Ịma Mma Nke Isi awọ
LEE oké ihe mkpali ọ ga-abụ isoro ndị ikom na ndị inyom oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi kwurịta okwu! Cheedị nnọọ echiche ịgwa ndị ikom dị ka Noa, Abraham, Mosis, na Jọn Onye Na-eme Baptism okwu, nakwa gwa ndị inyom dị ka Sera, Rehab, Rut, na Debora okwu! Ọ́ gaghị atọgbu gị atọgbu ịnụ ka ha na-akọ akụkọ oké ihe ndị mere n’ogologo oge ndị gara aga bụ́ ndị ha ji anya ha hụ?
Ọbụna taa, ọ́ gaghị amasị gị ịnụ ka ndị agadi na-ekwesị ntụkwasị obi na-ekerịta ahụmahụ banyere otú ha na ndị ọzọ si jigide iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Chineke n’okpuru ule, gụnyere mmachibido iwu, iti ihe, na ịtụ mkpọrọ maka ezi omume? O doro anya! Ịhụnanya anyị maka Chineke na otú anyị si were ha ná ndị ukwuu ga-arịwanye elu ka ha na-agwa anyị banyere mmetụta ha na karịsịa ekele ha sitere n’ala ala obi maka nlekọta ịhụnanya Jehova.
N’etiti ndị Chineke, agadi ndị ikom na ndị inyom na-ekwesị ntụkwasị obi abụwo ndị a na-akwanyere ùgwù mgbe nile maka ahụmahụ, ihe ọmụma, na amamihe ha. N’ezie, a gụnyere ndụmọdụ iwu na-esonụ n’Iwu ahụ Chineke nyere ndị Israel: “Ị ga-ebili ọtọ n’ihu onye isi awọ, sọpụrụkwa ihu okenye, tụọkwa egwu Chineke gị: Mụ onwe m bụ Jehova.” (Levitikọs 19:32) Okwu Hibru maka afọ ndụ ma ọ bụ ime agadi sitere n’okwu mkpọrọgwụ ya pụtara “ipu awọ,” a kpọkwara ya “isi awọ.” Ya mere a tụrụ anya ka ndị Israel na-ebili ọtọ dị ka ihe na-egosi nkwanye ùgwù maka onye mere okenye karị, na-eme otú ahụ ná nsọpụrụ ofufe nke ịtụ egwu Chineke.
Àgwà nkwanye ùgwù dị otú ahụ ọ̀ dị adị taa? Iji maa atụ, ndị na-eto eto hà na-eji obi ọma na-emeghere ndị agadi ụzọ? Ndị ntorobịa na ndị metụworo okenye hà na-enyekarị ndị bụ okenye karị ọnọdụ ha n’ígwè e ji ebugo ndị mmadụ n’ụlọ elu? Ka ndị bụ nwata karị hà na-enyekarị ndị agadi oche ha na bọs ma ọ bụ ụgbọ okporo ígwè mmadụ jupụtara? Ịghara ime ihe dị otú ahụ abụrụwo nke a hụrụ ọbụna n’etiti ndị Kraịst.
Otú ọ dị, iji mee Jehova Chineke obi ụtọ, ndị Kraịst aghaghị ime ihe kwekọrọ n’ụzọ o si ele ihe anya ma zere echiche, okwu, na omume nile nke ndị ‘na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-adịghị ekwenyere ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, na ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.’ (2 Timoti 3:1-5) Mgbe ahụ, gịnị ka Okwu Chineke na-ekwu banyere oge ntorobịa n’ihe banyere isi awọ?
Ike nke Ntorobịa
Bible ghọtara ume ntorobịa na abamuru ya nile, na-ekwu, sị: “Ịma mma ụmụ okorobịa ka ike ha bụ.” (Ilu 20:29) N’Israel oge ochie e ji ike ndị Livaị na-eto eto mee ihe n’ụlọ nsọ ahụ, mgbe mgbe maka ọtụtụ n’ọrụ ndị siri ike karị. Taa, ihe ka ukwuu n’ọrụ ndị a na-arụ n’ebe obibi akwụkwọ, ụlọ obibi Betel, na n’ihe owuwu dị iche iche nke Watch Tower Society, bụ nke ndị ikom na ndị inyom na-eto eto na-arụ, bụ́ ndị nyefeworo ume na ikike ha iji mee ka ọdịmma nile nke Alaeze na-aga n’ihu. (Matiu 6:33) Ha si otú a na-enwe ihe ùgwù ndị dị mma n’ije ozi Chineke.
