23 Ndị eze ga-abụrụ gị ndị nlekọta,+ ada ndị eze ha ga-abụkwa ndị na-enyere gị ụmụ gị ara. Ha ga-akpọrọ gị isiala,+ ha ga-arachakwa ájá dị n’ụkwụ gị;+ ị ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova, onye na-agaghị ekwe ka ihere mee ndị nwere olileanya n’ebe ọ nọ.”+