Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ‘Ha Chọọ Chineke, Ha Ga-achọta Ya’
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 18

      ‘Ha Chọọ Chineke, Ha Ga-achọta Ya’

      Pọl gbanwetụrụ otú o si ezi ozi ọma ma jiri ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya kụziere ha ihe

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 17:16-34

      1-3. (a) Gịnị mere obi adịghị Pọl onyeozi mma n’Atens? (b) Olee ihe anyị ga-amụta ma anyị mụọ otú Pọl si zie ndị Atens ozi ọma?

      OBI adịghị Pọl mma. Ọ nọ n’Atens dị na Gris. E ji agụmakwụkwọ mara obodo a n’oge ochie. Ndị ọkà mmụta bụ́ Sọkretiz, Pleto, na Arịstọtụl kụziri ihe na ya. Ndị Atens anaghị eji okpukpe ha egwu egwu. Ebe ọ bụla Pọl lere anya, ma n’ụlọ nsọ ma n’ámá obodo ma n’okporo ámá, ihe ọ na-ahụ bụ arụsị dị iche iche, n’ihi na ndị Atens na-efe ọtụtụ chi. Pọl ma otú Jehova, bụ́ ezi Chineke, si ele ikpere arụsị anya. (Ọpụ. 20:4, 5) Ọ bụkwa otú ahụ ka Pọl, onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, si ele ya. Ọ kpọrọ ya asị.

      2 Ihe Pọl hụrụ mgbe ọ banyere n’ahịa obodo ahụ wụrụ ya akpata oyi n’ahụ́. A kpụrụ ọtụtụ chi Hemis gba ọtọ n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ, n’akụkụ ebe e si abanye na ya. Ụlọ arụsị jukwara n’ahịa ahụ. Olee otú Pọl ga-esi zie ndị obodo a na-efe ọtụtụ arụsị ozi ọma? Ọ̀ ga-ejideli onwe ya ma chọta ihe ya na ha kweere otu ihe na ya ọ ga-eji zie ha ozi ọma? È nwere ndị ọ ga-enyeliri aka ka ha chọọ ezi Chineke ma chọta ya?

      3 N’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 17:22-31, e dere ihe Pọl gwara ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ. O ji nghọta na akọ gwa ha okwu ruru ha n’obi. Anyị kwesịrị ime ka ya ma anyị ziwe ndị mmadụ ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị amụọ otú Pọl si zie ha ozi ọma, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe banyere otú anyị ga-esi jiri ihe anyị na ndị mmadụ kweere otu ihe na ya na-ezi ha ozi ọma, mụtakwa otú anyị ga-esi eme ka ha chebara ihe anyị gwara ha echiche.

      Izi Ihe “n’Ahịa” (Ọrụ 17:16-21)

      4, 5. Olee ebe Pọl kwusara ozi ọma n’Atens, oleekwa ụdị ndị nọ ebe ahụ?

      4 Pọl gara Atens ná nke ugboro abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K.a Mgbe Pọl nọ na-eche ka Saịlas na Timoti si Beria bịa, “ọ gara n’ụlọ nzukọ” “na-enyere [ndị Juu] aka ịghọta ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ,” otú ọ na-emekarị. Ọ gakwara “n’ahịa” ebe ọ ga-ahụ ndị na-abụghị ndị Juu ka o zie ha ozi ọma. (Ọrụ 17:17) Ahịa ndị Atens dị nso n’ugwu a na-akpọ Akrọpọlis. Ọ bụ nnukwu ahịa. Ma, ọ bụghị naanị ahịa ka a na-azụ na ya, ọ bụkwa ebe ọhaneze na-ezukọ. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na ọ bụ ebe “ndị achụmnta ego, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọkachamara, na ndị na-ede akwụkwọ na-ezukọta.” Ọ na-atọ ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ ụtọ izukọta ebe ahụ akparịta ụka.

      ATENS BỤ OBODO E JI OMENALA NDỊ OGE OCHIE MARA

      Akrọpọlis nke dị n’Atens abụrụla obodo a rụsiri ike ọtụtụ afọ tupu a malite ide akụkọ banyere ya mgbe afọ 700 T.O.N.K. gachara. Atens ghọrọ obodo kachanụ n’obodo niile dị n’Atika. Ọ dị ihe dị ka narị puku hekta abụọ na puku iri ise (250,000). Ugwu na oké osimiri gbakwara ya gburugburu. O yiri ka è nwere ihe jikọrọ aha obodo a bụ́ Atens na aha chi nwaanyị ndị obodo a na-efe bụ́ Atena.

      N’ihe dị ka afọ 600 T.O.N.K., otu onye Atens bụ́ omeiwu aha ya bụ Solọn gbanwere ọtụtụ ihe n’otú e si achị ndị Atens, n’iwu ha, nakwa n’akụnụba obodo ha. O mere ka ihe katụrụ ndị ogbenye mma ma mee ka e nwee ọchịchị onye kwuo uche ya. Ọchịchị ahụ bụ naanị maka ndị nweere onwe ha. Ma, ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ bụ ndị ohu.

      Mgbe ndị Gris merichara ndị Peshia n’ihe dị ka afọ 480 T.O.N.K., Atens ghọrọ isi obodo alaeze na-ebughị ibu. Ụgbọ mmiri ndị e ji ebu ngwá ahịa nweziri ike isi Atens gaa Ịtali na Sisili, bụ́ obodo ndị dị n’ebe ọdịda anyanwụ, gaakwa Saịprọs na Siria, bụ́ obodo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ. Mgbe Atens na-ewu ewu, e ji omenala ndị oge ochie mara ya. E nwekwara ọtụtụ ndị na-eme nkà, ndị na-eme ihe nkiri, ndị ọkachamara, ndị ọkà okwu, ndị edemede, nakwa ndị sayensị na ya. E nwere ọtụtụ ụlọ a rụrụ maka ọhaneze nakwa ọtụtụ ụlọ arụsị n’obodo ahụ. Ị nọrọ n’ebe dị anya lee obodo ahụ, ị ga-ahụ Akrọpọlis bụ́ ugwu kachanụ e nwere n’obodo ahụ. A rụrụ nnukwu ụlọ arụsị Atena n’elu ya. N’ime ụlọ ahụ, e ji ọlaedo na ọdụ́ kpụọ chi Atena. Ọ dị amaụkwụ iri anọ n’ịdị elu.

      Ndị mbụ meriri Atens bụ ndị Spata. E mechaa, ndị Masedonia emerie ya. Ndị Rom bụ ndị ikpeazụ meriri ya ma bukọrọ akụnụba niile dị na ya. Ma n’oge Pọl onyeozi, a ka weere Atens ka nnukwu obodo n’ihi otú o si wuo ewu n’oge ochie. N’eziokwu, e nweghị mgbe ndị Rom chịrị obodo a. Ha nyedịrị ndị bi na ya ikike ịchị onwe ha na ime iwu nke ha. Ndị Rom anaghịkwa ana ha ụtụ isi. N’agbanyeghị na Atens anaghịzi ewu ewu, ọtụtụ mahadum ebe ụmụ ndị ukwu na-aga akwụkwọ ka dị na ya.

      5 Ndị Pọl ga-agwa okwu n’ahịa ahụ bụ ekwe ekwe. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik. Òtù abụọ a na-amarịta aka, ihe ha kweere dịkwa iche iche.b Ndị òtù Epikurọs kweere na ihe niile dị ndụ nọkatara dịrị. E nwere ike ikwu na otú ha si ele ndụ anya bụ: “Ịtụ egwu Chineke abaghị uru. Ihe anaghị afụ ndị nwụrụ anwụ ụfụ. Ihe ọma ga-eruli mmadụ aka. Mmadụ ga-edili ihe ọjọọ.” Ndị òtù Stoik kweere na mmadụ kwesịrị ịna-eche echiche nke ọma ma na-eme ihe uche ya gwara ya. Ha ekweghịkwa na e nwere onye bụ́ Chineke. Ndị òtù Epikurọs na ndị òtù Stoik ekweghị na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ otú ndị na-eso ụzọ Kraịst kweere. N’eziokwu, ihe òtù abụọ a na-akụzi dị nnọọ iche n’eziokwu magburu onwe ya ezigbo Ndị Kraịst kweere, nke Pọl nọ na-ekwusa.

      6, 7. Gịnị ka ụfọdụ ndị Grik gụrụ oké akwụkwọ mere mgbe ha nụrụ ihe Pọl na-akụzi, oleekwa otú ụfọdụ ndị si eme ụdị ihe ahụ taa?

      6 Gịnị ka ndị Grik ahụ gụrụ oké akwụkwọ mere mgbe ha nụrụ ihe Pọl na-akụzi? Ụfọdụ kwuru na Pọl bụ “onye ekwurekwu.” (Ọrụ 17:18) Otu ọkà mmụta kwuru banyere okwu Grik a sụgharịrị “onye ekwurekwu,” sị: “Ọ bụ ihe a ka a na-akpọ nwa nnụnụ na-agagharị na-atụrụ ọka. O mechara bụrụ ihe a na-akpọ ndị na-atụtụ iberibe nri na ihe dị iche iche a tụfuru atụfu n’ahịa. O mechakwara bụrụ ihe a na-akpọ onye ọ na-abụ ya nụ ihe, ya eburu ya gawa, karịchaa, onye na-ekwu ihe na-edoghị ya anya.” Ihe ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ na-ekwu bụ na Pọl bụ onye iberiibe na-ekwu chọọ chọọ chọọ. Ma, anyị ga-ahụ na ọnụ ahụ a kọrọ Pọl emeghị ka obi daa ya mbà.

      7 Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. A na-akọkarị anyị bụ́ Ndịàmà Jehova ọnụ n’ihi na ihe anyị kweere si na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị gụrụ oké akwụkwọ na-akụzi na ozizi evolushọn bụ eziokwu nakwa na onye ọ bụla ma ihe kwesịrị ikweta na ya. Ihe ọ pụtara bụ na ha na-ekwu na ndị na-ekweghị n’ozizi a amaghị ihe. Ha na-eme ka ndị mmadụ chee na anyị bụ ‘ndị ekwurekwu’ mgbe anyị na-agwa ha ihe Baịbụl kwuru ma na-egosi ha na e nwere onye kere ihe niile. Ma, ihe a anaghị eme ka obi daa anyị mbà. Kama, anyị na-eji obi ike eme ka ndị mmadụ mata na anyị kweere na ọ bụ Jehova Chineke, Onye ma ihe, kere ihe niile dị ndụ n’ụwa.​—Mkpu. 4:11.

      8. (a) Gịnị ka ụfọdụ ndị Pọl ziri ozi ọma mere? (b) Mgbe e kwuru na a kpụgara Pọl n’Ariopagọs, gịnị ka o nwere ike ịpụta? (Gụọ ihe e dere n’ala ala peeji nke 142.)

      8 Ndị ọzọ nụrụ ihe Pọl kụziri n’ahịa emeghị ka ndị ahụ gụrụ oké akwụkwọ. Ha kwuru, sị: “Ọ dị ka ọ̀ na-ekwusa gbasara chi ndị mba ọzọ.” (Ọrụ 17:18) Ọ̀ bụ eziokwu na e nwere chi ọzọ Pọl na-agwa ndị Atens banyere ya? Nsogbu dịkwa ma ọ bụrụ ihe ọ na-eme n’ihi na ọ bụ ụdị ihe a mere e ji ma Sọkretiz ikpe ọnwụ ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ. O jughị anyị anya na a kpụgaziri Pọl n’Ariopagọs ma sị ya kọwaa ihe ndị ọ nọ na-akụzi nke ndị Atens na-anụtụbeghị.c Olee otú Pọl ga-esi kọwaara ndị ahụ na-amaghị Akwụkwọ Nsọ ihe ọ na-ekwu?

      NDỊ ÒTÙ EPIKURỌS NA NDỊ ÒTÙ STOIK

      Ihe ndị òtù Epikurọs na-akụzi na ihe ndị òtù Stoik na-akụzi abụghị otu. Ndị nọ n’òtù abụọ a ekweghị ná mbilite n’ọnwụ.

      Ndị òtù Epikurọs kweere na e nwere ọtụtụ chi, ma ha chere na chi ndị ahụ enweghị mmasị n’ebe ndị mmadụ nọ, nakwa na ha agaghị emere ndị mmadụ ihe ọma ma ọ bụ taa ha ahụhụ. N’ihi ya, ịrịọ ha arịrịọ n’ekpere ma ọ bụ ịchụrụ ha àjà abaghị uru. Ndị òtù Epikurọs kweere na ikpori ndụ bụ ihe kacha mma mmadụ kwesịrị ịna-eme. Ha na-eche echiche ma na-akpa àgwà otú ha chọrọ. Ma, ha kweere na ndị mmadụ ekwesịghị ịna-emefe ihe ókè ka ha ghara ịkpatara onwe ha nsogbu. Ha kwekwaara na naanị ihe mere mmadụ ga-eji na-amụ ihe bụ ka ọ mata nke bụ́ eziokwu ka ọ ghara ịna-atụ ụjọ chi dị iche iche, ọnwụ, na nkwenkwe ụgha.

      Ma, ndị òtù Stoik kweere na chi abụghị onye dị adị nwere ọgụgụ isi, kama na ọ bụ ikike nkịtị. Ha kwekwaara na ihe niile dị n’eluigwe na n’ụwa, ma mkpụrụ obi ụmụ mmadụ, si n’ebe chi a nọ. Ụfọdụ ndị òtù Stoik kweere na a ga-emecha bibikọta mkpụrụ obi na eluigwe na ụwa. E nwekwara ndị òtù Stoik kweere na mkpụrụ obi ga-emecha laghachikwuru chi ahụ. Ndị ọkachamara bụ́ ndị òtù Stoik kwuru na mmadụ ga na-enwe obi ụtọ ma ọ na-erubere iwu ndị na-achị ihe ndị dị n’eluigwe na n’ụwa isi.

      “Ndị Atens, Ahụrụ M” (Ọrụ 17:22, 23)

      9-11. (a) Olee otú Pọl si jiri ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere zie ha ozi ọma? (b) Olee otú anyị ga-esi na-eme ka Pọl mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

      9 Cheta na obi adịghị Pọl mma n’ihi arụsị niile ọ hụrụ n’obodo ahụ. Ma kama iji iwe katọọ arụsị ha na-efe, o jidere onwe ya. Pọl ji akọ gbalịa ikwu ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya. Ọ sịrị ha: “Ndị Atens, ahụrụ m na, n’ihe niile, o yiri ka ùnu na-ekpere chi dị iche iche karịa ndị ọzọ.” (Ọrụ 17:22) Ihe Pọl na-ekwu bụ, ‘Ahụrụ m na unu ejighị okpukpe egwu egwu.’ Pọl jara ha mma maka na ha ji okpukpe kpọrọ ihe. Ihe a o mere gosiri na ọ ma ihe. Ọ ghọtara na ụfọdụ ndị a kụziiri ozizi ụgha abụghị ndị ọjọọ, ha ka chọkwara ịmata eziokwu. A sị ka e kwuwe, Pọl ma na e nwere mgbe yanwa ‘na-amaghị ihe nakwa na o mere ihe n’ihi na ọ tụkwasịghị Chineke obi.’​—1 Tim. 1:13.

      10 Pọl ji ihe ya na ndị Atens kweere otu ihe na ya gwa ha okwu. O kwuru na ya hụrụ ihe gosiri na ha ejighị okpukpe egwu egwu, ya bụ, otu ebe ịchụàjà ihe e dere n’elu ya bụ: “Nke A Bụ nke Chi A Na-amaghị Ama.” Otu akwụkwọ kwuru na “ndị Grik na ndị ọzọ na-arụrụ ‘chi a na-amaghị ama’ ebe ịchụàjà, a dịghị ama ama ya abụrụ na e nwere chi ha na-amaghị, nke nwere ike iwe iwe maka na ha anaghị efe ya.” Ebe ịchụàjà ahụ ndị Atens rụụrụ chi ahụ gosiri na ha kwetara na e nwere Chi ha na-amaghị. Pọl ji ebe ịchụàjà ahụ ha rụrụ malite izi ha ozi ọma. O kwuru, sị: “Ọ bụ chi unu na-amaghị, nke unu na-efe, ka m na-ekwusara unu.” (Ọrụ 17:23) Pọl ji akọ gwa ha okwu, ma ihe o kwuru gbara ọkpụrụkpụ. Ọ bụghị chi ọhụrụ ka ọ na-ekwusara ha, dị ka ụfọdụ kwuru. Kama, ọ na-akọrọ ha banyere Chi ha na-amaghị, ya bụ, ezi Chineke.

      11 Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Pọl mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma? Ọ bụrụ na anya na-eru anyị ala, anyị nwere ike ịhụ ihe gosiri na mmadụ ejighị okpukpe ya egwu egwu. Anyị nwere ike ịhụ na o yi ihe ndị okpukpe na-eyi ma ọ bụkwanụ kowe ya n’ụlọ ma ọ bụ n’èzí. Anyị nwere ike ịsị ya: ‘Achọpụtara m na i jighị okpukpe gị egwu egwu. Ọ bụ ndị dị ka gị ka m na-achọ ka mụ na ha kwuo okwu.’ Ọ bụrụ na anyị ejiri akọ kwuo gbasara otu ihe o kweere nke anyịnwa kwekwaara, ọ ga-eme ka anyị gbakwasị ụkwụ n’ihe ahụ zie ya ozi ọma. Cheta na anyị ekwesịghị ịma ndị mmadụ ikpe n’ihi ihe ha kweere. Ọtụtụ ụmụnna anyị nwekwara mgbe ha ji obi ha niile kwere ozizi ụgha a kụziiri ha.

      Ebe otu nwata nwoke na-agwa onye nkụzi ya na ụmụ akwụkwọ ibe ya okwu na klas mgbe ha na-amụ banyere seyansị.

      Gbalịa jiri ihe gị na ndị mmadụ kweere otu ihe na ya zie ha ozi ọma

      Chineke “Nọ Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Nso” (Ọrụ 17:24-28)

      12. Olee ihe Pọl gbanwere ka o nwee ike zie ndị ọ na-agwa okwu ozi ọma?

      12 Pọl ejirila ihe ya na ndị ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya malite okwu ya. Ma, ọ̀ ga-eji ya ziri ha ozi ọma na-aga? Ebe ọ ma na ọ bụ ndị ọkachamara Grik kụziiri ndị ọ na-agwa okwu ihe nakwa na ha amaghị Akwụkwọ Nsọ, ọ gbanwere ihe, si n’ụzọ ndị ọzọ zie ha ihe. Ihe mbụ o mere bụ ịkụzi ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ n’ekwughị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ihe nke abụọ abụrụ ime ka ndị ọ na-agwa okwu ghọta na ya na ha nọ n’otu ụgbọ. Dị ka ihe atụ, e nwere oge ndị o kwuru “anyị” mgbe ọ na-ekwu okwu. Ihe nke atọ o mere bụ na o kwuru ihe dị n’akwụkwọ ndị Grik iji gosi ha na e kwuru ụfọdụ ihe ọ na-agwa ha n’akwụkwọ ha. Ka anyị lebazie anya n’okwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ Pọl kwuru. Olee eziokwu ndị o mere ka a mata banyere Chi ahụ ndị Atens na-amaghị?

      13. Gịnị ka Pọl kwuru na ọ bụ otú eluigwe na ụwa si malite, gịnịkwa ka ihe o kwuru pụtara?

      13 Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa. Pọl kwuru, sị: “Chineke, onye kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, anaghị ebi n’ụlọ nsọ e ji aka rụọ n’ihi na ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa.”d (Ọrụ 17:24) Eluigwe na ụwa anọkataghị dịrị. Ọ bụ ezi Chineke kere ihe niile. (Ọma 146:6) Ọkaakaa Onyenwe eluigwe na ụwa adịghị ka Atena ma ọ bụ chi ndị ọzọ a na-asọpụrụ n’ihi ụdị ụlọ a rụụrụ ha, otú e si rụọ ihu arụsị ha, nakwa ebe a na-achụrụ ha àjà. Ụlọ nsọ mmadụ rụrụ enweghị ike ịba Chineke. (1 Eze 8:27) Ihe Pọl na-ekwu doro anya: Chineke karịrị arụsị ọ bụla mmadụ mere bụ́ ndị a na-edowe n’ụlọ ndị mmadụ rụụrụ ha.​—Aịza. 40:18-26.