Ilu ahụ nke a ka hotara ji okwu ndị bụ “ihe nsọpụrụ ndị okenye ka isi awọ bụkwa,” mechie. Mgbe e jikọrọ ume ntorobịa na ahụmahụ na amamihe nke agadi, a na-enwe ngwakọ siri nnọọ ike.
Iji maa atụ: Onye na-eto eto nke na-amụ ọrụ ịkwa nkà nke a gwaworo ka ọ kụchie elu ihe na-achọ iji ike ntorobịa ya rụzuo ọrụ e kenyere ya. Ọkwa nkà meworo okenye karị, nke nwere ahụmahụ achọpụta na n’agbanyeghị ume ya, na onye na-eto eto na-enyere ya aka na-akụ ntu ọtụtụ mgbe tupu ọ kụbanye ya. Onye ọrụ ahụ meworo okenye karị atụọ aro ka nwa okorobịa ahụ jide hama ya n’ọdụ nke ebe a na-ejide ya aka, kama ijide ya nso isi ígwè ahụ. Nke a na-enyere onye ahụ na-eto eto aka iji ike ọrụ ka ukwuu kụọ ntu ahụ, na-echebe oge na ume ọrụ.
N’otu aka ahụ, nwa agbọghọ nke nwere ume ọrụ pụrụ isite n’ime nnwale n’ọtụtụ ụzọ mụta na ákwà ụfọdụ ga-emebi ma ọ bụrụ na a sụghị ha dị ka e nyere ntụziaka. Otú ọ dị, otu nwanyị nweworo ahụmahụ maara uru nke iwepụta oge iji họọ ákwà ndị ahụ ma saa uwe ụfọdụ iche. Ọ mụtawokwa na ya pụrụ ịhapụ ide ụfọdụ ede site n’ịpịa ákwà ndị ahụ ka ọ na-ekoro ha n’ụdọ ma ọ bụ na-achịpụta ha site n’ígwè mgbakọ ákwà.
Ịmụta ihe site ná ndị nwere ahụmahụ pụrụ ime ka ndụ kara mfe. Ka o sina dị, oge na-erute mgbe ọbụna onye ka nwee ahụmahụ na-apụghị ịrụ ọrụ ụfọdụ nke ọ na-arụli n’afọ ole na ole gara aga n’ụzọ dị mfe. Otu onye na-ede ihe kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “A sị nnọọ na ndị ntorobịa maara, ndị agadi enweekwa ike.” Ma lee ka o si adị mma mgbe ndị meworo okenye karị nwere ekele maka ume nke ndị na-eto eto ma jiri ndidi soro ha kerịta ahụmahụ ha nwetaworo n’ọtụtụ afọ—ndị ntorobịa ejirikwa obi umeala na-anakwere aro! N’ụzọ dị otú a, òtù ọgbọ abụọ ahụ ga-erite uru.
Inweta Ịma Mma
Nanị ime okenye ezughị. “Ọ bụghị ndị ukwu maara ihe, ọ bụghịkwa ndị okenye na-aghọta ikpe,” ka Elaịhu na-eto eto kwuru. (Job 32:9; Eklisiastis 4:13) Iji bụrụ onye e weere n’onye dị mkpa n’ihi isi awọ, onye meworo okenye karị aghaghị ijiwo ndụ ya mee ihe karịrị iji umengwụ were ụbọchị ya nile na-ekiri telivishọn, na-aga egwuregwu, ma ọ bụ na-enwe nanị ntụrụndụ n’ụzọ ndị ọzọ. Ọbụna n’afọ ndị na-esonụ, ọ dị ndị meworo okenye mkpa ịnọgide na-amụ ihe.
