2 N’ihi na ana m ekworo unu ekworo yiri ekworo Chineke,+ n’ihi na mụ onwe m kwere unu nkwa na otu di+ ga-alụ unu+ ka m wee chee unu n’ihu Kraịst+ dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke a na-emerụghị emerụ.+
4 Ndị na-akwa iko,+ ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke?+ Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi+ ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+