      14. Olee otú Pọl si gosi na ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya?

      14 Ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya. Ndị na-ekpere arụsị na-eyiwekarị arụsị ha uwe ndị dị oké ọnụ, na-enye ha onyinye ndị dị oké ọnụ, ma ọ bụkwanụ na-ewetara ha nri na mmanya, ka à ga-asị na ihe ndị ahụ dị arụsị ha mkpa. Ma, o nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị ọkachamara Grik Pọl gwara okwu kweere na ọ bụghị mmadụ kwesịrị igboro chi ya mkpa ya. Ya bụrụ otú ahụ, ọ ga-abụ na ha kwetara ihe Pọl kwuru nke bụ́ na Chineke ‘anaghị atụ anya ka ụmụ mmadụ nyere ya aka dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya.’ N’eziokwu, e nweghị ihe a na-ahụ anya ụmụ mmadụ nwere ike inye Onye kere ha iji gbooro ya mkpa. Kama, ọ bụ yanwa na-enye ụmụ mmadụ ihe ndị dị ha mkpa, ya bụ, “ndụ na ume na ihe niile,” ma anyanwụ, mmiri ozuzo, ma ala nke na-emepụta ihe. (Ọrụ 17:25; Jen. 2:7) N’ihi ya, ọ bụghị ụmụ mmadụ na-egboro Chineke mkpa ya, kama ọ bụ yanwa na-enye ụmụ mmadụ ihe.

      15. Olee otú Pọl si mee ka ndị Atens ghọta na ha ekwesịghị iche na ha ka ndị na-abụghị ndị Grik mma, oleekwa ezigbo ihe anyị na-amụta n’ihe o mere?

      15 Ọ bụ Chineke kere mmadụ. Ndị Atens chere na ha ka ndị na-abụghị ndị Grik mma. Ma Baịbụl gwara anyị na agbụrụ anyị ma ọ bụ mba anyị ekwesịghị ịna-ebu anyị isi. (Diut. 10:17) Pọl ji akọ mee ka ihe a Baịbụl kwuru doo anya. Mgbe o kwuru na “Chineke sikwa n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị,” ọ ga-abụ na ihe a o kwuru mere ka ndị ọ na-agwa okwu chee echiche. (Ọrụ 17:26) Pọl na-akọrọ ha ihe e kwuru na Jenesis banyere Adam, onye bụ́ nna mmadụ niile. (Jen. 1:26-28) Ebe ọ bụ na mmadụ niile si n’otu nna, e nweghị agbụrụ ma ọ bụ mba ka ibe ya. O doro anya na ndị Pọl na-agwa okwu ghọtara ihe ọ na-ekwu. E nwere ezigbo ihe anyị na-amụta n’ihe Pọl mere. Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị iji akọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma gosi na anyị na-echebara ha echiche, anyị ekwesịghị ịgwa ha naanị ihe ha chọrọ ịnụ maka na anyị chọrọ ka ha gee anyị ntị.

      16. Gịnị ka Onye kere ụmụ mmadụ bu n’obi kee ha?

      16 Chineke chọrọ ka ya na ụmụ mmadụ dịrị ná mma. Ọ bụrụgodị na ndị ọkachamara ndị so ná ndị Pọl na-agwa okwu arụrịtaala ụka ọtụtụ afọ banyere ihe mere mmadụ ji dịrị ndụ, ha enweghị ike ịkọwa ya nke ọma. Ma, Pọl mere ka ihe Onye kere ụmụ mmadụ bu n’obi kee ha doo anya, ya bụ, na ọ “chọrọ ka ndị mmadụ chọọ ya. Ọ bụrụkwa na ha agbaa mbọ chọọ ya, ha ga-achọta ya. N’eziokwu, ọ nọ onye ọ bụla n’ime anyị nso.” (Ọrụ 17:27) Chi ahụ ndị Atens na-amaghị abụghị Chi a na-enweghị ike ịmata amata. N’eziokwu, ọ nọghị ndị ji obi ha niile na-achọ ya ma na-agbalị ịmụta banyere ya n’ebe dị anya. (Ọma 145:18) Echefula na mgbe Pọl sịrị “anyị,” ọ gụnyere onwe ya ná ndị kwesịrị ‘ịchọ’ Chineke na ndị ‘ga-agba mbọ chọọ’ ya.

      17, 18. Gịnị mere o ji kwesị ịna-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma, oleekwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Pọl si mee ka ihe ọ na-ekwu ruo ndị ọ na-agwa ya n’obi?

      17 O kwesịrị ịgụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma. Pọl kwuru banyere Chineke, sị: “Ọ bụ ya nyere anyị ndụ, meekwa ka anyị na-eje ije, na-adịkwa ndụ.” Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sịrị na Pọl na-ekwu ihe Epimenides kwuru. Epimenides bụ onye Krit na-ede uri. Ọ dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ isii (2,600) gara aga, bụrụkwa “onye ọnụ na-eru n’okwu n’omenala ndị Atens.” Pọl kwuru ihe ọzọ mere o kwesịrị iji na-agụ ụmụ mmadụ agụụ ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ sịrị: “Ụfọdụ n’ime unu ndị na-ede uri kwuru, sị: ‘N’ihi na anyị niile bụ ụmụ ya.’” (Ọrụ 17:28) Ụmụ mmadụ kwesịrị ịchọ ka ha bịa Chineke nso n’ihi na ọ bụ ya kere nwoke mbụ mmadụ niile si n’aka ya. Pọl chọrọ ka ndị ọ na-agwa okwu gee ya ntị, ọ bụ ya mere o ji kwuo ihe ndị Grik dere. Ọ ga-abụkwa na ndị ọ na-agwa okwu na-akwanyere ndị dere ihe ndị ahụ ùgwù.e Dị ka Pọl mere, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ikwutụ ihe e dere n’akwụkwọ ụfọdụ a na-akwanyere ùgwù, dị ka akwụkwọ na-akọ ihe mere eme, akwụkwọ ndị ọkà mmụta, ma ọ bụ akwụkwọ ndị ọzọ e ji eme nchọnchọ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị ekwuo ihe akwụkwọ a ma ama kwuru, o nwere ike ime ka onye na-abụghị Onyeàmà Jehova ghọta otú ememme ndị okpukpe ụgha ma ọ bụ nkụzi ha si malite.

      18 N’ihe niile Pọl kwurula, o mere ka a mata eziokwu gbara ọkpụrụkpụ banyere Chineke, jiri nkà kwuo ha otú ga-eme ka ndị ọ na-agwa okwu gee ya ntị. Gịnị ka onyeozi a chọrọ ka ndị Atens ọ na-agwa okwu jiri ezigbo ihe a ọ na-agwa ha mee? N’egbughị oge, ọ bụ ihe ọ malitere ikwu.

      “Ọ Na-agwa Mmadụ Niile n’Ebe Niile Ka Ha Chegharịa” (Ọrụ 17:29-31)

      19, 20. (a) Olee otú Pọl si jiri akọ mee ka a ghọta na ikpere arụsị mmadụ mere bụ izuzu nzuzu? (b) Gịnị ka ndị Pọl gwara okwu kwesịrị ime?

      19 Pọl adịla njikere ịgwa ndị na-ege ya ntị ihe ha kwesịrị ime. Ọ gbakwasịrị ụkwụ n’ihe ahụ dị n’akwụkwọ ndị Grik dere kwuo, sị: “Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ Chineke, anyị ekwesịghị iche na Chineke yiri ọlaedo ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ nkume. Anyị ekwesịghịkwa iche na ọ dị ka ihe ụmụ mmadụ chepụtara kpụọ.” (Ọrụ 17:29) N’eziokwu, ọ bụrụ na ụmụ mmadụ bụ ọrụ aka Chineke, oleezi otú Chineke ga-esi yie arụsị, bụ́ ọrụ aka mmadụ? Otú Pọl si jiri akọ kwuo okwu mere ka a ghọta na ife arụsị mmadụ mere bụ izuzu nzuzu. (Ọma 115:4-8; Aịza. 44:9-20) Mgbe Pọl kwuru “anyị ekwesịghị,” ọ ga-abụ na otú ahụ o si gụnye onwe ya mere ka ọ dịrị ndị ọ na-agwa okwu mfe ịnabata ihe ọ na-ekwu.

      20 Pọl mere ka o doo ha anya na ha kwesịrị ime ihe. Ọ sịrị: “Chineke elefurula oge ahụ ndị mmadụ na-amaghị ihe ha na-eme anya [ya bụ, oge ahụ a na-eche na ndị na-ekpere arụsị na-eme ihe dị Chineke mma]. Ma ugbu a, ọ na-agwa mmadụ niile n’ebe niile ka ha chegharịa.” (Ọrụ 17:30) Ọ ga-abụ na o juru ụfọdụ ndị Pọl na-agwa okwu anya mgbe ọ gwara ha ka ha chegharịa. Ma okwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ ọ gwara ha mere ka o doo anya na ọ bụ Chineke nyere ha ndụ, nakwa na ha ga-aza ya ajụjụ maka otú ha si bie ndụ. Ha kwesịrị ịchọ Chineke, mụta eziokwu banyere ya, biwekwa ndụ otú Chineke chọrọ. Ọ pụtara na ndị Atens ga-aghọta na ikpere arụsị bụ mmehie ma kwụsị ya.

      21, 22. Olee ihe dị ezigbo mkpa Pọl ji mechie okwu ya, oleekwa ihe anyị ga-amụta na ya?

      21 Pọl kwuziri ihe dị ezigbo mkpa ná mmechi okwu ya. Ọ sịrị: ‘Chineke ewepụtala otu ụbọchị ọ ga-esi n’aka otu nwoke ọ họpụtara kpee mmadụ niile bi n’ụwa ikpe n’eleghị ha anya n’ihu. O meekwala ka obi sie mmadụ niile ike na ọ ga-eme ya, n’ihi na ọ kpọlitere nwoke ahụ n’ọnwụ.’ (Ọrụ 17:31) Ebe ọ bụ na ha amatala na Ụbọchị Ikpe na-abịa, ha kwesịrị ịchọ ezi Chineke ma chọta ya. Pọl akpọghị onye ga-ekpe ikpe ahụ aha. Kama, ihe o kwuru banyere ya juru ndị ọ na-agwa okwu anya. Ọ gwara ha na onye ahụ ebiela ndụ ka mmadụ, nwụọ, Chineke akpọlitekwa ya n’ọnwụ.

      22 E nwere ọtụtụ ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ na-eru n’obi Pọl kwuru ná mmechi okwu ya. Anyị ma na onye Chineke họpụtara ka o kpee ikpe ahụ bụ Jizọs Kraịst ọ kpọlitere n’ọnwụ. (Jọn 5:22) Anyị makwa na Ụbọchị Ikpe ahụ ga-abụ otu puku afọ, nakwa na o ji ọsọ na-abịa. (Mkpu. 20:4, 6) Anyị anaghị atụ Ụbọchị Ikpe ahụ ụjọ, n’ihi na anyị ma na ọ ga-ewetara ndị e kpebiri na ha bụ ndị ezi omume ngọzi ndị na-enweghị atụ. Ihe mere obi ji sie anyị ike na Chineke ga-emezu ihe niile magburu onwe ha anyị na-atụ anya ha bụ ọrụ ebube kachanụ ọ rụrụ, ya bụ, mkpọlite ọ kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ.

      ‘Ụfọdụ Ghọrọ Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs’ (Ọrụ 17:32-34)

      23. Olee ihe dị iche iche ndị mmadụ mere mgbe Pọl gwachara ha okwu?

      23 Mgbe Pọl kwuchara okwu, a bịara nwee ndị kwe na ndị ekweghị. “Ụfọdụ malitere ịkwa ya emo” mgbe ha nụrụ banyere ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ. E nwekwara ndị na-emeghị ka a mata ebe ha kwụ. Ha sịrị: “Anyị ga-achọ ịnụ gbasara ihe a n’oge ọzọ.” (Ọrụ 17:32) Ma, mmadụ ole na ole nabatara ihe Pọl kwuru. Baịbụl kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị sooro ya, ghọọkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ụfọdụ n’ime ha bụ Dayọnisiọs, onye bụ́ ọkàikpe n’ụlọikpe Ariopagọs, na otu nwaanyị aha ya bụ Damaris, nakwa ndị ọzọ.” (Ọrụ 17:34) Ndị mmadụ na-emekwa ụdị ihe a ma anyị zie ha ozi ọma. Ụfọdụ ndị nwere ike ịkparị anyị. E nwekwara ndị na-agaghị egosicha ebe ha kwụ. Ma, obi na-atọgbu anyị atọgbu ma ụfọdụ ndị nabata ozi Alaeze Chineke ma ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs.

      24. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe Pọl kwuru mgbe ọ nọ n’Ariopagọs?

      24 Ọ bụrụ na anyị echebara ihe Pọl kwuru echiche, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe gbasara otú anyị ga-esi na-akọwa ihe anyị na-ekwu ka o ruo ndị mmadụ n’obi ma mee ka ha kweta na ihe anyị na-akụziri ha bụ eziokwu. Anyị ga-amụtakwa na anyị kwesịrị inwe ndidi ma dịrị akọ mgbe anyị na-agwa ndị a kụziiri ozizi ụgha okwu. Ihe ọzọ dị mkpa anyị ga-amụta bụ na anyị ekwesịghị ịgwa ndị mmadụ naanị ihe ha chọrọ ịnụ maka na anyị chọrọ ka ha gee anyị ntị. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Pọl onyeozi, anyị ga na-akụzikwu ihe nke ọma mgbe anyị na-ezi ozi ọma. Ihe ọzọ bụ na ndị okenye ga na-akụzikwu ihe nke ọma n’ọgbakọ. Anyị ga-esi otú ahụ kwadebe nke ọma inyere ndị ọzọ aka ‘ịchọ Chineke ma chọta ya.’​—Ọrụ 17:27.

      a Gụọ igbe bụ́ “Atens Bụ Obodo E Ji Omenala Ndị Oge Ochie Mara.”

      b Gụọ igbe bụ́ “Ndị Òtù Epikurọs na Ndị Òtù Stoik.”

      c Ariopagọs dị n’otu ugwu dị n’Akrọpọlis, ọ bụkwa na ya ka ndị ọchịchị Atens na-enwe nzukọ ha. E kwuo “Ariopagọs,” o nwere ike ịbụ ndị ọchịchị obodo ahụ ma ọ bụ ugwu ahụ ka a na-ekwu. N’ihi ya, ndị ọkà mmụta enweghị otu olu gbasara ebe a kpọgara Pọl. Ụfọdụ na-asị na a kpọgara ya n’ugwu ahụ ma ọ bụ n’ebe dị nso n’ugwu ahụ, ndị ọzọ ana-asị na a kpọgara ya n’ebe ọzọ ndị ọchịchị obodo ahụ zukọrọ, dị ka n’ahịa.

      d Okwu Grik a sụgharịrị “ụwa” bụ koʹsmos. Ọ bụ ihe ndị Grik na-akpọ eluigwe na ala. Ọ ga-abụkwa ya ka Pọl na-ekwu ebe a ebe ọ bụ na ọ na-agbalị iji ihe ya na ndị Grik ọ na-agwa okwu kweere otu ihe na ya gwa ha okwu.

      e Pọl kwuru ihe e dere n’otu uri a na-akpọ Phaenomena. Ọ bụ onye na-ede uri so ná ndị òtù Stoik aha ya bụ Aratus dere ya. E kwukwara ihe yiri ihe ahụ Pọl kwuru n’akwụkwọ ndị ọzọ ndị Grik dere, dị ka akwụkwọ a kpọrọ Hymn to Zeus (Abụ A Na-abụrụ Zus). Ọ bụ Klientis, onye so ná ndị òtù Stoik, dere ya.

  • “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 19

      “Na-ekwusa Ozi Ọma, Adala Mbà”

      Pọl rụrụ ọrụ o ji na-egboro onwe ya mkpa ya, ma, o lekwasịrị anya n’ozi ya

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 18:1-22

      1-3. Gịnị mere Pọl onyeozi ji gaa Kọrịnt, oleekwa ihe ndị nwere ike ịna-echegbu ya?

      NÁ NGWỤCHA afọ 50 O.N.K., Pọl onyeozi nọ na Kọrịnt. Kọrịnt bụ obodo bara ọgaranya e ji azụmahịa mara. Ọtụtụ ndị Grik, ndị Rom, na ndị Juu bi na ya.a Pọl abịaghị ebe a ịzụ ahịa ma ọ bụ ịchọ ọrụ. Ọ bịara ime ihe dị mkpa karịa ihe ndị ahụ, ya bụ, ịgba àmà banyere Alaeze Chineke. Ma, Pọl chọrọ ebe ọ ga-ebi, ọ chọghịkwa ịbụrụ ndị ọzọ ibu arọ. Ọ chọghị ime ka onye ọ bụla chee na ya na-ekwusa okwu Chineke ka ndị mmadụ na-enye ya ego. Gịnịzi ka ọ ga-eme?

      2 Pọl nwere aka ọrụ. Ọ na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ọrụ a adịghị mfe, ma Pọl dị njikere ịrụ ya iji na-egboro onwe ya mkpa ya. Ma, ọrụ a ọ̀ ga-aga aga n’obodo a na-ekwo ekwo? Ọ̀ ga-enweta ebe dị mma ọ ga-ebi? N’agbanyeghị ihe ndị a na-echegbu Pọl, o chefughị ọrụ bụ́ isi o nwere ịrụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma.

      3 Pọl mechara nọtụ na Kọrịnt, ozi o jere n’obodo a rụpụtakwara ọtụtụ ihe ọma. Olee ihe anyị ga-amụta n’ọrụ Pọl rụrụ na Kọrịnt nke ga-enyere anyị aka ịgba àmà nke ọma banyere Alaeze Chineke n’ókèala anyị?

      KỌRỊNT BỤ OBODO NWERE ỌDỤ ỤGBỌ MMIRI ABỤỌ

      Obodo Kọrịnt oge ochie dị n’ala dị warara nke jikọrọ ebe ndịda Gris na mpaghara Gris nke ọzọ. Ebe na-asachaghị mbara n’ala ahụ erughị kilomita isii n’obosara. N’ihi ya, Kọrịnt nwere ọdụ ụgbọ mmiri abụọ. Ọdụ ụgbọ mmiri nke a na-akpọ Lekeọm dị n’ebe ọdịda anyanwụ Kọrịnt. Ụgbọ mmiri ndị si Ịtali, Sisili, na Spen na-abata na ya ma na-apụ. Ọdụ ụgbọ mmiri nke dị n’ebe ọwụwa anyanwụ, ya bụ, na Senkrea, bụ maka ụgbọ mmiri ndị na-esi ná mpaghara Oké Osimiri Ejiyan, Eshia Maịnọ, Siria, na Ijipt na-abata ma na-apụ.

      Ebe ọ bụ na a na-enwekarị oké ifufe n’ebe ndịda Gris, ndị na-akwọ ụgbọ mmiri anaghị achọ ịkwọrọ ụgbọ gafere ebe ahụ ka ụgbọ ha ghara ikpu. Kama, ọ na-akara ha mma ịkwụsị ụgbọ mmiri ha n’otu n’ime ọdụ ụgbọ mmiri abụọ ahụ dị na Kọrịnt. Ha na-esizi n’okporo ụzọ buga ibu ha n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ ma buba ha n’ụgbọ mmiri ọzọ. Ọ bụrụ na ụgbọ mmiri adịghị arọ, e nwedịrị ike isi n’ihe pụrụ iche a rụrụ n’ala ahụ dị warara dọkpụrụ ya gafee n’ọdụ ụgbọ mmiri nke ọzọ. Ebe ọ bụ na Kọrịnt dị n’etiti, ọtụtụ ndị ahịa na-abata na ya. Ha na-esi n’okporo ụzọ, na-esikwa n’oké osimiri abịa azụ ma na-ere ahịa. Ha na-ebubatakwa ego n’obodo ahụ. Ma, ebe ọ bụ na omume ha rụrụ arụ, ha mekwara ka Kọrịnt bụrụ obodo rụrụ arụ.