Ụfọdụ na-eji ime ihe n’ụzọ nke ha na-etu ọnụ, ma ọ bụ ha na-asị: “Ahụmahụ bụ onye nkụzị kasị mma.” Ma, Okwu Chineke na-adụ ọdụ sị: “Ka onye maara ihe wee nụ, wee tụkwasị ihe mmụta n’amamihe ya; ka onye nghọta wee nwetakwa ezi ndụmọdụ.” (Ilu 1:5; tụlee 1 Ndị Kọrint 10:11.) Ahụmahụ adịghị abụ mgbe nile onye nkụzi kasị mma, n’ihi na anyị pụru ịmụṭa ihe site n’ihie ụzọ nke ndị ọzọ n’adabaghị n’otu ndahie ndị ahụ n’onwe anyị. Ọzọkwa, onye Kraịst ga-achọ iburu n’uche na “okpueze nke mara mma ka isi awọ bụ, n’ụzọ ezi omume ka a ga-ahụ ya.” (Ilu 16:31) Ndụ nke e tinyere n’ijere Jehova ozi ikwesị ntụkwasị obi mara mma site n’ụzọ o si ele ihe anya, o kwesịkwara nkwanye ùgwù nke ndị ọzọ dị ka ezi ihe atụ. Otú ọ dị, ịmụta banyere Chineke na inweta ahụmahụ “n’ụzọ ezi omume” pụrụ ịmalite n’oge ná ndụ, o kwesịkwara ịbụ usoro na-enweghị ọgwụgwụ.—Ndị Rom 11:33, 34.
A pụrụ ime ihe atụ nke a site n’ahụmahụ metụtara otu nwata nwoke dị afọ asaa na Sweden. Ọ jụrụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’ọgbakọ ya ma ya pụrụ isonye n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Onye nlekọta ahụ jụrụ sị, “N’ihi gịnị?” Mgbe ahụ, nwa ahụ na-eto eto zara, sị: “Mmadụ agaghị achịsa aka na-egbu oge ná ndụ ya!” (Eklisiastis 12:1) Lee ezi ihe nlereanya nke ahụ bụụrụ ma ndị na-eto eto ma ndị agadi!
Ịsọpụrụ Isi Awọ
Omume na-agbakasị ahụ n’ọha mmadụ nke oge a bụ iwere ọdịdị elu ahụ na ịdị gara gara n’egwuregwu n’ihe dị oké ọnụ ahịa na ilelị ndị agadi. Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà ndị Kraịst n’ebe ndị gbara isi awọ nọ n’ọgbakọ?
Kama ịdị na-elefuru ndị Kraịst mere agadi anya, anyị kwesịrị ichebara ha echiche ma wepụta oge soro ha nọkọọ. Iji maa atụ, ná nzukọ Ndịàmà Jehova na-enwe kwa izu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ị̀ na-ahụ na ị na-ekele ndị meworo okenye karị? Ha na-enwe mmasị n’ezie n’ekele ndị na-eto eto na ndị ọzọ. Leekwa ka ndị agadi si enwe ọṅụ ịnọ ná nnọkọ oriri ndị kwere ekwe ibe ha nke ndị nọ n’afọ ndụ dị iche iche! Ọ bụ ezie na di na nwunye ndị bụ nwata karị pụrụ inwe mmasị ndị yiri nke di na nwunye ndị ọzọ nọ n’afọ ndụ ha, ọ ga-abụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ itinye ndị meworo okenye karị ná nnọkọ obi ụtọ ndị dị otú ahụ.—1 Ndị Tesalọnaịka 3:12; 5:15.
