n’anya, ka anyị sachapụ+ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ,+ wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.+
2 N’ihi na ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke,+ n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di+ ga-alụ unu+ ka m wee chee unu n’ihu Kraịst+ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.+
27 ka o wee chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya,+ n’enweghị ntụpọ ma ọ bụ ahụ́ ndọlị ma ọ bụ ihe ọ bụla dị otú ahụ, kama ka o wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ.+
14 Ya mere, ndị m hụrụ n’anya, ebe unu na-echere ihe ndị a, gbalịsienụ ike ka o wee hụ unu n’ikpeazụ dị ka ndị na-enweghị ntụpọ+ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo.+
4 Ndị a bụ ndị na-ejighị ụmụ nwaanyị merụọ onwe ha;+ n’eziokwu, ha bụ ndị na-amaghị nwaanyị.+ Ndị a bụ ndị na-eso Nwa Atụrụ ahụ n’agbanyeghị ebe ọ na-eje.+ E si n’etiti ụmụ mmadụ zụta+ ha dị ka mkpụrụ mbụ+ a zụtaara Chineke na Nwa Atụrụ ahụ,