      N’oge Pọl onyeozi, Kọrịnt bụ isi obodo Akeya, bụrụkwa ebe ndị Rom si na-achị ógbè Akeya niile. E nwere okpukpe dị iche iche na Kọrịnt. Dị ka ihe atụ, e nwere ụlọ a rụrụ maka ife Eze Ukwu Rom, nweekwa ọtụtụ ụlọ arụsị a rụrụ maka ife chi ndị Grik na chi ndị Ijipt, nweekwa ụlọ nzukọ ndị Juu.​—Ọrụ 18:4.

      N’afọ abụọ ọ bụla, a na-enwe asọmpi n’ebe a na-akpọ Istmia nke dị nso na Kọrịnt. Naanị egwuregwu na-ewu ewu karịa ya bụ Egwuregwu Olimpik. Ọ ga-abụ na Pọl onyeozi nọ na Kọrịnt mgbe e nwere asọmpi ahụ n’afọ 51 O.N.K. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ na-akọwa okwu ndị dị na Baịbụl ji kwuo na “ọ bụghị ihe iju anya na oge mbụ Pọl ji ndị na-eme egwuregwu mee ihe atụ bụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kọrịnt.”​—1 Kọr. 9:24-27.

      “Aka Ọrụ Ha Bụ Ịkpa Ákwà Ụlọikwuu” (Ọrụ 18:1-4)

      4, 5. (a) Olee ebe Pọl bi mgbe ọ nọ na Kọrịnt, oleekwa ọrụ ọ rụrụ? (b) Olee otú Pọl si mụta ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu?

      4 Mgbe Pọl rutere Kọrịnt, nọtụ ntakịrị, ọ hụrụ onye Juu aha ya bụ Akwịla, na nwunye ya bụ́ Prisila ma ọ bụ Priska. Ha na-ele ọbịa nke ọma. Di na nwunye a gara biri na Kọrịnt n’ihi na Eze Ukwu bụ́ Klọdiọs “gwara ndị Juu niile ka ha pụọ na Rom.” (Ọrụ 18:1, 2) Akwịla na Prisila kpọbatara Pọl n’ụlọ ha, kwetakwa ka ha na ya rụkọọ ọrụ. Baịbụl kwuru, sị: “Ebe ya na ha nwere otu ụdị aka ọrụ, ọ gara biri n’ụlọ ha. Ya na ha na-arụkọkwa ọrụ, n’ihi na aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu.” (Ọrụ 18:3) Ọ bụ n’ụlọ di na nwunye a dị obiọma ka Pọl bi mgbe ọ na-eje ozi na Kọrịnt. O nwere ike ịbụ n’oge ahụ Pọl bi n’ụlọ Akwịla na Prisila ka o dere ụfọdụ akwụkwọ ozi ndị mechara soro n’akwụkwọ ndị dị na Baịbụl.b

      5 Olee otú Pọl, onye ‘Gameliel kụziiri ihe,’ sizi bụrụ onye na-akpa ákwà ụlọikwuu? (Ọrụ 22:3) N’oge ochie, ndị Juu echeghị na ịkụziri ụmụ ha aka ọrụ bụ iwetu ezinụlọ ha ala, n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ụmụ ha gụkwara ezigbo akwụkwọ. O nwere ike ịbụ na Pọl mụrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu mgbe ọ ka na-eto eto ebe ọ bụ onye Tasọs nke dị na Silishia. Ihe e ji mara obodo Tasọs bụ ákwà a na-akpọ silishiọm. A na-eji ákwà a akpa ákwà ụlọikwuu. Gịnị na gịnị so n’ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu? O nwere ike ịbụ ịkpa ákwà e ji arụ ụlọikwuu ma ọ bụ ịcha nke a kparala akpa nakwa ịdụkọta ha ọnụ. Nke ọ bụla ọ bụ, ọrụ a adịghị mfe n’ihi na ákwà ya na-esi ike.

      6, 7. (a) Olee otú Pọl si were ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, oleekwa ihe gosiri na Akwịla na Prisila wekwaara ya otú ahụ? (b) Olee otú Ndị Kraịst nke oge a si eme ka Pọl, Akwịla, na Prisila?

      6 Pọl ewereghị ịkpa ákwà ụlọikwuu ka ọrụ kacha mkpa ọ ga na-arụ. Ọ rụrụ ọrụ a naanị iji na-enyere onwe ya aka n’ozi ya, ka o nwee ike ikwusa ozi ọma ‘n’anaghị ụmụnna ya ihe ọ bụla.’ (2 Kọr. 11:7) Oleekwanụ otú Akwịla na Prisila si lee aka ọrụ ha anya? Ebe ha bụ Ndị Kraịst, o doro anya na ha lere ya anya otú ahụ Pọl si lee ya. N’eziokwu, mgbe Pọl hapụrụ Kọrịnt n’afọ 52 O.N.K., Akwịla na Prisila hapụrụ aka ọrụ ha ma soro ya gaa Efesọs. N’ebe ahụ, e ji ụlọ ha mere ebe ọgbakọ na-anọ amụ ihe. (1 Kọr. 16:19) Ha mechara laghachi Rom, mechaakwa lọta Efesọs. Di na nwunye a na-anụ ọkụ n’obi ji ihe ndị gbasara Alaeze Chineke kpọrọ ihe, jirikwa obi ha niile jeere ndị ọzọ ozi. Ọ bụ ya mere “ọgbakọ niile dị ná mba dị iche iche” ji na-ekele ha.​—Rom 16:3-5; 2 Tim. 4:19.

      7 Ndị Kraịst nke oge anyị a na-eme ka Pọl, Akwịla, na Prisila. Ụmụnna ndị na-anụ ọkụ n’obi taa na-arụsi ọrụ ike ‘ka ha ghara ịbụrụ onye ọ bụla ibu arọ.’ (1 Tesa. 2:9) E kwesịrị ịja ọtụtụ ndị na-ekwusa ozi ọma oge niile mma n’ihi na ha na-arụ ọrụ ụbọchị ụfọdụ n’izu ma ọ bụ ọrụ na-eme ná ndapụta iji na-enyere onwe ha aka ịrụ ọrụ kacha mkpa ha na-arụ, ya bụ, ikwusa ozi ọma. Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-emesapụ aka ka Akwịla na Prisila. Ha na-anabata ndị nlekọta sekit n’ụlọ ha. Ndị si otú a ‘ele ọbịa’ ma na ọbịa ha na-ele na-agba ha ume, na-emekwa ka okwukwe ha sie ike.​—Rom 12:13.

      AKWỤKWỌ OZI NDỊ NA-AGBA UME PỌL SI N’IKE MMỤỌ NSỌ DEE

      N’ime otu afọ na ọnwa isii Pọl onyeozi nọrọ na Kọrịnt, ya bụ, malite n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K. ruo n’afọ 52 O.N.K., o dere akwụkwọ ozi abụọ, ma ọ dịkarịa ala, ndị mechara soro n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst. Akwụkwọ ozi ndị ahụ bụ Ndị Tesalonaịka nke Mbụ na nke Abụọ. O dere akwụkwọ ozi o degaara ndị Galeshia n’otu oge ahụ ma ọ bụ mgbe obere oge gafetụrụ.

      Ndị Tesalonaịka nke Mbụ bụ akwụkwọ ozi mbụ Pọl si n’ike mmụọ nsọ dee. Pọl gara Tesalonaịka n’ihe dị ka afọ 50 O.N.K. na njem nke abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma. Obere oge e nwechara ọgbakọ n’ebe ahụ, a malitere ịkpagbu ụmụnna nọ n’ọgbakọ ahụ. Mkpagbu a mere ka Pọl na Saịlas hapụ obodo ahụ. (Ọrụ 17:1-10, 13) Ebe ọ bụ na ihe banyere ụmụnna nọ n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ na-emetụ Pọl n’obi, ọ gbalịrị ugboro abụọ ịgaghachi obodo ahụ, ma “Setan nọchiiri [ya] ụzọ.” N’ihi ya, Pọl zigara Timoti ka ọ gaa kasie ụmụnna ahụ obi ma gbaa ha ume. Ọ ga-abụ na Timoti laghachikwuuru Pọl na Kọrịnt ná ngwụcha afọ 50 O.N.K. ma kọọrọ ya akụkọ ọma banyere ọgbakọ Tesalonaịka. Mgbe e mechara, Pọl degaara ha akwụkwọ ozi a.​—1 Tesa. 2:17–3:7.

      Ọ ga-abụ na Pọl dere Ndị Tesalonaịka nke Abụọ ozugbo o dechara nke mbụ. O nwere ike ịbụ na o dere ya n’afọ 51 O.N.K. N’akwụkwọ ozi abụọ ahụ, Timoti na Silvenọs (onye a kpọrọ Saịlas n’Ọrụ Ndịozi) so Pọl zigara ụmụnna ndị Tesalonaịka ozi ekele, ma o nweghị ihe e dere na Baịbụl gosiri na ha atọ bịakọtara ọnụ ọzọ mgbe Pọl hapụchara Kọrịnt. (Ọrụ 18:5, 18; 1 Tesa. 1:1; 2 Tesa. 1:1) Ma, olee ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi nke abụọ a? Ọ ga-abụ na a kọọrọ ya ihe ndị ọzọ banyere ọgbakọ ahụ. O nwere ike ịbụ onye ahụ o si n’aka ya zigara ha akwụkwọ ozi nke mbụ kọọrọ ya ihe ndị ahụ. Ihe a kọọrọ Pọl mere ka ọ jaa ụmụnna ahụ mma n’ihi ịhụnanya ha nwere na otú ha si atachi obi, meekwa ka ọ gbazie ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ, bụ́ ndị nọ na-ekwu na ọnụnọ Onyenwe anyị eruola eruo.​—2 Tesa. 1:3-12; 2:1, 2.

      Akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Galeshia gosiri na o letara ha ọ dịkarịa ala ugboro abụọ tupu ya edegara ha akwụkwọ ozi. N’agbata afọ 47 O.N.K. na afọ 48 O.N.K., Pọl na Banabas gara Antiọk nke dị na Pisidia, Aịkoniọm, Listra, na Dabe. Obodo ndị a dị n’ógbè Galeshia bụ́ ebe ndị Rom na-achị. N’afọ 49 O.N.K., Pọl na Saịlas laghachiri ebe ahụ. (Ọrụ 13:1–14:23; 16:1-6) Ihe mere Pọl ji dee akwụkwọ ozi a bụ na ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị bịara ebe ahụ ozugbo Pọl lawara, nọ na-akụzi na e kwesịrị ibi Ndị Kraịst úgwù, nakwa na ha kwesịrị ịna-edebe Iwu Mosis. O doro anya na Pọl degaara ndị Galeshia akwụkwọ ozi a ozugbo ọ nụrụ gbasara nkụzi ụgha a. O nwere ike ịbụ na ọ nọ na Kọrịnt dee ya. Ma, o nwekwara ike ịbụ na ọ nọ n’Efesọs dee ya mgbe ọ kwụsịtụrụ ebe ahụ n’oge ọ na-alaghachi Antiọk nke Siria ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ọ nọ n’Antiọk dee ya.​—Ọrụ 18:18-23.

      “Ọtụtụ n’Ime Ndị Kọrịnt . . . Kwekwaara” (Ọrụ 18:5-8)

      8, 9. Olee ihe Pọl mere mgbe ndị Juu megidewere ya n’ihi ozi ọma ọ nọ na-ekwusasi ike, oleezi ebe ọ gara na-ezi ozi ọma?

      8 Ihe Pọl mere mgbe Saịlas na Timoti si na Masedonia wetara ya onyinye ndị e nyere ya gosiri na ihe mere o ji na-arụ ọrụ ego bụ ka o jiri ya na-enyere onwe ya aka n’ozi ya. (2 Kọr. 11:9) Ozugbo ahụ, Pọl “malitere iji oge ya niile na-ekwusa okwu Chineke.” Otú e si kwuo ya na Baịbụl ọzọ bụ: “Pọl tinyere oge ya nile ikwu okwu Chineke.” [Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society] (Ọrụ 18:5) Ma, ndị Juu megidewere Pọl n’ihi ozi ọma ọ nọ na-ekwusasiri ha ike. Ebe ọ bụ na ndị Juu ahụ na-emegide Pọl achọghị ịnụ ozi ọma banyere Kraịst nke na-azọpụta ndị mmadụ, ọ gwara ha na ọbara ha adịghị ya n’isi. O fechara uwe ya ma sị ha: “Ka ọbara unu dị unu n’isi. Aka m dị ọcha. Si ugbu a gawa, m ga-ejekwuru ndị mba ọzọ.”​—Ọrụ 18:6; Ezik. 3:18, 19.

      9 Oleezi ebe Pọl ga-aga zie ozi ọma? Otu nwoke aha ya bụ Tishiọs Jọstọs, onye ụlọ ya dị n’akụkụ ụlọ nzukọ ndị Juu, gwara Pọl ka ọ bịa n’ụlọ ya. Ọ ga-abụ na nwoke a bụ onye mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu. N’ihi ya, Pọl kwụsịrị ikwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị Juu nọrọzie n’ụlọ Jọstọs na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 18:7) Pọl bi n’ụlọ Akwịla na Prisila mgbe ọ nọ na Kọrịnt, ma, ọ bụ n’ụlọ Jọstọs ka ọ na-anọkarị ekwusa ozi ọma.

      10. Olee ihe gosiri na Pọl ekpebighị na ọ bụzi naanị ndị mba ọzọ ka ọ ga na-ezi ozi ọma?

      10 Mgbe Pọl kwuru na ya na-agakwuruzi ndị mba ọzọ ọ̀ pụtara na ọ kwụsịchara izi ndị Juu niile na ndị mba ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu ozi ọma, ma ndị nke chọrọ ige ntị? Mbanụ! Dị ka ihe atụ, “Krispọs, onyeisi oche nke ụlọ nzukọ, na ezinụlọ ya niile, kweere n’Onyenwe anyị.” Ọ ga-abụ na e nwere ndị na-anọ n’ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ sooro Krispọs n’ihi na Baịbụl sịrị: “Ọtụtụ n’ime ndị Kọrịnt, ndị nụrụ okwu Chineke, kwekwaara, e mee ha baptizim.” (Ọrụ 18:8) Ụlọ Tishiọs Jọstọs ghọziri ebe ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrịnt na-anọ amụ ihe. Ọ bụrụ na Luk dere ihe ndị ọ kọrọ n’Ọrụ Ndịozi n’usoro ha si mee, otú ọ na-emekarị, ọ pụtara na ndị Juu ahụ ma ọ bụ ndị mba ọzọ ahụ na-ekpe okpukpe ndị Juu chegharịrị mgbe Pọl fechasịrịla uwe ya. Ihe a merenụ gosiri na Pọl na-agbanwe otú o si ezi ozi ọma mgbe o kwesịrị ime otú ahụ.

      11. Olee otú Ndịàmà Jehova si eme ka Pọl mgbe ha na-ezi ndị chọọchị ozi ọma?

      11 N’ọtụtụ mba taa, e nwere ọtụtụ chọọchị ndị dịwarala kemgbe, ha jikwa ndị òtù ha aka ọjọọ. Chọọchị ndị a ezipụla ndị òtù ha n’ebe dị iche iche n’ụwa, ndị a ha zipụrụ akpọbatakwala ọtụtụ ndị na chọọchị ha. Ma, ihe na-aka ndị a sịrị na ha bụ Ndị Kraịst mkpa bụ omenala chọọchị ha, ọ bụghị ime ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụ otu ihe ahụ mere ndị Juu bi na Kọrịnt n’oge ndịozi. Ma anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-eme ka Pọl. Anyị na-eji ịnụ ọkụ n’obi aga ezi ndị dị otú ahụ ozi ọma, na-enyere ha aka ịghọtakwu ihe ha na-agụ n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ bụrụgodị na hanwa ma ọ bụ ndị isi chọọchị ha emegidewe anyị, anyị anaghị ada mbà. N’ime ndị ‘na-anụ ọkụ n’obi ijere Chineke ozi, ma ha amaghị Chineke nke ọma,’ e nwere ike inwe ọtụtụ ndị dị umeala n’obi e kwesịrị ịchọ ma chọta.​—Rom 10:2.

      “E Nwere Ọtụtụ Ndị n’Obodo A Ga-ekwere na M” (Ọrụ 18:9-17)

      12. Olee otú ọhụụ Pọl hụrụ si gbaa ya ume?

      12 Ọ bụrụ na ịnọ na Kọrịnt na-ekwusa ozi ọma emewela Pọl obi abụọ, ọ ga-abụrịrị na ọ kwụsịrị inwe obi abụọ ahụ mgbe Onyenwe anyị Jizọs pụtara n’ihu ya n’ọhụụ ma gwa ya, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà, n’ihi na e nwere ọtụtụ ndị n’obodo a ga-ekwere na m.” (Ọrụ 18:9, 10) N’eziokwu, ọhụụ ahụ gbara ya ume. Onyenwe anyị ji aka ya mee ka obi sie Pọl ike na ọ ga-echebe ya nakwa na o nwere ọtụtụ ndị e kwesịrị izi ozi ọma n’obodo ahụ. Olee ihe Pọl mere mgbe ọ hụchara ọhụụ ahụ? Baịbụl kwuru, sị: Ọ “nọrọ ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii, na-akụziri ndị mmadụ okwu Chineke.”​—Ọrụ 18:11.

      13. Olee ihe ọ ga-abụ na Pọl chetara mgbe ọ na-abịarute ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe, ma olee ihe mere ọ ga-eji tụọ anya na ọkọ agaghị akọ ya?

      13 Mgbe Pọl nọrọla ihe dị ka otu afọ na Kọrịnt, Onyenwe anyị mere ka o dokwuo ya anya na ọ kwụ ya n’azụ. N’oge ahụ, “ndị Juu ji otu obi bịa imesi Pọl ike. Ha kpụụrụ ya gaa ebe a na-anọ ekpe ikpe,” nke a na-akpọ beʹma n’asụsụ Grik. (Ọrụ 18:12) Ụfọdụ ndị kwuru na beʹma bụ ebe a kpụliri elu, nke e ji nkume mabụl na-acha ọcha nakwa anụnụ anụnụ rụọ, jirikwa ọtụtụ ihe a tụrụ atụ́ chọọ ya mma. Ha sịrị na o nwere ike ịbụ na ọ dị nso n’etiti ahịa dị na Kọrịnt. Mbara ala dị n’ihu ya na-aba ìgwè mmadụ buru ibu. Ihe ndị mgbe ochie chọpụtara gosiri na o nwere ike ịbụ na ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe dị ezigbo nso n’ụlọ nzukọ ndị Juu, dịrịkwa nso n’ụlọ Jọstọs. Ka Pọl na-abịarute n’ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe, ọ ga-abụ na o chetara otú e si jiri nkume tụgbuo Stivin, Onye Kraịst mbụ e gburu n’ihi okwukwe ya. Pọl, onye a na-akpọ Sọl mgbe ahụ, kwadoro “ogbugbu e gburu Stivin.” (Ọrụ 8:1) Ụdị ihe ahụ ọ̀ ga-eme Pọl ugbu a? Mba, n’ihi na e kwela ya nkwa, sị: ‘O nweghị onye ga-emerụ gị ahụ́.’​—Ọrụ 18:10.

      Ebe Galio na-akagbu ebubo e boro Pọl n’ihu ndị boro ya ebubo iwe ji. Ndị agha Rom na-agbalị ime ka ìgwè mmadụ ahụ iwe ji ghara ịkpa aghara.

      “O wee chụpụ ha ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe.”​—Ọrụ 18:16

      14, 15. (a) Olee ebubo ndị Juu boro Pọl, oleekwa ihe mere Galio ji kagbuo ebubo ahụ? (b) Gịnị ka e mere Sọstenis, gịnịkwa ka ọ ga-abụ na o mechara mee?