Lee ka o si dị mkpa inwe ọmịiko mgbe a na-agwa ndị agadi okwu! Mgbe otu nwanna metụworo okenye nke tinyeworo 40 afọ n’ijere Jehova ozi gwara onye okenye ọzọ n’otu oge banyere otú a pụrụ isi jiri ya mee ihe n’ọgbakọ, nwoke ahụ nke bụ nwata karị sịrị: “Ọ dịkebeghị ihe ị ga-emeli.” Lee okwu ọjọọ nke ahụ bụ! Nwanna ahụ nke meworo okenye karị nwere ume ọrụ dị nta karịa ka o nwere na mbụ, òkè ọ na-ekere n’ozi ubi adalatawokwa ala, o dokwara anya na ihe ùgwù ụfọdụ nke nlekọta karịrị ikike ndị o nwere ugbu a; ma o nwere ihe dị ukwuu ọ ga-enye. O nwere ọtụtụ afọ nke amamihe na ahụmahụ ọ kwakọbaworo n’ụzọ ezi omume. N’ihi na ndị agadi dị otú ahụ rụsiri ọrụ ike dị ka ndị nkwusa Alaeze, die mkpagbu, buo ibu arọ dị iche iche nke ibu ọrụ ndị Kraiṣt, zụọ ndị ọzọ, ndị Chineke taa nwere nzukọ siri ike nke mmụọ ya na-akwado taa. Ya mere, ka anyị kwanyere ndị dị otú a meworo okenye karị ùgwù dị ka ndị ndụmọdụ maara ihe, ndị ọzụzụ atụrụ na-ahụ n’anya, na ndị nkụzi dị irè.
E nwekwara ezi ihe mere a ga-eji chesie echiche ike banyere aro ndị meworo okenye karị tụrụ. Dị ka ihe atụ, nwanna nweworo ahụmahụ tụrụ aro ka a ghara itinye ụzọ mbata nke otu Ụlọ Nzukọ Alaeze iche ihu n’akụkụ ebe ọdịda anyanwụ nke ihe owuwu ahụ. Ụmụnna nwoke ndị bụ nwata karị bụ́ ndị nwere nchegbu karịsịa maka ihe e chere bụ ịma mma nke ihe owuwu ahụ agbasoghị aro ya. Otú ọ dị, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ọ dịrị mkpa ịgbanwe ebe ọnụ ụzọ ahụ dị n’ihi na ikuku na mmiri nọgidere na-etikwasị ya site n’ebe ọdịda anyanwụ mere ka o rekasịa. Amamihe bara uru nke ahụmahụ karịrị ihe ndị metụtara ịma mma ile anya. Ọ bụrụ na ndị bụ nwata karị asọpụrụ ndị meworo okenye karị site n’ige ntị n’echiche na amamihe ha bara uru, nke a pụrụ nnọọ ichebe oge na ego. Ọbụna ma ọ bụrụ na a gbasoghị aro onye ahụ meworo okenye karị tụrụ, a pụrụ ịsọpụrụ ya site n’ime ka ọ mara na a tụlere ya, ma ihe ndị ọzọ dugara n’ime mkpebi ọzọ.—Tụlee Ilu 1:8.
Lepụ Anya n’Ihu, Ọ Bụghị n’Azụ
Ụfọdụ ndị meworo okenye karị nwere echiche a: “E nweghị oge dị ka oge ochie mgbe mụ na gị bụ nwata.” Otú ọ dị, kama ịdị na-eche banyere oge ndị gara aga, a pụrụ ịgba ndị agadi ume ilepụ anya n’ihu gaa n’ụbọchị ahụ mgbe ha ga-enweta ihe nkwụghachi ụgwọ eluigwe ma ọ bụ nweghachi ike ntorobịa n’okpuru ịchịisi Alaeze Chineke. Ka ọ dị ugbu a, ọ dị ha mkpa ịghọta ebe ike ha ruru n’ihi ịka nká. Ịmata nke a na ịma eme ihe ọchị nke ọma dị oké mkpa mgbe o yiri ka e leghaara onye meworo okenye karị anya maka ihe ùgwù ije ozi.