      14 Gịnị mere mgbe Pọl rutere n’ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe? Ọkàikpe nọ ebe ahụ bụ gọvanọ na-achị Akeya. Aha ya bụ Galio. Ọ bụ ya tọrọ onye ọkachamara Rom aha ya bụ Seneka. Ndị Juu boro Pọl ebubo, sị: “Nwoke a na-akụziri ndị mmadụ ka ha na-efe Chineke otú iwu na-ekwughị ka e si na-efe ya.” (Ọrụ 18:13) Ihe ndị Juu na-ekwu bụ na Pọl na-ada iwu n’ihi na ọ na-eme ka ndị Juu ghọọ Ndị Kraịst. Ma, Galio ghọtara na e nweghị “ihe ọjọọ” Pọl mere, e nweghịkwa “arụ ọ kpara.” (Ọrụ 18:14) Galio achọghị itinye aka n’esemokwu ndị Juu. Tupudị Pọl azara ọnụ ya, ọ kagburu ebubo ahụ e boro Pọl. Ezigbo iwe were ndị ahụ boro Pọl ebubo. Ha wesara Sọstenis iwe. Ọ ga-abụ na Sọstenis nọchiri Krispọs, bụrụzie onyeisi oche ụlọ nzukọ. Ha jidere ya “ma malite iti ya ihe n’ihu ebe ahụ a na-anọ ekpe ikpe.”​—Ọrụ 18:17.

      15 Gịnị mere Galio ji hapụ ìgwè mmadụ ahụ ka ha tie Sọstenis ihe? O nwere ike ịbụ na Galio chere na Sọstenis bụ onyeisi ndị ahụ chọrọ imesi Pọl ike, na ọ na-aghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Ma Sọstenis ọ̀ bụ onyeisi ha ma ọ bụ na ọ bụghị, ihe ahụ merenụ rụpụtara ihe dị mma. N’akwụkwọ ozi mbụ Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọrịnt mgbe ọtụtụ afọ gachara, ọ kpọrọ otu nwanna a na-akpọ Sọstenis aha. (1 Kọr. 1:1, 2) Ọ̀ bụ ya bụ Sọstenis ahụ e tiri ihe na Kọrịnt? Ọ bụrụ na ọ bụ ya, ọ ga-abụ na ihe ahụ e tiri ya meziri ka ọ ghọọ Onye Kraịst.

      16. Olee otú ihe Onyenwe anyị kwuru, nke bụ́ ‘na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. Anọnyeere m gị,’ si gbasa ozi anyị?

      16 Ọ̀ kwa i chetara na ọ bụ mgbe ndị Juu jụchara ozi ọma Pọl nọ na-ezi ha ka Onyenwe anyị Jizọs mesiri ya obi ike, sị: “Ụjọ atụla gị, kama na-ekwusa ozi ọma, adala mbà. . . . Anọnyeere m gị”? (Ọrụ 18:9, 10) Anyị kwesịrị iburu okwu ndị ahụ n’obi, karịchaa, mgbe ndị mmadụ jụrụ ozi ọma anyị chọrọ izi ha. Echefukwala na Jehova na-enyocha obi, ọ na-adọtakwa ndị nwere ezi obi n’ebe ọ nọ. (1 Sam. 16:7; Jọn 6:44) Ihe a kwesịrị ịgba anyị ume ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. Kwa afọ, a na-eme ọtụtụ narị puku mmadụ baptizim. Ihe ọ pụtara bụ na a na-eme ọtụtụ narị mmadụ baptizim kwa ụbọchị. Jizọs kwere ndị niile na-erube isi n’iwu o nyere ka e “mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ” ya nkwa, sị: “M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.”​—Mat. 28:19, 20.

      “Ma Ọ Bụrụ Uche Jehova” (Ọrụ 18:18-22)

      17, 18. Olee ihe ọ ga-abụ na Pọl chetara mgbe ọ nọ n’ụgbọ mmiri na-aga Efesọs?

      17 Anyị amaghị ma ọ̀ bụ ihe ahụ Galio mere mgbe e boro Pọl ebubo mere ka a kwụsị inye ọgbakọ ọhụrụ ahụ dị na Kọrịnt nsogbu. Ma, Pọl nọkwuru “ọtụtụ ụbọchị” tupu ya asị ụmụnna ya nọ na Kọrịnt ka e mesịa. Ná mmalite afọ 52 O.N.K., o kpebiri na ya ga-abanye ụgbọ mmiri dị na Senkrea gaa Siria. Senkrea dị ihe dị ka kilomita iri na otu ma e si Kọrịnt gawa ebe ọwụwa anyanwụ. Ma tupu Pọl ahapụ Senkrea, ọ “kpụdara ntutu isi ya . . . n’ihi na o nwere nkwa o kwere Chineke.”c (Ọrụ 18:18) Ọ kpọziiri Akwịla na Prisila, ha abanye ụgbọ mmiri gafee Oké Osimiri Ejiyan gaa Efesọs nke dị n’Eshia Maịnọ.

      18 Mgbe Pọl banyere ụgbọ mmiri na Senkrea, ọ ga-abụ na o chetara ihe ndị mere na Kọrịnt. E nwere ọtụtụ ihe ọma ọ ga-echeta ga-eme ya ezigbo obi ụtọ. Ozi o jere ebe ahụ otu afọ na ọnwa isii arụpụtala ihe ọma. E nweela ọgbakọ na Kọrịnt. Ọ bụ n’ụlọ Jọstọs ka ha na-anọ amụ ihe. Jọstọs, Krispọs na ezinụlọ ya, na ọtụtụ ndị ọzọ so ná ndị ghọrọ Ndị Kraịst na Kọrịnt. Pọl hụrụ ndị ahụ chegharịrị ọhụrụ n’anya, n’ihi na ọ bụ ya nyeere ha aka ịghọ Ndị Kraịst. Ọ ga-emecha degara ha akwụkwọ ozi ma kwuo na ha bụ akwụkwọ ozi e dere n’obi ya iji jaa ya mma. Anyịnwa na-ahụkwa ndị anyị nyeere aka ịbata n’ọgbakọ n’anya. N’eziokwu, obi na-atọgbu anyị atọgbu ma anyị hụ ụmụnna ndị a bụ́ ‘akwụkwọ ozi e dere iji jaa anyị mma.’​—2 Kọr. 3:1-3.

      19, 20. Gịnị ka Pọl mere ozugbo o rutere Efesọs, oleekwa ihe anyị na-amụta n’aka ya gbasara ime ihe anyị kpebiri ime n’ozi Chineke?

      19 Ozugbo Pọl rutere n’Efesọs, ọ malitere ọrụ kacha mkpa ọ na-arụ. Ọ ‘banyere n’ụlọ nzukọ na-akụziri ndị Juu ihe, na-enyere ha aka ịghọta Akwụkwọ Nsọ.’ (Ọrụ 18:19) Pọl anọteghị aka n’Efesọs n’oge ahụ. A gwara ya ka ọ nọtụkwuo, ma “o kweghị.” Mgbe ọ na-agwa ndị Efesọs ka e mesịa, o kwuru, sị: “M ga-abịa ịhụ unu ọzọ ma ọ bụrụ uche Jehova.” (Ọrụ 18:20, 21) O doro anya na Pọl ghọtara na e nwere ọtụtụ ndị a ka ga-ezi ozi ọma n’Efesọs. O bu n’obi ịlọghachi Efesọs, ma ọ hapụrụ ihe niile n’aka Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịmụta ihe n’ihe a Pọl mere? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe anyị kpebiri ime n’ozi Chineke, anyị kwesịrị ịmalite ya amalite. Ma, anyị kwesịrị ikwe ka Jehova na-eduzi anyị mgbe niile, na-agbalịkwa ime ihe bụ́ uche ya.​—Jems 4:15.

      20 Pọl hapụrụ Akwịla na Prisila n’Efesọs ma banye n’ụgbọ mmiri rute Sizaria. Ọ ga-abụ na ọ “gakwara” Jeruselem kelee ọgbakọ dị n’ebe ahụ. (Ọrụ 18:22) Pọl sizi ebe ahụ gaa ebe ọ na-ebi n’Antiọk nke Siria. Ọ gachaala njem nke abụọ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, njem ahụ gakwara nke ọma. Gịnị ga-eme ya na njem nke ikpeazụ ọ ga-aga?

      NKWA PỌL KWERE

      Ọrụ Ndịozi 18:18 kwuru na mgbe Pọl nọ na Senkrea, “ọ kpụdara ntutu isi ya . . . n’ihi na o nwere nkwa o kwere.” Olee nkwa o kwere?

      Mmadụ ikwe Chineke nkwa pụtara onye ahụ iji obi ya niile gwa Chineke na e nwere ihe ya ga-eme, ma ọ bụ na ya ga-enye ya onyinye, ma ọ bụkwanụ jeere ya ozi n’ụzọ pụrụ iche. Ụfọdụ ndị chere na ihe mere Pọl ji kpụda ntutu isi ya bụ ka o mezuo nkwa o kwere ịbụ onye Naziraịt. Ma, anyị kwesịrị icheta na Akwụkwọ Nsọ kwuru na onye Naziraịt ga-akpụ ntutu isi ya “n’ọnụ ụzọ ụlọikwuu nzute” mgbe o jechaara Jehova ozi pụrụ iche. Ọ ga-abụ naanị na Jeruselem ka onye Naziraịt ga-anọ kpụọ isi ya. Ebe ọ bụ na Pọl nọ na Senkrea mgbe ahụ, ọ pụtara na ọ bụghị onye Naziraịt.​—Ọnụ Ọgụ. 6:5, 18.

      Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwughị mgbe Pọl kwere Chineke nkwa ahụ. O nwedịrị ike ịbụ na o kwere nkwa ahụ mgbe ọ na-aghọbeghị Onye Kraịst. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ekwukwanụghị ma è nwere otu ihe ọ rịọrọ Jehova ka o meere ya. Otu akwụkwọ e ji eme nchọnchọ kwuru na ihe mere Pọl ji kpụda ntutu isi ya nwere ike ịbụ ka o “kelee Chineke maka otú o si chebe ya ya ejee ozi ya nke ọma na Kọrịnt.”

      a Gụọ igbe bụ́ “Kọrịnt Bụ Obodo Nwere Ọdụ Ụgbọ Mmiri Abụọ.”

      b Gụọ igbe bụ́ “Akwụkwọ Ozi Ndị Na-agba Ume Pọl Si n’Ike Mmụọ Nsọ Dee.”

      c Gụọ igbe bụ́ “Nkwa Pọl Kwere.”

  • ‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Mmegide
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 20

      ‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Mmegide

      Otú Apọlọs na Pọl si nyere ndị ọzọ aka ka ha nụ ozi ọma

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 18:23–19:41

      1, 2. (a) Olee nsogbu bịaara Pọl na ndị ibe ya n’Efesọs? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya n’isiokwu a?

      NDỊ mmadụ nọ na-eti mkpu ma na-agba ọsọ n’okporo ụzọ ndị dị n’Efesọs. Ebe niile na-azụ wuruwuru. Ìgwè mmadụ iwe ji emewela ngagharị iwe. Ha jidere mmadụ abụọ n’ime ndị ha na Pọl onyeozi so ma dọkpụrụ ha. Ka ìgwè mmadụ ahụ na-eme ara ara na-ebukwu ibu, e nweghịzi ndị nọ n’ụlọ ahịa ndị dị n’akụkụ okporo ụzọ sara mbara n’obodo ahụ. Ha nukọọrọ banye ná nnukwu ámá egwuregwu dị n’obodo ahụ, nke nwere ike ịba puku mmadụ iri abụọ na puku ise (25,000). Ọtụtụ n’ime ha amaghịdị ihe kpatara ọgba aghara ahụ, mana ha chere na a chọrọ imerụ ụlọ nsọ ha na chi ha bụ́ Atemis ha hụrụ n’anya. N’ihi ya, ha malitere iti mkpu, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!”​—Ọrụ 19:34.

      2 Setan emewela otú ọ na-emebu. O ji ìgwè mmadụ na-eme tigbuo zọgbuo na-agbalị ime ka a kwụsị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, ọ bụghị naanị tigbuo zọgbuo ka Setan ji eme ka a kwụsị ikwusa ozi ọma. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ụzọ dị iche iche Setan si gbalịa ka ọ kwụsị ọrụ ikwusa ozi ọma ma mee ka Ndị Kraịst oge mbụ ghara ịdị n’otu. Nke ka nke bụ na anyị ga-amụta na ihe niile o mere kụrụ afọ n’ala, n’ihi na ‘okwu Jehova nọ na-agbasa ma na-akpa ike.’ (Ọrụ 19:20) Gịnị mere Ndị Kraịst ahụ ji nwee ike imeri Setan? Ọ bụ n’ihi otu ihe ahụ mere anyị ji emeri ya n’oge a. N’eziokwu, ọ bụ Jehova nwe mmeri, ọ bụghị anyịnwa. Ma, anyị kwesịrị ime òkè nke anyị otú Ndị Kraịst oge mbụ mere. Mmụọ Jehova ga-enyeliri anyị aka ịmụta àgwà ndị ga-eme ka anyị nọgide na-ekwusa ozi ọma. Ka anyị buru ụzọ leba anya n’àgwà ọma Apọlọs kpara.

      ‘Ọ Ma Akwụkwọ Nsọ nke Ọma’ (Ọrụ 18:24-28)

      3, 4. Gịnị ka Akwịla na Prisila chọpụtara gbasara Apọlọs, oleekwa otú ha si nyere ya aka?

      3 Mgbe Pọl na-aga Efesọs na nke ugboro atọ ọ gara mba ọzọ ikwusa ozi ọma, otu onye Juu aha ya bụ Apọlọs bịara Efesọs. O si Alegzandria, bụ́ obodo a ma ama dị n’Ijipt. Apọlọs nwere ụfọdụ àgwà ndị magburu onwe ha. Ọ ma ekwu okwu. Ihe ọzọ bụ na ‘ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma.’ ‘Mmụọ nsọ mekwara ka Apọlọs na-anụ ọkụ n’obi.’ N’ihi ya, o ji ịnụ ọkụ n’obi gwa ndị Juu nọ n’ụlọ nzukọ ha okwu n’atụghị egwu.​—Ọrụ 18:24, 25.

      4 Akwịla na Prisila nụrụ ihe Apọlọs nọ na-ekwu. O doro anya na obi tọrọ ha ụtọ mgbe ha nụrụ ka ọ “na-akụzi ihe ma na-agwa ndị mmadụ eziokwu gbasara Jizọs.” Ihe o kwuru gbasara Jizọs bụ eziokwu. Ma obere oge, di na nwunye ahụ bụ́ Ndị Kraịst chọpụtara na e nwere ihe dị ezigbo mkpa Apọlọs na-amaghị. “Ihe ọ ma bụ naanị gbasara baptizim Jọn.” Di na nwunye a dị umeala n’obi, ndị aka ọrụ ha bụ ịkpa ákwà ụlọikwuu, atụghị Apọlọs ụjọ maka na ọ bụ ọkà okwu, gụọkwa akwụkwọ. Kama ịtụ ya ụjọ, “ha kpọpụrụ ya iche kọwakwuoro ya eziokwu gbasara ụzọ Chineke.” (Ọrụ 18:25, 26) Gịnịzi ka nwoke a ma akwụkwọ, na-ekwukwa okwu nke ọma mere? O doro anya na o gosiri na o nwere otu n’ime àgwà ndị dị oké mkpa Onye Kraịst kwesịrị inwe, ya bụ, ịdị umeala n’obi.

      5, 6. Gịnị nyeere Apọlọs aka ịbakwuru Jehova uru, gịnịkwa ka àgwà ọma Apọlọs kpara na-akụziri anyị?

      5 Apọlọs mekwuru nke ọma n’ozi Jehova maka na o kwere ka Akwịla na Prisila nyere ya aka. O mechara gawa Akeya, bụ́ ebe ọ nọ nyere Ndị Kraịst “ezigbo aka.” O kwusakwaara ndị Juu nọ n’ebe ahụ ozi ọma nke ọma, bụ́ ndị nọ na-esi ọnwụ na Jizọs abụghị Mezaya ahụ e buru n’amụma. Luk kwuru, sị: ‘O ji ịnụ ọkụ n’obi na-egosi na ihe ndị Juu na-ekwu abụghị eziokwu. Ọ na-ejikwa Akwụkwọ Nsọ egosi na Jizọs bụ Kraịst.’ (Ọrụ 18:27, 28) N’eziokwu, Apọlọs baara ọgbakọ ezigbo uru. E nwere ike ikwu na mbọ ọ gbara so mee ka “okwu Jehova” na-akpa ike. Gịnị ka àgwà ọma Apọlọs kpara na-akụziri anyị?

      6 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịdị umeala n’obi. Chineke nyere onye ọ bụla n’ime anyị onyinye dị iche iche. O nwere ike ịbụ nkà anyị nwere, amamihe anyị nwere, ma ọ bụ ihe anyị mụtara. Ma, anyị ga-adịrịrị umeala n’obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka onyinye ndị ahụ baara Jehova uru. Ma ọ́ bụghị ya, onyinye ndị ahụ nwere ike ịkpatara anyị nsogbu. Ha nwere ike ime ka àgwà ọjọọ bụ́ mpako puo ka ero n’obi anyị. (1 Kọr. 4:7; Jems 4:6) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị ga-agbalị na-ewere na ndị ọzọ ka anyị. (Fil. 2:3) Anyị agaghị ajụ ndụmọdụ ndị ọzọ na-enye anyị ma ọ bụ ghara ikwe ka ha kụziere anyị ihe. Anyị agaghị ekwe ka mpako mee ka anyị na-esi ọnwụ ka e mee ihe anyị chọrọ mgbe anyị ma na ọ dabaghị n’ihe mmụọ nsọ mere ka nzukọ Jehova ghọta ugbu a. Ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi, anyị ga-abara Jehova na Ọkpara ya uru.​—Luk 1:51, 52.

      7. Olee otú Pọl na Apọlọs si gosi na ha dị umeala n’obi?

      7 Ịdị umeala n’obi na-emekwa ka Ndị Kraịst ghara ịna-amarịta aka. Ọ̀ bụ na ihe Setan chọsiri ike abụghị ka ọ kpata nkewa n’ọgbakọ Ndị Kraịst oge mbụ? Ọ gaara atọ ya ezigbo ụtọ ma a sị na Apọlọs na Pọl onyeozi, bụ́ mmadụ abụọ na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ, nọ na-amarịta aka, na-azọ onye ọkwá ya ka nke ibe ya n’ọgbakọ. Ọ gaara adịrị ha mfe ime otú ahụ. Na Kọrịnt, ụfọdụ Ndị Kraịst malitere ịsị, “Ana m eso ụzọ Pọl,” ndị ọzọ ana-asị, “Ana m eso ụzọ Apọlọs.” Pọl na Apọlọs hà kwadoro ka ụmụnna ndị ahụ kwuwe ụdị ihe a ga-akpata nkewa? Mbanụ! Pọl dị umeala n’obi. Ọ bụ ya mere o ji jaa Apọlọs mma maka mbọ ọ gbara n’ọrụ ikwusa ozi ọma ma nyekwuo ya ọrụ. Apọlọs mekwara ihe Pọl gwara ya. (1 Kọr. 1:10-12; 3:6, 9; Taị. 3:12, 13) Ha abụọ dị umeala n’obi, nweekwa otu obi. Anyị kwesịrị ịna-eme ka ha taa.

      ‘Ịgwa Ndị Mmadụ Okwu Banyere Alaeze Chineke Otú Ọ Na-eru Ha n’Obi’ (Ọrụ 18:23; 19:1-10)

      8. Olee ụzọ Pọl si gaghachi Efesọs, oleekwa ihe mere o ji si ụzọ ahụ?

      8 Pọl kweburu nkwa na ọ ga-agaghachi Efesọs, o mekwara ihe o kwuru.a (Ọrụ 18:20, 21) Ma, ka anyị leba anya n’ụzọ o si mgbe ọ na-agaghachi. Pọl malitere njem ya n’Antiọk dị na Siria. Iji ruo Efesọs, ọ gaara esi ụzọ dị nso gaa Seliushia, banyezie ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Antiọk. Kama ime otú ahụ, o “si n’ime ime obodo ndị dị n’Eshia gbadata Efesọs.” Otu akwụkwọ kwuru na Pọl gara ihe dị ka otu puku kilomita na narị isii (1,600) iji mee njem ahụ a kọwara n’Ọrụ Ndịozi 18:23 na 19:1. Gịnị mere Pọl ji họrọ isi ụzọ ahụ na-adịghị mfe ọgịga, nke dịkwa ezigbo anya? Ọ bụ n’ihi na ọ chọrọ ‘ime ka okwukwe ndị niile na-eso ụzọ Jizọs sie ike.’ (Ọrụ 18:23) Njem nke atọ a ga-ata akpụ otú nke mbụ na nke abụọ takwara. Ma, ọ ma na mgbalị ya agaghị efu ọhịa. Ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha na-emekwa ụdị ihe ahụ taa. Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ maka ezigbo ịhụnanya ha na-egosi anyị?

      EFESỌS BỤ ISI OBODO ESHIA

      Ọ bụ Efesọs bụ obodo kachanụ n’obodo niile dị n’ebe ọdịda anyanwụ Eshia Maịnọ. N’oge Pọl onyeozi, o nwere ike ịbụ na ndị bi n’Efesọs karịrị narị puku mmadụ abụọ na puku iri ise (250,000). Ebe ọ bụ isi obodo ógbè Eshia ndị Rom na-achị n’oge ahụ, a na-akpọ ya “Obodo Mbụ na Obodo Kachanụ n’Eshia.”

      Ọ bụ azụmahịa na okpukpe mere ka Efesọs bụrụ obodo bara ezigbo ọgaranya. Efesọs nwere ọdụ ụgbọ mmiri dị nso n’akụkụ osimiri, bụ́ ebe ụgbọ mmiri ndị si ebe dị iche iche nwere ike isi na-abata na ya. Ihe e nwere n’Efesọs abụghị naanị ụlọ a ma ama a rụụrụ chi bụ́ Atemis, kama e nwekwara ọtụtụ ụlọ arụsị a rụụrụ chi ndị Grik, chi ndị Rom, chi ndị Ijipt, nakwa chi ndị Anatolia.

      Ụlọ a rụụrụ Atemis so n’ihe ịtụnanya asaa a rụrụ n’ụwa n’oge ochie. Ogologo ya dị ihe dị ka narị amaụkwụ atọ na iri ise (350), obosara ya adịrị ihe dị ka otu narị amaụkwụ na iri isii (160). O nwekwara ihe dị ka otu narị (100) ogidi ndị e ji nkume mabụl rụọ. Ogidi nke ọ bụla dị ihe dị ka amaụkwụ isii n’obosara, ịdị elu ya fọrọ ntakịrị ka ọ dịrị amaụkwụ iri ise na ise. E weere ụlọ ahụ ka ebe kacha nsọ n’obodo niile dị gburugburu Oké Osimiri Mediterenian n’oge ochie. Ndị mmadụ na-edebekwa ego buru ibu n’ebe ahụ ka chi bụ́ Atemis chebe ya. N’ihi ya, e nwere ike ikwu na ụlọ arụsị ahụ ghọziri ụlọ akụ̀ kachanụ n’Eshia.

      Ihe ndị ọzọ dị mkpa a rụrụ n’Efesọs bụ ámá egwuregwu a na-anọ asọ mpi. Ọ ga-abụ na a na-anọ na ya alụ ọgụ onye ka ike gbuo ibe ya. Ihe ndị ọzọ a rụrụ n’Efesọs bụ ebe a na-eme ihe nkiri, ebe ọhaneze na-elepụrụ anya ma na-azụ ahịa, nakwa veranda ndị e nwere ụlọ ahịa n’azụ ha.

      Otu onye Grik aha ya bụ Strabo, bụ́ onye na-amụ banyere ihe ndị dị n’ụwa, kwuru na ájá si n’osimiri sọchiri ọdụ ụgbọ mmiri Efesọs. Ka oge na-aga, e nweghịzi ọdụ ụgbọ mmiri n’obodo ahụ, ndị mmadụ ahapụzie ya. Ebe ọ bụ na e nweghị obodo ọ bụla ọzọ dị ebe ahụ ugbu a, e nwere ike ikwu na ndị na-aga elegharị anya n’ebe Efesọs dịbu na-eji uche ha aghọta otú obodo ahụ dị n’oge ochie.

      9. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka e mee ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs baptizim ọzọ, gịnịkwa ka ihe ha mere na-akụziri anyị?

      9 Mgbe Pọl rutere Efesọs, ọ hụrụ ihe dị ka mmadụ iri na abụọ bụ́ ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim. Baptizim e mere ha bụ baptizim Jọn, nke na-abaghịzi uru. Ọ ga-abụkwa na ha amachaghị gbasara mmụọ nsọ ma ọ bụkwanụ na ha amatụdịghị gbasara ya. Pọl kọwaara ha na e kwesịrị ime ha baptizim n’aha Jizọs, ha egosi na ha dị umeala n’obi, chọọkwa ịmụta ihe otú Apọlọs mere. Mgbe e mechara ha baptizim n’aha Jizọs, mmụọ nsọ dakwasịrị ha, ha enwetakwa onyinye ịrụ ọrụ ebube ụfọdụ. Ihe a gosiri na Jehova na-agọzi ndị na-eso ntụziaka nzukọ ya na-enye.​—Ọrụ 19:1-7.

      10. Gịnị mere Pọl ji hapụ ụlọ nzukọ ndị Juu gaa n’ụlọ ezumezu, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ya mgbe anyị na-ezisa ozi ọma?

      10 E nwere ihe ọzọ mere n’oge na-adịghị anya. Pọl zisara ozi ọma n’ụlọ nzukọ ndị Juu ruo ọnwa atọ n’atụghị egwu. Ọ bụ eziokwu na ‘ọ nọ na-agwa ndị mmadụ okwu banyere Alaeze Chineke otú ọ na-eru ha n’obi,’ ụfọdụ ndị kpọchiri obi ha ma bido imegide Pọl. Kama ikwe ka ndị “na-ekwu okwu ọjọọ banyere Ụzọ Onyenwe anyị” gbuwe ya oge, Pọl malitere ikwu okwu kwa ụbọchị n’ụlọ ezumezu dị n’otu ụlọ akwụkwọ. (Ọrụ 19:8, 9) Ndị chọrọ ịmụtakwu banyere Alaeze Chineke kwesịrị ịhapụ ụlọ nzukọ ndị Juu ahụ ma gafeta n’ụlọ ezumezu ahụ. Dị ka Pọl mere, anyị nwere ike ịkwụsị ụka anyị na onye nwe ụlọ na-akparịta ma anyị chọpụta na ọ chọghị ige ntị ma ọ bụkwanụ na ọ chọrọ naanị ka anyị na ya rụwa ụka. A ka nwere ọtụtụ ndị yiri atụrụ kwesịrị ịnụ ozi na-agba ume anyị na-ezisa.

      11, 12. (a) Olee otú Pọl si gosi na ọ na-arụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe o kwesịrị ime otú ahụ? (b) Olee otú Ndịàmà Jehova si na-agbalị ịrụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe n’otú ha si ekwusa ozi ọma?

      11 O nwere ike ịbụ na Pọl na-ekwu okwu n’ụlọ ezumezu ahụ dị n’ụlọ akwụkwọ kwa ụbọchị, malite n’ihe dị ka elekere iri na otu nke ụtụtụ ruo n’ihe dị ka elekere anọ nke mgbede. (Ọrụ 19:9) Ọ ga-abụ na oge ahụ bụ oge kacha ekpo ọkụ n’ụbọchị nakwa oge ebe niile kacha ada jii, ọ bụkwa mgbe ọtụtụ ndị na-akwụsịtụ ọrụ ha ka ha rie nri ma zurutụ ike. Chegodị nnukwu ọrụ Pọl nọ na-arụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe a ruo afọ abụọ zuru ezu. Ọ pụtara na o ji ihe karịrị puku awa atọ (3,000) kụzie Okwu Chineke.b N’ihi ya, ihe ọzọ mere okwu Jehova ji na-agbasa ma na-akpa ike bụ na Pọl rụsiri ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe o kwesịrị ime otú ahụ. Ọ hazigharịrị oge o ji ekwusa ozi ọma ka ọ daba n’oge ndị obodo ahụ na-enwe ohere. Gịnị meziri? “Ndị niile bi ná mpaghara Eshia nụrụ okwu Onyenwe anyị, ma ndị Juu ma ndị Grik.” (Ọrụ 19:10) N’eziokwu, ọ gbara àmà nke ọma.

      Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ ji telefon na-ekwusa ozi ọma.

      Anyị na-agbalị ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ

      12 Ndịàmà Jehova n’oge anyị a egosikwala na ha na-arụsi ọrụ ike ma na-agbanwe ihe mgbe ha kwesịrị ime otú ahụ. Anyị na-agbalị ịgakwuru ndị mmadụ n’ebe ọ bụla ha nọ nakwa n’oge ọ bụla anyị ga-enweta ha. Anyị na-ekwusa ozi ọma n’okporo ámá, n’ahịa, nakwa n’ebe a na-adọsa ụgbọala. Anyị nwere ike iji ekwentị ma ọ bụ akwụkwọ ozi zie ndị mmadụ ozi ọma. N’ozi ụlọ n’ụlọ, anyị na-agbalị ịchọ ndị mmadụ mgbe anyị ma na anyị ga-akacha enweta ha n’ụlọ.

      ‘Okwu Jehova Na-agbasa ma Na-akpa Ike’ n’Agbanyeghị Ndị Mmụọ Ọjọọ (Ọrụ 19:11-22)

      13, 14. (a) Gịnị ka Jehova nyeere Pọl aka ime? (b) Olee ihe na-adịghị mma ụmụ Siva mere, oleekwa otú ọtụtụ ndị chọọchị si eme ụdị ihe ahụ taa?

      13 Ihe ọzọ Luk gwara anyị bụ na Jehova nyeere Pọl aka ịrụ “ọrụ ebube dị iche iche.” A na-achịrịdị ákwà na eprọn Pọl yiri metụ ndị ọrịa, a gwọọ ha. E sikwa otú a chụpụ ndị mmụọ ọjọọ.c (Ọrụ 19:11, 12) Mmeri a e meriri ndị na-arụrụ Setan ọrụ masịrị ọtụtụ ndị. Ma, ọ bụghị mmadụ niile ka obi dị ụtọ.

      14 “Ụfọdụ ndị Juu ndị na-agagharị na-achụpụ ndị mmụọ ọjọọ” gbalịrị ịrụ ọrụ ebube ndị ahụ Pọl rụrụ. Ụfọdụ n’ime ha gbalịrị iji aha Jizọs na aha Pọl chụpụ ndị mmụọ ọjọọ. Luk kwuru na ụmụ nwoke asaa Siva, bụ́ onyeisi nchụàjà ndị Juu, so ná ndị gbalịrị ime ihe a. Mmụọ ọjọọ ahụ gwara ha, sị: “Ama m Jizọs, marakwa Pọl. Ununwa, ùnu bụ ole ndị?” Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ ji lụsoro ndị aghụghọ ahụ ọgụ, makwasị ha ka anụ ọhịa, merụchaa ha ahụ́, ha agbara ọtọ gbapụsịa. (Ọrụ 19:13-16) N’eziokwu, “okwu Jehova” nwere ezigbo mmeri n’ihi na ọ bịara doo anya na ọ bụ Jehova nyere Pọl ike o ji rụọ ọrụ ndị ahụ, ma e nweghị ihe jikọrọ ya na ndị okpukpe ụgha ahụ na-enweghị ike ọ bụla. Taa, e nwere ọtụtụ nde mmadụ ndị chere na naanị ịkpọku aha Jizọs ma ọ bụ ịza “Onye Kraịst” ezuola. Ma, Jizọs mere ka o doo anya na ọ bụ naanị ndị na-eme uche Nna ya ka ihe ga-adịrị mma n’ọdịnihu.​—Mat. 7:21-23.

      15. A bịa n’ihe gbasara ime mgbaasị nakwa ihe ndị e ji eme ya, olee otú anyị ga-esi eme ka ndị Efesọs?

      15 Ihu e mechuru ụmụ Siva mere ka ọtụtụ ndị tụwa egwu Chineke, kwụsịzie ime mgbaasị ma ghọọ Ndị Kraịst. N’Efesọs, ọtụtụ ndị na-eme anwansi. Ha na-akọ ndị mmadụ ọgwụ, na-agọ mmụọ, na-eji ọtụmọkpọ, nakwa akwụkwọ ndị na-ekwu gbasara anwansi. Ihe ahụ merenụ mere ka ọtụtụ ndị Efesọs kpopụta akwụkwọ ha ji eme anwansi ma kpọọ ha ọkụ n’ihu ọha, n’agbanyeghị na a ga-ereta ha ọtụtụ narị puku naịra ma ọ bụrụ ugbu a.d Luk kọrọ, sị: “Okwu Jehova wee si otú a na-agbasa ma na-akpa ike.” (Ọrụ 19:17-20) Ọ bụ ezigbo mmeri ka eziokwu meriri ụgha nakwa ofufe ndị mmụọ ọjọọ. E nwere ọtụtụ ihe anyịnwa ga-amụta n’aka ndị ahụ rubeere Chineke isi. Ọtụtụ ndị na-emekwa mgbaasị n’oge anyị a. Ọ bụrụ na anyị achọpụta na e nwere ihe anyị nwere gbasara ime mgbaasị, anyị kwesịrị ime ka ndị Efesọs, ya bụ, ibibi ihe ahụ ozugbo. Anyị kwesịrị ịgbara ihe ndị ahụ jọgburu onwe ha ọsọ, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu anyị.

      “E Nwere Ezigbo Ọgba Aghara” (Ọrụ 19:23-41)

      Ebe Dimitriọs ji chi Atemis e ji ọlaọcha kpụọ n’aka. O ji iwe na-agwa ndị omenkà ibe ya okwu n’ebe a na-eji ọlaọcha akpụ ihe n’Efesọs. N’azụ ya, Pọl na-ezi ndị gbakọtara n’ahịa ozi ọma.

      “Ụmụnne m, unu ma nke ọma na ọ bụ ọrụ a na-enye anyị ego.”​—Ọrụ 19:25

      16, 17. (a) Kọwaa otú Dimitriọs si mee ka a malite ngagharị iwe n’Efesọs. (b) Olee otú ndị Efesọs si gosi na okpukpe ha na-agba ha ara?

      16 Ihe ọzọ Luk kọọrọ anyị bụ ụzọ aghụghọ Setan ji bịa ọgụ. Ọ sịrị na “e nwere ezigbo ọgba aghara n’ihi Ụzọ Onyenwe anyị.” Ọ bụghị égbè ọnụ ka ọ na-agba.e (Ọrụ 19:23) Ọ bụ nwoke a na-akpọ Dimitriọs, onye na-eji ọlaọcha akpụ ihe, malitere nsogbu ahụ. O bu ụzọ chetara ndị omenkà ibe ya na ọ bụ ire arụsị a kpụrụ akpụ ka ha ji akpata ego. O si otú ahụ nweta obi ha. Ọ gwaziri ha na ozi Pọl na-ezisa ga-emebiri ha ahịa ebe ọ bụ na Ndị Kraịst anaghị efe arụsị. O kwuru ihe tọrọ ndị ọ na-agwa okwu ụtọ ebe ha bụ ụmụ amaala Efesọs ndị hụrụ obodo ha n’anya. Ọ dọrọ ha aka ná ntị na ọ bụrụ na ndị obodo ahụ egewe Pọl ntị, a ga-ewere chi ha bụ́ Atemis na ụlọ nsọ ha na-ewu ewu n’ụwa niile “ka ihe efu.”​—Ọrụ 19:24-27.

      17 Ihe ahụ Dimitriọs kwuru ruru ndị ọ gwara ya n’obi. Ndị ahụ na-eji ọlaọcha akpụ ihe maliteziri iti mkpu, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” Obodo ahụ gbawaziri aghara, nke mere ka ìgwè mmadụ ahụ anyị kwuru okwu ha ná mmalite isiokwu a mewe ngagharị iwe.f Ebe ọ bụ na Pọl nwere obi ike, ọ chọrọ ịbanye n’ámá egwuregwu ahụ gwa ìgwè mmadụ ahụ okwu. Ma, ndị na-eso ụzọ Jizọs siri ọnwụ na ọ gaghị aga ebe ahụ ka a ghara imerụ ya ahụ́. Otu nwoke aha ya bụ Alegzanda guzoro n’ihu ìgwè mmadụ ahụ ma gbalịa ịgwa ha okwu. Ebe ọ bụ onye Juu, ọ ga-abụ na ọ na-enu ya enu n’obi ịkọwa ihe dị iche ná ndị Juu na Ndị Kraịst ndị ahụ. Ma, ìgwè mmadụ ahụ achọghị ịnụ ihe ọ chọrọ ịgwa ha. Mgbe ha matara na ọ bụ onye Juu, ha tisiwere mkpu ike ruo ihe dị ka awa abụọ, na-asị: “Atemis ndị Efesọs dị ike!” Kemgbe oge ahụ, okpukpe ndị mmadụ akwụsịbeghị ịgba ha ara. Ọ ka na-eme ka ọtụtụ ndị na-akpa àgwà ka ndị na-anaghị eche echiche.​—Ọrụ 19:28-34.

      18, 19. (a) Olee otú onyeisi obodo Efesọs si mee ka ìgwè mmadụ gbakọtara n’obodo ahụ nọrọ jụụ? (b) Olee otú ndị ọchịchị sirila chebe ndị Jehova mgbe ụfọdụ, oleekwa otú àgwà anyị nwere ike isi mee ka ha chebe anyị?

      18 N’ikpeazụ, onyeisi obodo ahụ mere ka ìgwè mmadụ ahụ nọrọ jụụ. Ọ bụ nwoke ma ihe. O bu ụzọ gwa ìgwè mmadụ ahụ iwe ji na Ndị Kraịst ahụ abịaghị imerụ ụlọ nsọ ha na chi ha. Ọ gwakwara ha na o nweghị ihe ọjọọ Pọl na ndị ibe ya mere ụlọ nsọ Atemis, nakwa na e nwere ebe e kwesịrị ịnọ leba ụdị okwu ahụ anya. Ọ ga-abụ na ihe kacha mkpa o chetaara ha bụ na ịkpọkọta ìgwè mmadụ a na-akpa aghara bụ ịda iwu ndị Rom nakwa na e nwere ike ịta ha ahụhụ maka ya. Mgbe ọ gwachara ha okwu, ọ sịrị ha lawa. Eziokwu a doro anya ọ gwara ìgwè mmadụ a mere ka iwe ha dajụọ, ha agbasaakwa ozugbo.​—Ọrụ 19:35-41.

      19 Ihe a abụghị nke mbụ onye ọchịchị isi jụrụ oyi gbachiteere ndị na-eso ụzọ Jizọs, ọ gaghịkwanụ abụ nke ikpeazụ. N’eziokwu, Jọn onyeozi hụrụ n’ọhụụ na n’oge ikpeazụ a, ala nke nọchiri anya ụwa anyị a ga-elo nnukwu mmiri a ga-agbọpụta. Mmiri ahụ a ga-agbọpụta nọchiri anya mkpagbu Setan ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ Jizọs. (Mkpu. 12:15, 16) Ihe a emeela. Ọtụtụ mgbe, ndị ọkàikpe na-eche echiche nke ọma emeela ka Ndịàmà Jehova nweta ikike ịna-ezukọta efe Chineke nakwa ikike izisa ozi ọma. Omume anyị nwekwara ike iso eme ka ndị ọkàikpe kpelaara anyị ikpe. O doro anya na omume Pọl so mee ka ụfọdụ ndị ọchịchị bi n’Efesọs na-akwanyere ya ùgwù ma dị njikere ichebe ya. (Ọrụ 19:31) Ka anyị gbalịa ka àgwà ọma anyị na otú anyị si akwụwa aka ọtọ mee ka ndị ọzọ na-akwanyekwara anyị ùgwù. Ọtụtụ ihe ọma ga-abịara anyị n’ihi àgwà ọma anyị na-akpa.

      20. (a) Olee otú obi dị gị maka otú okwu Jehova si kpaa ike n’oge ndịozi ma ka na-akpa ike n’oge anyị a? (b) Gịnị ka i kpebiri ime banyere iso eme ka ndị Jehova na-emeri n’oge anyị a?