Dị ka ihe atụ, a pụrụ ijiwo okenye meworo okenye karị mee ihe mgbe mgbe n’usoro ihe omume mgbakọ distrikti n’ọtụtụ afọ gara aga. Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị okenye ruru eru na ụbara ndị ikom nwere ikike izi ihe a pụrụ ịhọrọ. Ọ bụ ezie na ha bụ nwata karị, ụfọdụ n’ime ndị okenye ndị a nwere ịnụ ọkụ n’obi na ikike ndị a nwapụtaworo, ha pụrụ izi ihe nke ọma ma nye nkwali obi ọma, nweekwa ike ịgba ndị ọzọ ume. (1 Ndị Tesalọnaịka 5:12, 13; 1 Timoti 5:17) N’ihi ya, nwanna meworo okenye karị nke na-adịghị apụta n’usoro ihe omume mgbakọ pụrụ iche na e leghaara ya anya ma nwee ike ghara inwe obi ụtọ na e nyewo ndị okenye bụ nwata karị ihe ùgwù ndị ahụ. Ma, a pụrụ ịbịada mmetụta ahụ na-ezighị ezi nke na-esite n’ezughị okè mmadụ. N’ezie, mmadụ nile n’ọgbakọ pụrụ inye aka site n’ime ka ndị meworo okenye karị mara na a chọrọ ha, na a hụrụ ha n’anya maka ikwesị ntụkwasị obi ha, nakwa na a na-ewere echiche ha n’ihe bara oké uru.
Otú ọ dị, ọ dị onye meworo okenye karị mkpa icheta na a ghaghị ịsọpụrụ ndị na-efe ofufe ibe ya dị nnọọ ka ọ ga-achọ ka a sọpụrụ ya. (Matiu 7:12; Ndị Rom 12:10) Kama ịdị na-eche na a napụrụ ha ọrụ n’ike n’ihi afọ ndụ ha ma na-ata ahụhụ n’ihi echiche na-ezighị ezi, ndị meworo okenye karị kwesịrị ịṅụrị ọṅụ n’ihi afọ ndị ha ji jee n’ozi ikwesị ntụkwasị obi. N’ikwukwa eziokwu, anyị nile kwesịrị inwe ekele na n’ihi ngọzi Jehova, e nwere ọnụ ọgụgụ na-aba ụba nke ndị nlekọta ruru eru ikerịta n’ibu ọrụ ahụ na ịnakwere ibu ọrụ dị iche iche nke ọgbakọ ka ọtụtụ ìgwè nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-enubata ná nzukọ ndị Kraịst.—Jọn 10:16; Aịsaịa 60:8, 22; 2 Timoti 2:2.
N’ihi ihe mgbu, ndakpọ ahụ ike, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, ndị nwere isi awọ pụrụ ịdị na-enwe ahụ mgbakasị mgbe ụfọdụ. Nke a na-achọ nghọta na ọmịiko n’akụkụ nke ndị ọzọ nọ n’ezinụlọ ma ọ bụ ọgbakọ. Ọ chọkwara ka ndị ahụ meworo okenye karị rụsie ọrụ ike ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi, bụrụ ndị na-eto eto n’obi na n’uche. Mgbe onye na-eto eto karị nke ya na otu onye meworo okenye karị nke so n’Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova bi na-achọ ịhapụ Betel afọ ole na ole gara aga, onye nke ahụ meworo okenye karị gwara ya ka ọ tụọ aro onye dị mma ga-anọchi ya ma kwuo na ya ga-achọ nwanna nwoke bụ nwata karị, nke tozuru okè, nke ga-enyere ya aka ịnọgide na-abụ onye na-eto eto ma na-arụsi ọrụ ike. Nwanna ahụ e tere mmanụ bụ́ onye meworo okenye karị anaghị achọ ịga ezumike nká ma ọ bụ kwụsịlata ọrụ, n’ihi na e nwere ọrụ a ga-arụ. Lee ezi ihe nlereanya ọ bụ nke ilepụ anya n’ihu na ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi!
Ihe ịrụ ụka adịghị ya, “ịma mma ụmụ okorobịa ka ike ha bụ: ihe nsọpụrụ ndị okenye ka isi awọ bụkwa.” Lee ihe ebube ọ bụ mgbe ndị bụ nwata karị jiri ume ọrụ ha nile, ndị meworo okenye karị etinyekwa amamihe ha, n’ịgbaso ụzọ ezi omume! Ndị Kraịst ma ndị agadi ma ndị na-eto eto na-enwe ọṅụ dị ukwuu ka ha jikọrọ aka na-akwalite ezi ofufe Jehova Chineke, “Onye Ochie ahụ.”—Daniel 7:13.
[Foto dị na peeji nke 28]
Ndị Kraịst nwere isi awọ nwere ihe dị ukwuu inye maka abamuru nke ndị ọzọ