      20 Ọ̀ bụ na obi adịghị anyị ụtọ ileba anya n’otú ‘okwu Jehova si gbasaa ma kpaa ike’ n’oge ndịozi? Obi tọkwara anyị ezigbo ụtọ ịhụ ụzọ dị iche iche Jehova si mee ka ndị ya merie n’oge anyị a. Ị̀ ga-achọ iso na-eme ka ndị Jehova na-emeri n’oge a, ọ bụrụgodị na ihe ị ga-eme ebughị ibu? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, gbalịa mụta ihe n’aka ndị anyị kwuru okwu ha n’isiokwu a. Dịrị umeala n’obi, soro nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ, na-arụsi ọrụ ike, zere mgbaasị, na-agbalịsikwa ike ka àgwà ọma ị na-akpa na otú i si akwụwa aka ọtọ na-agbara ndị ọzọ àmà.

      a Gụọ igbe bụ́ “Efesọs Bụ Isi Obodo Eshia.”

      b Pọl nọkwa n’Efesọs dee Ndị Kọrịnt nke Mbụ.

      c Ákwà ahụ nwere ike ịbụ ihe dị ka hankachiif Pọl na-eke n’egedege ihu ya ka ọsụsọ ghara ịsọba ya n’anya. Ọ ga-abụkwa na eprọn ahụ Pọl yiri n’oge ahụ gosiri na ọ na-arụ ọrụ ịkpa ákwà ụlọikwuu n’oge ọ na-anaghị ekwusa ozi ọma. O nwere ike ịbụ n’ụtụtụ.​—Ọrụ 20:34, 35.

      d Luk kwuru na akwụkwọ ndị ahụ ruru puku mkpụrụ ego ọlaọcha iri ise (50,000). Ọ bụrụ mkpụrụ ego dinarịọs ka o bu n’obi, onye ọrụ n’oge ahụ ga-arụ ọrụ puku ụbọchị iri ise (50,000), ya bụ, ihe dị ka otu narị afọ na iri atọ na asaa (137) tupu ya akpata ego ahụ, ma ọ bụrụ na ọ na-arụ ọrụ ụbọchị asaa n’izu.

      e Ụfọdụ ndị kwuru na ọ bụ ihe a merenụ ka Pọl bu n’obi mgbe ọ gwara ndị Kọrịnt, sị: “Anyị ejighịzi ndụ anyị n’aka.” (2 Kọr. 1:8) Ma, o nwere ike ịbụ na o bu ihe ka nke ahụ njọ n’obi. Mgbe Pọl dere na ‘ya na anụ ọhịa lụrụ ọgụ n’Efesọs,’ ọ ga-abụ na ọ na-ekwu banyere ọgụ nkịtị ya na anụmanụ ọjọọ lụrụ n’ámá egwuregwu, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ mkpagbu ndị mmadụ kpagburu ya ka ọ na-ekwu. (1 Kọr. 15:32) Nkọwa abụọ a dabachara adaba.

      f Òtù dị iche iche, dị ka òtù ndị omenkà, na-akpa ezigbo ike. Dị ka ihe atụ, otu narị (100) afọ ihe a mechara, òtù ndị na-eme achịcha mere ụdị ngagharị iwe a n’Efesọs.

  • “Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 21

      “Ọbara Onye Ọ Bụla A Na-azọpụtaghị Adịghị M n’Isi”

      Otú Pọl si nụọ ọkụ n’obi n’ozi ọma, nakwa ndụmọdụ o nyere ndị okenye

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 20:1-38

      1-3. (a) Kọọ ihe ndị mere n’abalị Yutikọs nwụrụ. (b) Gịnị ka Pọl mere, gịnịkwa ka ihe ahụ na-akụziri anyị banyere Pọl?

      PỌL nọ n’otu ụlọ elu ndị mmadụ juru na Troas. Ọ gwara ụmụnna nọ ebe ahụ okwu ọtụtụ awa maka na ihe a bụ abalị ikpeazụ ya na ha ga-anọ. Ọ bụzi etiti abalị. E nwere ọtụtụ mpanaka na-enwu ọkụ n’ụlọ ahụ, nke mere ka ebe ahụ na-ekpokwu ọkụ. O nwekwara ike ịbụ na o mere ka anwụrụ ọkụ ju ebe ahụ. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Yutikọs nọ ọdụ na windo. Ka Pọl nọ na-ekwu okwu, ụra buuru Yutikọs, ya esi na windo dị n’okpukpu nke atọ n’ụlọ ahụ dapụ.

      2 O nwere ike ịbụ na Luk so ná ndị mbụ gbapụrụ n’èzí ma leruo nwa okorobịa ahụ anya n’ihi na ọ bụ onye na-agwọ ọrịa. A naghị ajụkwa ajụ ma Yutikọs ò kubiela ume. “Ọ nwụọla.” (Ọrụ 20:9) Ma Pọl rụziri ọrụ ebube. O hulatara makụọ nwa okorobịa ahụ ma gwa ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Unu esogbuzila onwe unu, n’ihi na ọ dị ndụ.” Pọl akpọlitela Yutikọs n’ọnwụ.​—Ọrụ 20:10.

      3 Ihe ahụ merenụ gosiri na mmụọ nsọ Chineke na-akpa ike. E kwesịghị ịta Pọl ụta maka ọnwụ Yutikọs. Ma, ọ chọghị ka ọnwụ nwa okorobịa a mebie oge ahụ dị mkpa ma ọ bụkwanụ mee ka ụfọdụ ndị kwụsị inwe okwukwe. Mkpọlite Pọl kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ kasiri ọgbakọ ahụ obi ma gbakwuo ha ume ịnọgide na-eje ozi ha. O doro anya na Pọl ejighị ndụ ndị ọzọ gwuo egwu. Baịbụl chetaara anyị na o kwuru, sị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi.” (Ọrụ 20:26) Ka anyị leba anya n’otú ihe Pọl mere ga-esi enyere anyị aka iji ndụ kpọrọ ihe.

      “Ọ Gawara Masedonia” (Ọrụ 20:1, 2)

      4. Olee nsogbu bịaara Pọl n’Efesọs?

      4 Dị ka anyị kwuru n’Isi nke 20, ezigbo nsogbu bịaara Pọl n’Efesọs. Ozi ọma o kwusara n’ebe ahụ mere ka e nwee ọgba aghara. N’eziokwu, ndị ji ọlaọcha akpụ ihe so ná ndị mere ngagharị iwe n’ihi na ha ji ofufe a na-efe chi Atemis akpa ego. Ọrụ Ndịozi 20:1 kwuru, sị: “Mgbe ndị mmadụ kwụsịrị ịkpa aghara, Pọl ziri ozi ka a kpọọ ndị ahụ na-eso ụzọ Jizọs. Mgbe ọ gbachara ha ume ma sị ha ka e mesịa, ọ gawara Masedonia.”

      5, 6. (a) Afọ ole ka o nwere ike ịbụ na Pọl nọrọ na Masedonia, gịnịkwa ka o meere ụmụnna nọ n’ebe ahụ? (b) Olee otú Pọl si were ụmụnna ya?

      5 Mgbe Pọl na-aga Masedonia, ọ kwụsịtụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Troas. Pọl tụrụ anya na Taịtọs ga-esi na Kọrịnt, bụ́ ebe e zigara ya, bịakwute ya n’ebe ahụ. (2 Kọr. 2:12, 13) Ma mgbe Pọl matara na Taịtọs agaghị abịa, ọ gawara Masedonia. Ọ ga-abụ na ọ nọrọ ihe dị ka otu afọ n’ebe ahụ “gbaa ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume.”a (Ọrụ 20:2) Taịtọs mechara bịakwute Pọl na Masedonia, kọọrọ ya akụkọ ọma banyere otú Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt si nabata akwụkwọ ozi mbụ o degaara ha. (2 Kọr. 7:5-7) Ihe a mere ka Pọl degara ha akwụkwọ ozi ọzọ, nke anyị na-akpọ Ndị Kọrịnt nke Abụọ ugbu a.

      6 Ị̀ hụrụ na mgbe Luk na-akọwa nleta Pọl letara ụmụnna nọ n’Efesọs nakwa na Masedonia, o kwuru na ọ gbara ha ume? Ọ bụ kpọmkwem ihe Pọl meere ụmụnna ya ọ hụrụ n’anya. Ọ kpaghị àgwà ka ndị Farisii, bụ́ ndị na-eleda ndị ọzọ anya, kama, o weere atụrụ Chineke ka ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ. (Jọn 7:47-49; 1 Kọr. 3:9) O medịrị otú ahụ mgbe ọ dụsiri ha ọdụ ike.​—2 Kọr. 2:4.

      7. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Pọl n’oge anyị a?

      7 Taa, ndị okenye ọgbakọ na ndị nlekọta sekit na-agbalị ịna-eme ka Pọl. Ọ bụrụgodị mgbe ha na-adọ ụmụnna aka ná ntị, ihe ha chọrọ bụ ime ka okwukwe ndị e kwesịrị inyere aka sie ike. Ọmịiko na-eme ka ndị okenye na-agbalị ịgba ụmụnna ha ume kama ịma ha ikpe. Otu nwanna bụrụla onye nlekọta sekit ọtụtụ afọ kwuru, sị: “Ọtụtụ ụmụnna anyị chọrọ ime ihe ziri ezi. Ma ọtụtụ mgbe, nsogbu ha na-enwe bụ na ụjọ na-atụ ha, ha anaghị amacha ihe ha ga-eme eme, ihe anaghịkwa agacha otú ha tụrụ anya ya.” Ndị okenye kwesịrị ịgba ụmụnna ha ndị ọ dị otú a ume.​—Hib. 12:12, 13.

      AKWỤKWỌ OZI NDỊ PỌL NỌ NA MASEDONIA DEE

      N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara Ndị Kọrịnt, o kwuru na mgbe ya rutere Masedonia, na ya nọ na-echegbu onwe ya maka ụmụnna ya nọ na Kọrịnt. Ma, Taịtọs si Kọrịnt bịa kọọrọ ya akụkọ ọma banyere ụmụnna ahụ. Akụkọ ọma a kasiri Pọl obi. Ọ bụzi mgbe ahụ, n’ihe dị ka afọ 55 O.N.K., ka Pọl dere Ndị Kọrịnt nke Abụọ. N’akwụkwọ ozi a, o kwuru na ya ka nọ na Masedonia. (2 Kọr. 7:5-7; 9:2-4) Otu n’ime ihe ndị dị Pọl ezigbo mkpa n’oge a bụ ịnakọtacha onyinye a ga-eji nyere ndị nsọ nọ na Judia aka. (2 Kọr. 8:18-21) Ihe ọzọ na-echu ya ụra bụ na e nwere “ndịozi ụgha, ndị aghụghọ” na Kọrịnt.​—2 Kọr. 11:5, 13, 14.

      O nwere ike ịbụ na Pọl nọ na Masedonia dee akwụkwọ ozi ahụ o degaara Taịtọs. N’agbata afọ 61 na 64 O.N.K., mgbe Pọl pụtachara n’ụlọ mkpọrọ n’oge mbụ a tụrụ ya mkpọrọ na Rom, ọ gara agwaetiti Krit. Ọ hapụrụ Taịtọs n’ebe ahụ ka o dozie nsogbu ụfọdụ ma họpụta ndị okenye ọgbakọ. (Taị. 1:5) Pọl gwara Taịtọs ka ọ bịakwute ya na Nikọpọlis. E nwere ọtụtụ obodo na-aza aha a n’oge ochie n’ime obodo ndị gbara Oké Osimiri Mediterenian gburugburu. Ma ọ ga-abụ Nikọpọlis nke dị n’ebe ugwu ọdịda anyanwụ Gris ka Pọl na-ekwu. Ọ ga-abụ gburugburu ebe ahụ ka Pọl nọ na-eje ozi mgbe o degaara Taịtọs akwụkwọ ozi ahụ.​—Taị. 3:12.

      Pọl degakwaara Timoti akwụkwọ ozi nke mbụ n’agbata afọ 61 na 64 O.N.K., ya bụ, n’oge a tụchara ya mkpọrọ nke mbụ na Rom, tupu a tụọ ya mkpọrọ nke ugboro abụọ. Ná mmalite akwụkwọ ozi ahụ, Pọl kwuru na ya gwara Timoti ka ọ nọrọ n’Efesọs, yanwa agawa Masedonia. (1 Tim. 1:3) Ọ ga-abụ n’ebe ahụ ka Pọl nọ degara Timoti akwụkwọ ozi ahụ. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ gwara Timoti okwu ka nna, gbaa ya ume, dụọ ya ọdụ, ma nye ya ntụziaka ndị o kwesịrị iso n’ọgbakọ.

      “Ndị Juu Akpaala Nkata Igbu Ya” (Ọrụ 20:3, 4)

      8, 9. (a) Gịnị mere Pọl ji hapụzie ịga ebe ọ ga-abanye ụgbọ mmiri gawa Siria? (b) Ọ̀ ga-abụ gịnị mere ndị Juu ji na-eburu Pọl iwe n’obi?

      8 Pọl si na Masedonia gaa Kọrịnt.b Mgbe ọ nọrọ ebe ahụ ọnwa atọ, ọ chọrọ ịgawa Senkrea, bụ́ ebe o bu n’obi ịbanye ụgbọ mmiri gawa Siria. Ya ruo ebe ahụ, ọ ga-enwe ike ịga Jeruselem bunye ụmụnna bụ́ ndị ogbenye nọ n’ebe ahụ onyinye e nyere ha.c (Ọrụ 24:17; Rom 15:25, 26) Ma, e nweziri ihe dapụtaranụ mere ka Pọl gbanwee njem ya. Ọrụ Ndịozi 20:3 kọrọ, sị: “Ndị Juu akpaala nkata igbu ya.”

      9 O jughị anyị anya na ndị Juu buuru Pọl iwe n’obi ebe ọ bụ na ha weere ya ka onye kwụsịrị ife Chineke. Ozi ọma o kwusaburu mere ka Krispọs, onye bụ́bu onyeisi n’ụlọ nzukọ ndị Juu dị na Kọrịnt, ghọọ Onye Kraịst. (Ọrụ 18:7, 8; 1 Kọr. 1:14) N’oge ọzọ, ndị Juu nọ na Kọrịnt boro Pọl ebubo n’ihu Galio, onye na-achị ógbè Akeya. Ma Galio kagburu ebubo ndị ahụ, kwuo na ha erijughị afọ. Ihe a Galio mere were ndị iro Pọl ezigbo iwe. (Ọrụ 18:12-17) Ọ ga-abụ na ndị Juu nọ na Kọrịnt matara ma ọ bụ chee na n’oge na-adịghị anya, Pọl ga-aga Senkrea, bụ́ obodo dị nso, banye ụgbọ mmiri. N’ihi ya, ha kpara nkata ichechi ya n’ụzọ. Olee ihe Pọl ga-eme?

      10. Nhapụ Pọl hapụrụ ịga Senkrea ò gosiri na ọ bụ onye ụjọ? Kọwaa.

      10 Pọl kpebiri ịhapụ ịga Senkrea ma si Masedonia laghachi ebe o si bịa, ka ihe ọ bụla ghara ime ya na onyinye ahụ e bunyere ya. Ma, isi n’okporo ụzọ eme njem nwekwara nsogbu nke ya. N’oge ochie, ndị ohi na-echechikarị ndị mmadụ n’okporo ụzọ. Ihe nwedịrị ike ime mmadụ n’ụlọ ndị njem. N’agbanyeghị ihe ndị a, Pọl kpebiri na nsogbu dị na njem okporo ụzọ kaara ya mma karịa isi ebe ahụ e chechiri ya n’ụzọ na Senkrea. Ihe ọzọ dị mma bụ na ọ bụghị naanị ya so aga. Ndị ha na Pọl so aga njem ahụ bụ Arịstakọs, Geyọs, Sekọndọs, Sọpata, Timoti, Trọfimọs, na Tikikọs.​—Ọrụ 20:3, 4.

      11. Olee otú Ndị Kraịst taa si agbalị ka ha ghara ịdaba ná nsogbu, oleekwa ihe anyị na-amụta n’ihe Jizọs mere?

      11 Ndị Kraịst taa na-emekwa ka Pọl. Ha na-agbalị ka ha ghara ịdaba ná nsogbu mgbe ha na-ekwusa ozi ọma. N’ebe ụfọdụ, ha na-aga n’ìgwè n’ìgwè ma ọ bụkwanụ abụọ abụọ kama ịga otu otu. Oleekwanụ ihe ha na-eme ma a kpagbuwe ha? Ndị Kraịst ma na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịkpagbu ha. (Jọn 15:20; 2 Tim. 3:12) Ma, ọ naghị abụ ha hụ nsogbu, ha etinye isi. Chebagodịrị ihe Jizọs mere echiche. E nwere mgbe ndị mmegide nọ na Jeruselem buuru nkume ka ha tụọ ya, “ma Jizọs zoro wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụọ.” (Jọn 8:59) N’oge ọzọ, mgbe ndị Juu nọ na-agba izu igbu ya, ọ “kwụsịrị ijegharị n’ebe ọtụtụ ndị ga-ahụ ya. Ọ hapụkwara ebe ahụ gaa n’ebe dị nso n’ala ịkpa.” (Jọn 11:54) Jizọs gbara mbọ ichebe onwe ya mgbe ime otú ahụ na-emebighị ihe Chineke chọrọ ka o mee. Ndị Kraịst na-emekwa otú ahụ taa.​—Mat. 10:16.

      PỌL BUGAARA ỤMỤNNA ONYINYE E JI ENYERE HA AKA

      N’afọ ndị sochiri Pentikọst nke afọ 33 O.N.K., ọtụtụ nsogbu bịaara Ndị Kraịst bi na Jeruselem. A kpagburu ha, e bukọọrọ ihe ha, ụkọ nri mesikwara ha ike. Ihe a mere ka ọtụtụ n’ime ha daa ogbenye. (Ọrụ 11:27–12:1; Hib. 10:32-34) N’ihi ya, n’ihe dị ka afọ 49 O.N.K., mgbe ndị okenye nọ na Jeruselem gwara Pọl ka ọ gaa kwusaara ndị Jentaịl ozi ọma, ha gbara ya ume ka ọ “na-echeta ndị ogbenye.” Pọl mere otú ahụ. Ọ hụrụ maka ịnakọta ego a ga-eji nyere ọgbakọ dị iche iche aka.​—Gal. 2:10.

      N’afọ 55 O.N.K., Pọl gwara ndị Kọrịnt, sị: “Na-emenụ ya otú ahụ m gwara ọgbakọ ndị dị na Galeshia ka ha na-eme. N’ụbọchị mbụ n’izu ọ bụla, ka onye ọ bụla wepụta ihe ọ ga-enye otú aka hà ya, ka unu ghara ịnakọta onyinye mgbe m rutere. Ma mgbe m rutere, m ga-agwa ụfọdụ ndị ka ha gaa Jeruselem wega onyinye unu ji obi unu niile weta. Ndị m ga-eziga bụ ndị unu dere n’akwụkwọ ozi unu na unu tụkwasịrị obi.” (1 Kọr. 16:1-3) Mgbe oge gatụrụ, ya bụ, mgbe Pọl degaara ndị Kọrịnt akwụkwọ ozi nke abụọ, ọ gbara ha ume ka ha kwadebe onyinye ha, o kwukwara na ndị Masedonia so na-enye onyinye ahụ.​—2 Kọr. 8:1–9:15.

      N’ihi ya, n’afọ 56 O.N.K., ndị nọchitere anya ọgbakọ dị iche iche bịakwutere Pọl ma bunye ya onyinye niile ụmụnna wekọtara. Ụmụ nwoke itoolu ha na ya so nyere aka hụ na o nweghị ihe mere ya na onyinye ndị ahụ, meekwa ka a ghara ibo Pọl ebubo ọ bụla na o riri ego ụmụnna nyere n’onyinye. (2 Kọr. 8:20) Isi ihe mere Pọl ji gaa Jeruselem bụ ka o bugara ụmụnna onyinye ndị ahụ. (Rom 15:25, 26) Pọl mechara gwa Gọvanọ Feliks, sị: “Mgbe ọtụtụ afọ gachara, agara m Jeruselem ka m nye onyinye a ga-eji nyere ndị obodo m aka, nyekwa ihe ndị a ga-eji chụọrọ Chineke àjà.”​—Ọrụ 24:17.

      Ha “Na-enwe Sọ Aṅụrị” (Ọrụ 20:5-12)

      12, 13. (a) Olee otú obi dị ọgbakọ ahụ mgbe a kpọlitere Yutikọs n’ọnwụ? (b) Olee olileanya Baịbụl mere ka ndị mmadụ nwụnahụrụ n’oge a nwee nke na-eme ka ha na-enwe aṅụrị?

      12 Pọl na ndị ibe ya sokọta ọnụ gafere Masedonia. Ma, ọ ga-abụ na e nwere mgbe ha gawara iche iche, mechazie sokọta ọnụ na Troas.d Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe ụbọchị ise gachara, anyị ruru Troas ebe ha nọ.”e (Ọrụ 20:6) Ọ bụ n’ebe ahụ ka a kpọlitere nwa okorobịa ahụ bụ́ Yutikọs n’ọnwụ dị ka e kwuru ná mmalite isiokwu a. Chegodị otú obi dị ụmụnna ahụ mgbe ha hụrụ ka a kpọlitere nwanna ha bụ́ Yutikọs n’ọnwụ. Ọrụ Ndịozi kwuru na ha nọ “na-enwe sọ aṅụrị.”​—Ọrụ 20:12.

      13 Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị arụ ụdị ọrụ ebube ahụ n’oge a, ma ndị mmadụ nwụnahụrụ “na-enwe sọ aṅụrị” n’ihi olileanya mbilite n’ọnwụ Baịbụl mere ka ha nwee. (Jọn 5:28, 29) Ebe ọ bụ na Yutikọs ezughị okè, o mechara nwụọ ọzọ. (Rom 6:23) Ma, ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ Chineke ga-enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Ndị a na-akpọlite n’ọnwụ ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe ga-enwezi ahụ́ nke na-enweghị ike ịnwụ anwụ. (1 Kọr. 15:51-53) Ndị Kraịst n’oge a, ma ndị e tere mmanụ ma ndị so ‘n’atụrụ ọzọ,’ kwesịrị ‘ịna-enwe sọ aṅụrị.’​—Jọn 10:16.

      “N’Ihu Ọha Nakwa n’Ụlọ n’Ụlọ” (Ọrụ 20:13-24)

      14. Gịnị ka Pọl gwara ndị okenye si Efesọs mgbe ya na ha hụrụ na Maịlitọs?

      14 Pọl na ndị ibe ya si Troas gaa Asọs, sizie ebe ahụ gaa Mitilini, Kiọs, Semọs, na Maịlitọs. Pọl chọrọ iru Jeruselem tupu Ememme Pentikọst amalite. Ọ dịzi ya ngwa ngwa ugbu a. Ọ bụ ya mere o ji soro ụgbọ mmiri nke na-agaghị abanye Efesọs. Ma, ebe ọ bụ na Pọl chọrọ ịgwa ndị okenye si n’Efesọs okwu, ọ gwara ha ka ya na ha hụ na Maịlitọs. (Ọrụ 20:13-17) Mgbe ha rutere, Pọl gwara ha, sị: “Unu ma nnọọ otú m si na-akpa àgwà mgbe mụ na unu nọ, malite n’ụbọchị mbụ ụkwụ m kpara ná mpaghara Eshia. Eweturu m onwe m ala na-agbara Onyenwe anyị ohu. Ebere m ákwá, taakwa ahụhụ mgbe ndị Juu kpara nkata igbu m. Unu makwa na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile ga-abara unu uru ma ọ bụ izi unu ihe n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ. Kama, eziri m ma ndị Juu ma ndị Grik ozi ọma nke ọma ka ha chegharịa, fewe Chineke ma nwee okwukwe n’Onyenwe anyị Jizọs.”​—Ọrụ 20:18-21.

      15. Olee ụfọdụ uru ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ bara?

      15 E nwere ọtụtụ ụzọ anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma taa. Dị ka Pọl mere, anyị na-agbalị ịga ebe anyị ga-ahụ ndị mmadụ, dị ka n’ebe ụgbọala na-akwụsị, n’okporo ámá na-ekwo ekwo, ma ọ bụkwanụ n’ahịa. Ma, ụzọ bụ́ isi Ndịàmà Jehova si ekwusa ozi ọma ka bụkwa ịga n’ụlọ n’ụlọ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ikwusa ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ na-eme ka mmadụ niile nwee ohere ịnụ ozi Alaeze ugboro ugboro. Ọ na-egosi na Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-emekwa ka a na-enyere ndị nwere ezi obi aka nke ọma. Ihe ọzọ bụ na ozi ụlọ n’ụlọ na-eme ka okwukwe ndị na-ezisa ya sikwuo ike, meekwa ka ha na-atachi obi. N’eziokwu, otu n’ime ihe e ji mara ezigbo Ndị Kraịst taa bụ na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ikwusa ozi ọma “n’ihu ọha nakwa n’ụlọ n’ụlọ.”

      16, 17. Olee otú Pọl si gosi na ọ naghị atụ egwu, oleekwa otú Ndị Kraịst n’oge a si eme ka ya?

      16 Pọl kọwaara ndị okenye ahụ si Efesọs na ya amaghị ihe ga-eme ya ma ọ gaghachi Jeruselem. Ọ gwara ha, sị: “Ka o sina dị, o nweghị ihe m ji ndụ m kpọrọ. Ihe bụ́ mkpa m bụ ime ihe niile m kwesịrị ime na ịrụcha ọrụ Onyenwe anyị Jizọs nyere m. Ọrụ ahụ bụ izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma gbasara amara Chineke meere anyị.” (Ọrụ 20:24) Pọl atụghị egwu. O kweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ ghara ijezu ozi ya, ma ọ̀ bụ ọrịa ma ọ̀ bụ mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ.

      17 Ndị Kraịst taa na-edikwa nsogbu dị iche iche. N’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị machiri ọrụ ụmụnna anyị, na-akpagbukwa ha. E nwere ndị na-arịa ọrịa, nweekwa ndị obi na-anaghị ezu ike. Ma, ha na-edi ya. Ụmụ klas ndị na-eto eto bụ́ Ndị Kraịst na-enye ha nsogbu ka ha mee ihe na-adịghị mma. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị Ndịàmà Jehova, ha na-akwụsi ike ka Pọl, kpebisiekwa ike “izi ndị mmadụ ozi ọma nke ọma.”

      “Na-elezinụ Onwe Unu na Ìgwè Atụrụ Chineke Niile Anya” (Ọrụ 20:25-38)

      18. Olee otú Pọl si mee ka ọbara onye ọ bụla ghara ịdị ya n’isi, oleekwa otú ndị okenye si Efesọs ga-esi mee otú ahụ?

      18 Pọl nyeziri ndị okenye ahụ si Efesọs ndụmọdụ doro anya ma chetara ha otú yanwa si lekọta ọgbakọ dị iche iche. O bu ụzọ gwa ha na ihe a nwere ike ịbụ nke ikpeazụ ha ga-ahụ ya. Ọ gwaziri ha, sị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi, n’ihi na ahapụghị m ịgwa unu ihe niile Chineke zubere ime.” Olee otú ndị okenye ahụ si Efesọs ga-esi na-eme ka Pọl, ka ọbara onye ọ bụla ghara ịdị ha n’isi? Ọ sịrị ha: “Na-elezinụ onwe unu na ìgwè atụrụ Chineke niile anya, nke mmụọ nsọ họpụtara unu ka unu bụrụ ndị na-elekọta ya, ka unu na-azụ ọgbakọ Chineke, nke o ji ọbara Ọkpara ya zụta.” (Ọrụ 20:26-28) Pọl dọrọ ha aka ná ntị na “anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri” ga-abata n’etiti ìgwè atụrụ ahụ ma ‘na-ekwu ihe ndị na-abụghị eziokwu iji dọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha sowe ha.’ Gịnị ka ndị okenye ahụ kwesịrị ime? Pọl dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Mụrụnụ anya, chetakwanụ na kemgbe afọ atọ, akwụsịghị m iji anya mmiri na-adụ onye ọ bụla n’ime unu ọdụ, ehihie na abalị.”​—Ọrụ 20:29-31.

      19. Gịnị mere n’ihe dị ka afọ iri isii Jizọs nwụchara, gịnịkwa mere mgbe ọtụtụ iri afọ gachara?

      19 “Anụ ọhịa wolf ndị obi tara mmiri” batara n’ọgbakọ n’ihe dị ka afọ iri isii Jizọs nwụchara. N’ihe dị ka afọ 98 O.N.K., Jọn onyeozi dere, sị: “E nweedịla ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ugbu a. . . . Ha si n’ebe anyị nọ pụọ, ma anyị na ha abụghị otu; n’ihi na a sị na anyị na ha bụ otu, ha gaara eso anyị nọrọ.” (1 Jọn 2:18, 19) Ihe dị ka narị afọ abụọ (200) Jizọs nwụchara, e nwere ndị kwụsịrị ife Chineke fewe chi ọzọ. Ihe a mere ka e nwee Ndị Kraịst adịgboroja nakwa ndị ụkọchukwu ha. N’ihe dị ka narị afọ atọ (300) Jizọs nwụchara, eze ukwu bụ́ Kọnstantin kwadoro Ndị Kraịst adịgboroja ahụ. Ndị isi okpukpe ‘kwuru ihe ndị na-abụghị eziokwu’ mgbe ha nabatara ememme ndị ọgọ mmụọ, sịzie na ha bụ ememme Ndị Kraịst. Chọọchị dị iche iche e nwere taa ka na-eso nkụzi na omenala ụgha ndị ahụ.

      20, 21. Olee otú Pọl si gosi na ya ji obi ya niile jeere ọgbakọ ozi, oleekwa otú ndị okenye ọgbakọ n’oge a ga-esi na-eme ka ya?

      20 Ihe Pọl mere dị ezigbo iche n’ihe ndị ahụ ga-emecha rigbuo ìgwè atụrụ Chineke ga-eme. Ọ rụrụ ọrụ ego iji na-egboro onwe ya mkpa ya, ka ọ ghara ibo ọgbakọ ibu arọ. Ihe mere o ji jeere Ndị Kraịst ibe ya ozi abụghị maka na ọ chọrọ irite ihe n’aka ha. Pọl gbara ndị okenye si Efesọs ume ka ha jiri obi ha niile na-emere ụmụnna ha ihe ọma. Ọ gwara ha, sị: “Unu kwesịrị inyere ndị na-adịghị ike aka. Unu kwesịkwara ịna-echeta ihe Onyenwe anyị Jizọs kwuru. Ọ sịrị: ‘A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.’”​—Ọrụ 20:35.

      21 N’oge anyị a, ndị okenye ọgbakọ na-eme ka Pọl. Ha ji obi ha niile na-arụrụ ụmụnna ha ọrụ. Ha anaghị eme ka ndị ụkọchukwu, bụ́ ndị na-erigbu ìgwè atụrụ ha. Ndị e nyere ọrụ ‘ịzụ ọgbakọ Chineke’ na-eji obi ha niile arụ ọrụ. Nganga na oké ọchịchọ ekwesịghị ịdị n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’ihi na ndị ‘na-achọ ka a na-eto ha’ ga-emecha kụọ afọ n’ala. (Ilu 25:27) Naanị ihe mpako na-ebute bụ mmechuihu.​—Ilu 11:2.

      Ebe Pọl na ndị ibe ya na-abanye n’ụgbọ mmiri. Ndị okenye si Efesọs makụrụ Pọl ma bee ezigbo ákwá.

      “Ha niile malitere ibe ezigbo ákwá.”​—Ọrụ 20:37

      22. Gịnị mere ndị okenye si Efesọs ji hụ Pọl n’anya?

      22 Otú Pọl si jiri obi ya niile hụ ụmụnna ya n’anya mere ka ha hụ ya n’anya. N’eziokwu, mgbe oge ruru ka ọ laa, “ha niile malitere ibe ezigbo ákwá, ha makụkwara” ya “ma susuo ya ọnụ.” (Ọrụ 20:37, 38) Ndị Kraịst anaghị eji ndị na-ebu mkpa atụrụ Chineke n’isi ka Pọl egwuri egwu, ha na-ahụkwa ha n’anya. Ugbu a anyị lebachara anya n’ihe Pọl mere, ọ̀ bụ na i kwetaghị na o kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọbara onye ọ bụla a na-azọpụtaghị adịghị m n’isi”?​—Ọrụ 20:26.

      a Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Akwụkwọ Ozi Ndị Pọl Nọ na Masedonia Dee.”

      b O nwere ike ịbụ n’oge a Pọl gara Kọrịnt ka o dere akwụkwọ ozi o zigaara Ndị Rom.

      c Gụọ igbe bụ́ “Pọl Bugaara Ụmụnna Onyinye E Ji Enyere Ha Aka.”

      d Ọ ga-abụ na ihe mere Luk ji kwuo “anyị” n’Ọrụ Ndịozi 20:5, 6 bụ na o sooro Pọl na Filipaị mgbe Pọl hapụchara ya ebe ahụ n’oge gara aga.​—Ọrụ 16:10-17, 40.

      e Iji ụgbọ mmiri si na Filipaị ruo Troas were ha ụbọchị ise. Ọ ga-abụ na ifufe nyere ha nsogbu, n’ihi na ihe njem ahụ were ha n’oge gara aga bụ naanị ụbọchị abụọ.​—Ọrụ 16:11.

  • “Ka Uche Jehova Mee”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
    • ISI NKE 22

      “Ka Uche Jehova Mee”

      Pọl gara Jeruselem maka na o kpebisiri ike ime uche Chineke

      O Si n’Ọrụ Ndịozi 21:1-17

      1-4. Gịnị mere Pọl ji aga Jeruselem, gịnịkwa ga-eme ya n’ebe ahụ?

      O WUTERE ụmụnna niile mgbe Pọl na Luk na-ahapụ Maịlitọs, wutekwa Pọl na Luk. O siiri ha ezigbo ike ịhapụ ndị okenye ahụ si Efesọs, bụ́ ndị ha hụrụ n’anya. Ha abụọ banyeziri n’ụgbọ mmiri. Ha bu nri na ihe ndị ọzọ ga-adị ha mkpa maka njem ahụ, burukwa onyinye e nyere maka ụmụnna ndị dara ogbenye na Judia. Ha chọsiri ike ịhụ na onyinye ahụ ruru ụmụnna ndị ahụ aka.

      2 Ikuku ji nwayọọ nwayọọ malite ibu ákwà ụgbọ mmiri ha, ụgbọ mmiri ahụ esi n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ na-ekwo ekwo kwọpụ. Pọl na Luk na mmadụ asaa ndị ọzọ ha na ha so nọ na-ele ụmụnna ha ihu ha gbarụchara agbarụ nọ n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. (Ọrụ 20:4, 14, 15) Pọl na ndị ibe ya nọ na-efere ha aka ruo mgbe ha na-anaghịzi ahụ ha anya.

      3 Pọl na ndị okenye Efesọs ahụ arụkọọla ọrụ ọnụ ruo ihe dị ka afọ atọ. Ma ugbu a, ọ na-aga Jeruselem mmụọ nsọ gwara ya gaa. Ọ matụ ihe ga-eme ya n’ebe ahụ. Ọ gwaburu ndị okenye ahụ, sị: “Mmụọ nsọ du m na-aga Jeruselem, n’agbanyeghị na amaghị m ihe ga-eme m ebe ahụ, naanị na si n’obodo ruo n’obodo, mmụọ nsọ na-agbara m àmà ugboro ugboro na a ga-atụ m mkpọrọ, kpagbuokwa m.” (Ọrụ 20:22, 23) N’agbanyeghị na ihe nwere ike ime Pọl, o kwetara ka ‘mmụọ nsọ duo ya,’ ya bụ, o ji obi ya niile kpebie ịga Jeruselem dị ka mmụọ nsọ gwara ya. Ndụ dị ya ụtọ, ma ime uche Chineke bụ ihe kacha ya mkpa.

      4 Ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dị gị? Mgbe anyị nyefere Jehova onwe anyị, anyị ji obi anyị niile kwe ya nkwa na ime uche ya ga-abụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ. Ileba anya n’ihe Pọl onyeozi mere ga-abara anyị uru.

      Ha Gafere “Agwaetiti Saịprọs” (Ọrụ 21:1-3)

      5. Olee ebe Pọl na ndị ibe ya si gaa Taya?

      5 Ụgbọ mmiri ahụ Pọl na ndị ibe ya banyere ‘gawara n’akwụsịghị akwụsị.’ Ihe ọ pụtara bụ na ifufe bu ya na-aga ngwa ngwa ruo mgbe ha ruru n’obodo Kọs n’otu ụbọchị ahụ. (Ọrụ 21:1) Ọ ga-abụ na ụgbọ mmiri ahụ kwụsịtụrụ ebe ahụ ruo echi ya tupu ya agawa Rods na Patara. Na Patara, nke dị n’akụkụ oké osimiri ndịda Eshia Maịnọ, ụmụnna ndị ahụ banyere n’otu nnukwu ụgbọ mmiri na-ebu ibu, ya eburuo ha Taya, nke dị na Finishia. Ka ha na-aga, ha gafere “agwaetiti Saịprọs n’aka ekpe.” (Ọrụ 21:3) Gịnị mere Luk bụ́ onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi ji kwuo na ha gafere Saịprọs?

      6. (a) Olee ihe mere ịhụ Saịprọs nwere ike iji gbaa Pọl ume? (b) Mgbe ị tụgharịrị uche n’otú Jehova sirila gọzie gị ma nyere gị aka, gịnị ka ị chọpụtara?

      6 Ọ ga-abụ na Pọl tụrụ agwaetiti ahụ aka ma kọọ ihe mere ya n’ebe ahụ. N’oge mbụ ọ gara ikwusa ozi ọma ná mba ọzọ, n’ihe dị ka afọ itoolu tupu mgbe ahụ, ya na Banabas na Jọn Mak hụrụ otu dibịa afa aha ya bụ Elimas n’ebe ahụ, bụ́ onye nọ na-enye ha nsogbu. (Ọrụ 13:4-12) O nwere ike ịbụ na ịhụ agwaetiti ahụ na icheta ihe mere n’ebe ahụ gbara Pọl ume ma mee ka obi sie ya ike n’agbanyeghị ihe ga-eme ya na Jeruselem. Anyị nwekwara ike irite uru ma ọ bụrụ na anyị atụgharịa uche n’otú Chineke sirila gọzie anyị ma nyere anyị aka idi ọnwụnwa. Ịtụgharị uche otú a nwere ike ime ka obi dị anyị otú ahụ ọ dị Devid mgbe o dere, sị: “Ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume, ma Jehova na-anapụta ya na ha niile.”​—Ọma 34:19.

      “Anyị Chọwara Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Nọ Ebe Ahụ Wee Chọta Ha” (Ọrụ 21:4-9)

      7. Gịnị ka Pọl na ndị ibe ya mere mgbe ha ruru Taya?

      7 Pọl ghọtara na ọ na-abara Ndị Kraịst uru ma ha na Ndị Kraịst ibe ha na-anọkọ, ọ chọsikwara ike ka ya na ha nọkọọ. Luk dere na mgbe ha ruru Taya, ha “chọwara ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ ebe ahụ wee chọta ha.” (Ọrụ 21:4) Ebe Pọl na ndị ibe ya ma na Ndị Kraịst ibe ha bi na Taya, ha chọrọ ha ma chọta ha. Ọ ga-abụkwa na ha nọrọ na nke ha. Otu n’ime ezigbo ngọzi anyị nwere maka na anyị na-efe Jehova bụ na n’ebe ọ bụla anyị gara, anyị ga-ahụ ụmụnna anyị ndị ga-anabata anyị. Ndị hụrụ Chineke n’anya ma na-efe ya ezigbo ofufe na-enwe ndị enyi n’ụwa niile.

      8. Olee otú anyị kwesịrị isi ghọta Ọrụ Ndịozi 21:4?

      8 Mgbe Luk na-akọ banyere ụbọchị asaa ha nọrọ na Taya, o dere ihe nwere ike iju mmadụ anya. O dere, sị: “N’ihi ihe mmụọ nsọ mere ka ụfọdụ ụmụnna [ndị bi na Taya] mara, ha gwara Pọl ugboro ugboro ka ọ ghara ịkpa ụkwụ na Jeruselem.” (Ọrụ 21:4) Ọ̀ pụtara na Jehova agbanweela obi ya? Ọ̀ na-agwa Pọl ugbu a ka ọ hapụ ịga Jeruselem? Mba. Mmụọ nsọ ebula ụzọ mee ka Pọl mata na a ga-emesi ya ike na Jeruselem, ọ bụghị na o kwesịghị ịga obodo ahụ. Ọ ga-abụ na mmụọ nsọ mere ka ụmụnna ndị nọ na Taya kwuo n’eziokwu na Pọl ga-enwe nsogbu na Jeruselem. N’ihi ya, ebe ọ bụ na ha na-echere Pọl echiche ọma, ha rịọrọ ya ka ọ ghara ịga n’obodo ahụ. O doro anya na ha achọghị ka ihe na-aga ime Pọl mee ya. Ma Pọl gawara Jeruselem n’ihi na o kpebisiri ike ime uche Jehova.​—Ọrụ 21:12.

      9, 10. (a) Mgbe ụmụnna nọ na Taya nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem, olee ihe ọ ga-abụ na o chetara? (b) Olee ihe ndị mmadụ na-achọkarị n’ụwa taa, oleekwa otú o si dị iche n’ihe Jizọs kwuru?

      9 Mgbe ụmụnna nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem, ọ ga-abụ na o chetara na ndị na-eso ụzọ Jizọs gwara Jizọs ụdị ihe a mgbe ọ gwara ha na ya ga-aga Jeruselem, na a ga-ata ya ezigbo ahụhụ ma gbuo ya. N’oge ahụ, Pita meteere Jizọs ebere ma sị ya: “Meere onwe gị ebere, Onyenwe anyị. Ihe a agaghị eme gị.” Ma, Jizọs gwara ya, sị: “Gaa m n’azụ, Setan! Ị na-achọ imegharị m anya, n’ihi na ihe ndị ị na-eche abụghị echiche Chineke, kama ọ bụ nke mmadụ.” (Mat. 16:21-23) Jizọs kpebisiri ike ime uche Chineke nakwa iji ndụ ya chụọ àjà. Otú ahụ ka ọ dịkwa Pọl. O doro anya na ụmụnna nọ na Taya cheere Pọl echiche ọma otú ahụ Pita onyeozi cheere Jizọs. Ma, ha aghọtaghị na ọ bụ uche Chineke ka Pọl gaa Jeruselem.

      Ebe nwanna ọ dị ngwa ngwa na-ele anya n’elekere ya n’oge ọ nọ n’ozi ọma, nwanna ya na ya so elee ya anya.

      Onye chọrọ iso ụzọ Jizọs ga-adị njikere iji ndụ ya niile jeere Chineke ozi

      10 Taa, ọtụtụ ndị na-achọ ime ihe na-agaghị esiri ha ike, ọ bụrụgodị na ihe ahụ adịghị mma. Ndị mmadụ na-achọkarị ịnọ n’okpukpe ga-enye ha ohere ịna-eme otú masịrị ha. Ma, ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya dị nnọọ iche. Ọ gwara ha, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m, ya jụ onwe ya ma buru osisi ịta ahụhụ ya na-eso m mgbe niile.” (Mat. 16:24) Iso Jizọs bụ ihe kacha mma onye ma ihe kwesịrị ime, ma ime ya adịghị mfe.

      11. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na Taya si gosi na ha hụrụ Pọl n’anya ma na-akwado ya?

      11 N’oge na-adịghị anya, oge ruru ka Pọl, Luk, na ndị ọzọ ha na ha so gawa ebe ha na-aga. Ihe mere mgbe ha chọrọ ịgawa na-emetụ n’ahụ́. O gosiri otú ụmụnna nọ na Taya si hụ Pọl n’anya nakwa otú ha si na-akwadosi ozi ya ike. Ha so Pọl na ndị ibe ya rute n’akụkụ osimiri, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị ma ụmụaka. Ha niile gburu ikpere n’ala, kpee ekpere ma sị ya gaa nke ọma. Mgbe e mechara, Pọl, Luk, na ndị ha na ha so banyere n’ụgbọ mmiri ọzọ gawa Tọlemeis. Ha gakwuuru ụmụnna n’ebe ahụ, ha na ha anọọ otu ụbọchị.​—Ọrụ 21:5-7.

      12, 13. (a) Olee otú Filip si jiri obi ya niile jee ozi ọtụtụ afọ? (b) Olee otú Filip si bụrụ onye Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị iṅomi taa?

      12 Ihe ọzọ Luk kọrọ bụ na Pọl na ndị ibe ya gawara Sizaria. Ozugbo ha ruru ebe ahụ, ha “banyere n’ụlọ Filip onye na-ezisa ozi ọma.”a (Ọrụ 21:8) Ọ ga-abụrịrị na obi tọrọ ha ụtọ ịhụ Filip. N’ihe dị ka afọ iri abụọ gara aga na Jeruselem, ndịozi họpụtara ya ka o nye aka na-ekesa ihe oriri n’ọgbakọ Ndị Kraịst ahụ malitere ọhụrụ. Filip ejirila ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma ọtụtụ afọ. Cheta na mgbe mkpagbu chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs, Filip gara Sameria malite ikwusa ozi ọma. O mechara zie onye Etiopia bụ́ nnukwu mmadụ ozi ọma, meekwa ya baptizim. (Ọrụ 6:2-6; 8:4-13, 26-38) N’eziokwu, o ji obi ya niile jee ozi ọtụtụ afọ.

      13 Izisa ozi ọma ka na-anụ Filip ọkụ n’obi. Luk kpọrọ ya “onye na-ezisa ozi ọma.” O gosiri na ọ ka na-ekwusasi ozi ọma ike na Sizaria, bụ́ ebe o bizi. Anyị mụtakwara na o nwere ụmụ agbọghọ anọ ndị na-ebu amụma, nke gosiri na ha so nzọụkwụ nna ha.b (Ọrụ 21:9) N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na Filip rụsiri ọrụ ike iji mee ka ndị ezinụlọ ya na-eme nke ọma n’ọgbakọ. Taa, Ndị Kraịst bụ́ nna kwesịrị ịna-eme ka ya, na-ebute ụzọ n’ọrụ ikwusa ozi ọma, na-enyekwara ụmụ ha aka iji ọrụ a kpọrọ ihe.

      14. Olee uru nleta Pọl letara ụmụnna ya bara, oleekwa ohere ndị yiri ya anyị na-enwe taa?

      14 N’ebe ọ bụla Pọl gara, ọ chọtara ụmụnna ya, ya na ha anọtụ. N’eziokwu, obi dị ụmụnna ndị bi n’obodo ndị ahụ ụtọ ile Pọl na ndị ibe ya ọbịa. O doro anya na nleta ahụ o letara ha mere ka ha ‘gbaa Pọl ume, ya agbaakwa ha.’ (Rom 1:11, 12) Anyị na-enwekwa ụdị ohere a taa. Ọ bụrụ na ị nabata ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha n’ụlọ gị, ọ bụrụgodị na ụlọ gị abụghị ụlọ ndị ukwu, ị ga-erite ọtụtụ uru.​—Rom 12:13.

      SIZARIA BỤ ISI OBODO ÓGBÈ JUDIA NDỊ ROM CHỊRỊ

      N’oge ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi mere, Sizaria bụ isi obodo ógbè Judia ndị Rom na-achị. Ọ bụkwa ebe gọvanọ ógbè ahụ si na-achị, bụrụkwa ebe e nwere ogige ndị agha kachanụ n’ógbè ahụ. Ọ bụ Herọd Onye Ukwu rụrụ obodo ahụ ma gụọ ya aha Siza Ọgọstọs. N’oge ahụ, Sizaria nwere ihe niile e ji mara obodo ndị Gris na-ekpere arụsị. O nwere ụlọ nsọ a rụrụ maka ife Siza Ọgọstọs, nweekwa ebe a na-eme ihe nkiri, ebe a na-eji ịnyịnya agba ọsọ, na ámá egwuregwu. Ọtụtụ ndị bi na Sizaria bụ ndị Jentaịl.

      Sizaria bụ obodo a rụsiri ike nwere ọdụ ụgbọ mmiri. Herọd rụrụ ọdụ ụgbọ mmiri ọhụrụ a na-akpọ Sebastos (bụ́ otú ndị Grik si akpọ Ọgọstọs) ka o nwee nnukwu mgbidi ga na-egbochi ebili mmiri n’ọdụ ụgbọ mmiri ahụ. Ọ bụrụ na ọ rụghị ihe ahụ, ọ garaghị adị mma inwe ọdụ ụgbọ mmiri n’akụkụ oké osimiri ahụ. Herọd chọrọ ka ọdụ ụgbọ mmiri ya karịa nke dị n’Alegzandria, bụ́ ebe obodo ndị dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Oké Osimiri Mediterenian na-abịa azụ ahịa. Ọ bụ eziokwu na ọdụ ụgbọ mmiri ahụ dị na Sizaria emechaghị karịa nke dị n’Alegzandria, Sizaria ghọrọ ebe a ma ama maka na e si na ya aga ebe dị iche iche a na-azụ ahịa n’ụwa.

      Filip onye na-ezisa ozi ọma kwusara ozi ọma na Sizaria. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ lụọ nwaanyị ma mụọ ụmụ. (Ọrụ 8:40; 21:8, 9) Ọ bụ ebe ọchịagha ndị Rom aha ya bụ Kọniliọs bi nakwa ebe ọ nọ chegharịa.​—Ọrụ 10:1.

      Pọl onyeozi gara Sizaria ọtụtụ ugboro. Obere oge o chegharịchara, mgbe ndị iro kpara nkata igbu ya, ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ngwa ngwa si Jeruselem kpọga ya Sizaria ka ọ banye ụgbọ mmiri ga-ebuga ya Tasọs. Isi Jeruselem ruo Sizaria dị kilomita iri itoolu. Mgbe Pọl na-aga Jeruselem n’oge ọ gachara mba ọzọ nke ugboro abụọ na nke ugboro atọ kwusaa ozi ọma, ọ kwụsịtụrụ n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Sizaria. (Ọrụ 9:28-30; 18:21, 22; 21:7, 8) E jichiri Pọl afọ abụọ n’obí Herọd dị na Sizaria. N’oge Pọl nọ ebe ahụ, ya na Feliks, Festọs, na Agrịpa kparịtara ụka. O sizi ebe ahụ banye ụgbọ mmiri gawa Rom.​—Ọrụ 23:33-35; 24:27–25:4; 27:1.

      ỤMỤ NWAANYỊ HÀ KWESỊRỊ ỊNA-AKỤZI IHE N’ỌGBAKỌ NDỊ KRAỊST?

      Olee ọrụ ụmụ nwaanyị rụrụ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’oge ndịozi? Ụmụ nwaanyị hà kwesịrị ịna-akụzi ihe n’ọgbakọ?

      Jizọs gwara ụmụazụ ya ka ha kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke ma mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Ọ bụ Ndị Kraịst niile ka a gwara kwusaa ozi ọma, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. Ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ amụma e buru na Joel 2:28, 29, nke Pita onyeozi kwuru na o mezuru na Pentikọst afọ 33 O.N.K. “Chineke kwuru, sị, ‘N’oge ikpeazụ, m ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla. Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma, . . . m ga-awụkwasịkwa mmụọ m n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke nakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị, ha ga-ebukwa amụma.’” (Ọrụ 2:17, 18) Dị ka anyị kwuburu, Filip onye na-ezisa ozi ọma nwere ụmụ agbọghọ anọ na-ebu amụma.​—Ọrụ 21:8, 9.

      Ma, Okwu Chineke kwuru na ọ bụ naanị ụmụ nwoke a họpụtara ka ha bụrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịna-akụzi ihe n’ọgbakọ. (1 Tim. 3:1-13; Taị. 1:5-9) N’eziokwu, Pọl kwuru, sị: “Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe ma ọ bụ ịchị nwoke, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.”​—1 Tim. 2:12.

      “Adị M Njikere . . . Ịnwụ” (Ọrụ 21:10-14)

      15, 16. Olee ozi Agabọs ji bịa, oleekwa otú o mere ka obi dị ndị nụrụ ya?

      15 N’oge Pọl nọ n’ụlọ Filip, onye ọbịa ọzọ a na-akwanyere ùgwù aha ya bụ Agabọs bịara. Ndị zukọtara n’ụlọ Filip ma na Agabọs bụ onye amụma. Ọ bụ ya buru amụma na a ga-enwe oké ụnwụ n’oge Klọdiọs na-achị. (Ọrụ 11:27, 28) O nwere ike ịbụ na ha na-eche ugbu a, sị: ‘Gịnị mere Agabọs ji bịa? Olee ozi ọ bịara izi?’ Ka ha nọ na-ele ya anya, ọ chịịrị ájị̀ Pọl, ya bụ, ákwà dị ogologo a na-eke n’úkwù, nke e nwere ike itinye ego na ihe ndị ọzọ. Agabọs ji ya kee aka ya na ụkwụ ya. O kwuziri ihe na-emetụ n’ahụ́, sị: “Chineke ji mmụọ nsọ kwuo, sị: ‘Otú a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ájị̀ a agbụ na Jeruselem ma nyefee ya n’aka ndị mba ọzọ.’”​—Ọrụ 21:11.

      16 Amụma ahụ o buru gosiri na Pọl ga-aga Jeruselem. O gosikwara na ndị Juu nọ n’ebe ahụ ‘ga-enyefe ya n’aka ndị mba ọzọ.’ Amụma ahụ metụrụ ndị nọ ebe ahụ n’ahụ́. Luk dere, sị: “Mgbe anyị nụrụ ihe a, ma anyịnwa ma ndị ebe ahụ malitere ịrịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. Ma ọ sịrị: ‛Gịnị mere unu ji na-ebe ákwá? Gịnịkwa mere unu ji na-eme ka obi ghara isi m ike? Ka o doo unu anya na adị m njikere ka e kee m agbụ, dịkwa njikere ịnwụ na Jeruselem n’ihi aha Onyenwe anyị Jizọs.’”​—Ọrụ 21:12, 13.

      17, 18. Olee otú Pọl si gosi na o kpebisiri ike ime uche Chineke, oleekwa ihe ụmụnna mere?

      17 Weregodị ya na ị nọ ebe ahụ. Ụmụnna ndị ahụ, ma Luk, nọ na-arịọ Pọl ka ọ ghara ịga Jeruselem. Ụfọdụ nọkwa na-ebe ákwá. Pọl hụrụ na ha na-echebara ya echiche. N’ihi ya, o medara obi gwa ha na ha na-eme ka ‘obi ghara isi ya ike’ ma ọ bụkwanụ na ‘ha na-eme ka obi gbawaa ya’ dị ka e si sụgharịa ya na Baịbụl ụfọdụ. N’agbanyeghị ya, o kpebisiri ike ịga. O mekwara ihe o meburu mgbe ya na ụmụnna nọ na Taya zukọrọ, o kweghị ka arịrịọ ma ọ bụ ákwá ụmụnna ahụ na-ebe mee ka obi daa ya mbà. Kama ikwe ka obi daa ya mbà, ọ kọwaara ha ihe mere ọ ga-eji gaa. O gosiri na o nwere ezigbo obi ike. Pọl kpebisiri ike ịga Jeruselem otú Jizọs meburu. (Hib. 12:2) Pọl achọghị ka e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. Ma, ọ bụrụ na e gbuo ya, ọ ga-ewere ya ka ihe ùgwù ịnwụ maka na ọ bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs.

      18 Oleezi ihe ụmụnna ahụ mere? E kwuo ya ná nkenke, ha kwanyeere Pọl ùgwù. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe anyị hụrụ na anyị agaghị agbanweli obi ya, anyị kwụsịrị ịgwa ya ka ọ ghara ịga. Anyị sịkwara: ‛Ka uche Jehova mee.’” (Ọrụ 21:14) Ndị ahụ gbalịrị ime ka Pọl ghara ịga Jeruselem esighị ọnwụ na Pọl ga-emerịrị ihe ha kwuru. Ha gere Pọl ntị ma kweta ihe o kwuru. Ha nabatara ihe o kwuru ma ghọta na ọ bụ uche Jehova n’agbanyeghị na o siiri ha ike ime otú ahụ. Pọl amalitela njem nke ga-emecha kpatara ya ọnwụ. Ihe ga-akara ya mfe ma ọ bụrụ na ndị ahụ hụrụ ya n’anya akụdaghị ya obi.

      19. Olee ihe bara uru anyị na-amụta n’ihe mere Pọl?

      19 Anyị mụtara ezigbo ihe n’ihe Pọl mere. Ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ime ka ndị ji ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi daa mbà. Ma, ọ bụghị naanị n’okwu ọnwụ na ndụ ka anyị ga-amụta ihe n’ihe Pọl mere, kama e nwere ọtụtụ ihe ọ na-akụziri anyị. Dị ka ihe atụ, ọ bụ eziokwu na ọ na-esiri ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ nne na nna ike ịhụ ka ụmụ ha hapụrụ ụlọ ma gaa n’ebe dị anya ijere Jehova ozi, ma ha kpebisiri ike na ha agaghị akụda ha obi. E nwere otu nwanna nwaanyị bi n’Ịngland aha ya bụ Phyllis. O chetara otú obi dị ya mgbe naanị otu nwa nwaanyị ọ mụtara gara ikwusa ozi ọma n’Afrịka. Phyllis kwuru, sị: “Amaghị m otú obi dị m adị mgbe ahụ. Ọ dịrịghị m mfe na ọ ga-aga ije ozi n’ebe dị ezigbo anya. O wutere m, ma eji m ya eme ọnụ. M kpere ekpere banyere ya ọtụtụ mgbe. Ma, ọ bụ mkpebi ya, o nweghịkwa mgbe m gbalịrị ịgwa ya lọta. A sị ka e kwuwe, m na-akụziri ya mgbe niile ka ihe gbasara Alaeze Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ ya. O jeela ozi ná mba dị iche iche kemgbe afọ iri atọ ugbu a. Ana m ekelekwa Jehova kwa ụbọchị na ọ na-erubere Jehova isi.” Anyị na-eme ihe dị mma ma ọ bụrụ na anyị na-agba ụmụnna anyị ume ka ha jiri ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi.

      Foto ndị na-egosi: Nne na nna na di na nwunye na-eje ozi ná mba ọzọ. 1. Nne na nna ahụ ji obi ụtọ na-akpọ di na nwunye ahụ na telefon. 2. Di na nwunye ahụ ji obi ụtọ na-aza telefon ahụ n’ebe ha na-eje ozi ná mba ọzọ.

      Ọ dị mma ịgba ụmụnna anyị ndị ji ndụ ha niile na-ejere Chineke ozi ume

      “Ụmụnna Ji Ọṅụ Nabata Anyị” (Ọrụ 21:15-17)

      20, 21. Olee ihe gosiri na Pọl chọrọ ka ya na ụmụnna ya na-anọ, oleekwa ihe mere o ji chọọ ka ya na ha na-anọ?

      20 Mgbe Pọl na ndị ibe ya kwadebechara, ha gawara. Ụmụnna ha ndị si Sizaria sokwa ha iji gosi na ha ji obi ha niile kwado ha. N’ebe ọ bụla Pọl na ndị ibe ya rutere ka ha na-aga Jeruselem, ha na-achọta ụmụnna ha, ha na ha anọọ. Mgbe ha rutere Taya, ha hụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, ha na ha anọọ ụbọchị asaa. Na Tọlemeis, ha gara kelee ụmụnna ha, ha na ha anọọ otu ụbọchị. Na Sizaria, ha nọrọ abalị ole na ole n’ụlọ Filip. Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụ́ ndị si Sizaria, sokwa Pọl na ndị ibe ya ruo Jeruselem. Na Jeruselem, a kpọgara ha n’ụlọ Minesin, bụ́ otu n’ime ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Luk kwuziri na mgbe ha ruru Jeruselem, “ụmụnna ji ọṅụ nabata” ha.​—Ọrụ 21:17.

      21 N’eziokwu, Pọl chọrọ ka ya na ụmụnna ya nọrọ. Ụmụnna ya gbara ya ume, ụmụnna anyị na-emekwa otú ahụ taa. O doro anya na ume ahụ a gbara Pọl mere ka obi kaa ya mgbe ìgwè mmadụ iwe ji chọrọ igbu ya.

      a Gụọ igbe bụ́ “Sizaria Bụ Isi Obodo Ógbè Judia Ndị Rom Chịrị.”

      b Gụọ igbe bụ́ “Ụmụ Nwaanyị Hà Kwesịrị Ịna-akụzi Ihe n’Ọgbakọ Ndị Kraịst?”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya