“Sọpụrụ Jehova Site n’Akụ̀ Gị”—N’ụzọ Dị Aṅaa?
“SỌPỤRỤ Jehova site n’akụ̀ gị, sitekwa ná mkpụrụ mbụ nke ihe omume gị nile.” N’okwu amamihe ndị a sitere n’ike mmụọ nsọ, nke e dere n’ihe dị ka afọ 2,600 gara aga, e nwere ihe bụ isi n’inweta ngọzi Jehova n’ụba, n’ihi na onye dere ya gara n’ihu na-ekwu, sị: “Ọbá gị nile ga-ejupụtakwa n’ihe nriju afọ, ebe nzọcha mkpụrụ vine gị nile ga-etiwakwa ná mmanya vine ọhụrụ.”—Ilu 3:9, 10.
Ma gịnị ka ịsọpụrụ Chineke pụtara? Gịnị bụ akụ̀ ndị anyị ga-eji sọpụrụ Jehova? Oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a?
“Sọpụrụ Jehova”
N’Akwụkwọ Nsọ, okwu Hibru bụ isi maka nsọpụrụ, ka·vohdhʹ, pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnyị arọ.” Ya mere ịsọpụrụ mmadụ pụtara iwere ya dị ka onye dị arọ, onye dị ukwuu, ma ọ bụ onye bara uru. Okwu Hibru ọzọ maka nsọpụrụ, yeqarʹ, bụkwa nke a na-asụgharị “dị oké ọnụ ahịa” na “ihe ndị dị oké ọnụ ahịa.” N’ụzọ yiri nke a, okwu Grik bụ ti·meʹ, nke a sụgharịrị ịbụ “sọpụrụ” n’ime Bible, na-enye echiche nke ùgwù, ịba uru, ịdị oké ọnụ ahịa. N’ihi nke a mmadụ na-asọpụrụ onye ọzọ site n’igosi onye ahụ nsọpụrụ na nkwanye ùgwù dị omimi.
Inye nsọpụrụ nwekwara akụkụ ọzọ. Tụlee akụkọ metụtara onye Juu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Mọdekaị, onye kpughere n’otu oge atụmatụ nzuzo e mere igbu Eze Ahasuerọs nke Peasia oge ochie. Mgbe e mesịrị, mgbe eze ahụ chọpụtara na ọ dịbeghị ihe e mere iji sọpụrụ Mọdekaị maka ihe ahụ o mere, ọ jụrụ onye praịm minista ya bụ, Heman, ụzọ kasị mma isi sọpụrụ onye ihe ya tọrọ eze ụtọ. Heman chere na ụdị nsọpụrụ ahụ ga-abụ maka ya, ma lee otú o si hie ụzọ! Otú ọ dị, Heman sịrị na onye dị otú ahụ kwesịrị ka e yiwe ya “uwe alaeze,” burukwa ya n’elu “ịnyịnya nke eze nọkwasịworo.” O kwubiri, sị: “Ka ha meekwa ka ịnyịnya buru ya gaa n’ámá obodo, ka ha kpọọkwa n’ihu ya, sị, Otú a ka a ga-emere nwoke ahụ nke nsọpụrụ ya tọworo eze ụtọ.” (Esta 6:1-9) N’ọnọdụ a, inye mmadụ nsọpụrụ gụnyere ibuli ya elu n’ihu ọha iji mee ka mmadụ nile kwanyere ya ùgwù n’ụzọ dị ukwuu.
N’otu aka ahụ, inye Jehova nsọpụrụ nwere akụkụ abụọ: inye ya nsọpụrụ dị elu n’onwe anyị na ibuli ya elu n’ihu ọha site n’ikere òkè na ịkwado ọrụ nke ịkpọsa aha ya n’ihu ọha.
“Akụ̀ Gị”—Gịnị Ka Ha Bụ?
O doro anya na akụ̀ anyị gụnyere ndụ anyị, oge anyị, nkà anyị, na ume anyị. Gịnị banyere ihe onwunwe anyị? Tụlee okwu Jisọs mgbe ọ hụrụ otu nwanyị bụ́ ogbenye di ya nwụrụ ka ọ tụbara ego nta abụọ n’ime ebe a na-edebe ụtụ ụlọ nsọ. O kwuru, sị: “Nwanyị a, bụ́ ogbenye, nke di ya nwụrụ, ọ tụbara karịa ha nile: n’ihi na ndị a nile [ndị ọzọ na-atụba ego] sitere n’inwebiga akụ̀ ókè ha tụba n’onyinye: ma nwanyị ahụ sitere n’ụkọ ya tụba ihe nile o nwere nke o ji biri.” (Luk 21:1-4) Jisọs toro nwanyị a di ya nwụrụ maka iji ihe onwunwe ya mee ihe n’ịkwalite ofufe Jehova.
Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, akụ̀ ndị Solomọn kwuru okwu ha gụnyekwara ihe onwunwe ọ bụla anyị pụrụ inwe. Okwu ahụkwa bụ́ “ihe omume gị nile” na-ebu echiche nke inye Jehova akụ̀ anyị ndị kachasị mma.
Ma, olee otú inye ihe onwunwe pụrụ isi sọpụrụ Chineke? Ọ̀ bụ na ihe nile abụghị nke ya? (Abụ Ọma 50:10; 95:3-5) “N’ebe Ị nọ ka ihe nile si bịa,” ka Eze Devid kwetara n’ekpere si n’obi o kpegaara Jehova. Banyekwara onyinye buru ibu ya na ndị ya nyere maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ, Devid kwuru, sị: “Ọ bụkwa ihe si n’aka Gị bịa ka anyị nyere Gị.” (1 Ihe Emere 29:14) Ya mere mgbe anyị na-enye Jehova onyinye, nanị ihe anyị na-eme bụ iweghachi ihe o nyeworo anyị site n’ịdị mma nke obi ya. (1 Ndị Kọrint 4:7) Ma, dị ka e gosiri na mbụ, ịsọpụrụ Jehova na-agụnye ibuli ya elu n’ihu ndị ọzọ. Onyinye ihe onwunwe ndị e jikwa mee ihe maka ọganihu nke ezi ofufe na-asọpụrụ Chineke. Bible nwere ihe atụ ndị magburu onwe ha nke ụzọ a nke isi sọpụrụ Jehova.
Ihe Atụ Ndị Sitere n’Oge Gara Aga
Ihe dị ka afọ 3,500 gara aga, mgbe oge ruru ka Jehova nye ụmụ Israel ụlọikwuu ahụ dị n’ọzara dị ka ebe ofufe, mkpa maka ihe ndị dị oké ọnụ ahịa, ndị ụkpụrụ ahụ Chineke nyere chọrọ bilitere. Jehova nyere Mosis iwu ka ‘onye ọ bụla nwere afọ ofufo weta onyinye Jehova.’ (Ọpụpụ 35:5) Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu na-akọwa: “Ha wee bịa, onye ọ bụla nke obi ya kwaliri ya, na onye ọ bụla nke mmụọ ya mere ka o nwee afọ ofufo, ha wee weta àjà mbuli Jehova, iji jee ozi ụlọikwuu nzute ahụ, na iji fee ofufe ya nile, na iji mee uwe nsọ ahụ.” (Ọpụpụ 35:21) N’eziokwu, onyinye afọ ofufo ha buru nnọọ ibu karịa ihe a chọrọ maka ọrụ ahụ nke na e mere ka ndị mmadụ “wetabie ihe”!—Ọpụpụ 36:5, 6.
Tụlee ihe atụ ọzọ. Mgbe ụlọikwuu ahụ rụzuworo nzube ya, a na-emekwa nkwado maka owuwu nke ụlọ nsọ ahụ, Devid nyere onyinye buru ibu n’onwe ya maka ụlọ nsọ ahụ nwa ya, Solomọn, ga-ewu. Ọ kpọkwara ndị ọzọ òkù isonye, ndị ahụ zaghachikwara site n’inye Jehova onyinye akụ̀. Nanị ọlaọcha na ọlaedo ruru ihe dị ka ijeri $50 n’ego oge a. “Ndị Israel wee ṅụrịa ọṅụ, n’ihi na ha weere afọ ofufo nye onwe ha.”—1 Ihe Emere 29:3-9; 2 Ihe Emere 5:1.
‘Onyinye Afọ Ofufo’ n’Oge Anyị
Olee otú anyị pụrụ isi kere òkè n’ọṅụ nke inye onyinye afọ ofufo n’oge anyị? Ọrụ kasị mkpa nke na-aga n’ihu n’ime ụwa n’oge a bụ nke ikwusa Alaeze ahụ na ime ndị na-eso ụzọ. (Matiu 24:14; 28:19, 20; Ọrụ 1:8) Jehova ahụwokwa ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị inyefe ọdịmma elu ala nke Alaeze ahụ n’aka Ndịàmà ya.—Aịsaịa 43:10.
O doro anya na a chọrọ ego iji kwadoo ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ taa. Iwu na ilekọta Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, alaka ụlọ ọrụ, ụlọ obibi akwụkwọ, na ụlọ obibi Betel dị iche iche na-ewe ego. Ibi na ikesa Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible n’asụsụ dịgasị iche iche na-agụnyekwa ọtụtụ mmefu ego. Olee otú e si enweta ego dị otú ahụ nke nzukọ na-emefu? Site n’onyinye nke bụ nnọọ n’afọ ofufo!
Ihe ka ọtụtụ n’onyinye ahụ na-esite n’aka ndị—dị ka nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke Jisọs hụrụ—nwere nanị ntakịrị ihe e ji ebi ndụ. N’achọghị ịbụ ndị akụkụ a nke ịsọpụrụ Jehova kwara, ha na-enye ọnụ ego na-ebuchaghị ibu “ka ike ha hà,” na, mgbe ụfọdụ, ọbụna “karịakwa ike ha.”—2 Ndị Kọrint 8:3, 4.
“Ka onye ọ bụla n’etiti unu nye dị ka o buru ụzọ họpụta n’obi ya; ọ bụghị site ná mwute, ma ọ bụ site ná mkpa: n’ihi na Chineke hụrụ onye weere obi ụtọ na-enye n’anya,” ka Pọl onyeozi gwara ndị Kraịst nọ na Kọrint. (2 Ndị Kọrint 9:7) Onyinye obi ụtọ chọrọ ime ezi atụmatụ. Pọl gwara ndị Kọrint: “Kwa ụbọchị mbụ n’izu ụbọchị asaa ka unu nile n’otu n’otu debe ihe n’ụlọ na-akpado ya, otú ihe na-agara onye ọ bụla nke ọma, ka a ghara [ịnakọta] ụtụ mgbe ọ bụla m ga-abịa.” (1 Ndị Kọrint 16:2) N’otu aka ahụ, ndị na-achọ inye onyinye iji kwalite ọrụ Alaeze ahụ pụrụ n’onwe ha n’ụzọ afọ ofufo iwepụ ụfọdụ n’ime ihe ha na-akpata iche maka nzube ahụ.
Jehova Na-agọzi Ndị Na-asọpụrụ Ya
Ọ bụ ezie na ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe n’onwe ya adịghị eduje n’ihe ịga nke ọma ime mmụọ, iji akụ̀ anyị—oge anyị, ume anyị, nakwa ihe onwunwe anyị eme ihe—iji sọpụrụ Jehova na-eweta ngọzi bara ụba. Nke a dị otú a n’ihi na Chineke, onye ihe nile bụ nke ya, na-emesi anyị obi ike, sị: “Mkpụrụ obi nke na-agọzi agọzi ka a ga-eme ka ọ maa abụba: ọzọ, onye na-eme ka ndị ọzọ ṅụjuo afọ, a ga-emekwa ka ya onwe ya ṅụjuo afọ.”—Ilu 11:25.
Mgbe ọnwụ Eze Devid gasịrị, nwa ya bụ́ Solomọn jiri onyinye afọ ofufo ahụ nna ya nakọtaworo wuo ụlọ nsọ dị ebube, dị ka Jehova nyeworo ntụziaka ya. Ruokwa oge nile Solomọn nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’ofufe ya nke Chineke, “Juda na Israel wee biri ná ntụkwasị obi . . . site na Dan wee ruo na Bịasheba, ụbọchị nile nke Solomọn.” (1 Ndị Eze 4:25) Ụlọ nkwakọba ihe nile juru n’ọnụ, ebe nzọcha mkpụrụ vine nile tiwara—ruo oge nile Israel ‘jiri akụ̀ ha sọpụrụ Jehova.’
Mgbe e mesịrị, site n’ọnụ onye amụma bụ́ Malakaị, Jehova kwuru, sị: “Nwaanụ m na nke a, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị, ma M gaghị emeghere unu window nile nke eluigwe, wụsara unu ngọzi, ruo mgbe ọnọdụ agaghị ezu ịnagide ya.” (Malakaị 3:10) Ihe ịga nke ọma ime mmụọ nke ndị ohu Jehova na-enwe taa bụ ihe àmà na Chineke edebewo nkwa ya.
N’ezie ọ na-amasị Jehova mgbe anyị mere akụkụ nke anyị n’ịkwalite ọdịmma nile nke Alaeze. (Ndị Hibru 13:15, 16) Ọ na-ekwekwa nkwa ịkwagide anyị ma ọ bụrụ na anyị ‘buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ na ezi omume ya.’ (Matiu 6:33) Site n’ọṅụ dị ukwuu nke obi, ka anyị ‘were akụ̀ anyị nile sọpụrụ Jehova.’
[Igbe dị na peeji nke 28, 29]
Ụzọ Ụfọdụ Ndị Si Ewepụta Onwe Ha Inye Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ
Ọtụtụ ndị na-ewepụta ma ọ bụ mawapụta ego iche nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị ahụ a mapawara akwụkwọ bụ́: “Onyinye Maka Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ nke Society—Matiu 24:14.” Kwa ọnwa, ọgbakọ dị iche iche na-ezije ego ndị a n’isi ụlọ ọrụ ụwa dum nke dị na Brooklyn, New York, ma ọ bụ n’alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ha. A pụkwara iziga onyinye ego afọ ofufo gaa kpọmkwem na Treasurer’s Office, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 25 Columbia Heights, Brooklyn, New York 11201-2483, ma ọ bụ gaa n’alaka ụlọ ọrụ Society nke na-elekọta mba unu. A pụkwara ịtụnye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ bara uru. E kwesịrị izitekọ onyinye ndị a na akwụkwọ ozi dị mkpirikpi nke na-akọwa na ha bụ onyinye.
Onyinye nke A Pụrụ Ịnaraghachi A pụrụ inye Watch Tower Society ego n’okpuru ndokwa pụrụ iche nke na a ga-enyeghachi ya onye ahụ nyere ya ma ọ bụrụ na o nwee mkpa. Iji nwetakwuo ihe ọmụma, biko kpọtụrụ Treasurer’s Office n’adres e dere n’elu.
Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya
Tinyere inye onyinye ego kpọmkwem na onyinye ego ndị a pụrụ ịnaraghachi, e nwere ụzọ ndị ọzọ nke inye ihe iji baara ozi Alaeze zuru ụwa ọnụ uru. Ndị a gụnyere:
Inshọransị: A pụrụ idenye aha Watch Tower Society dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ inshọransị anwụọ ma ọ bụ n’atụmatụ ego a na-erite ma a laa ezumike nká. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú ahụ.
Ihe Ndekọ Ego Ụlọ Akụ̀: A pụrụ ime ndokwa ka ihe ndekọ ego ụlọ akụ̀, satifiketi ndebe ego, ma ọ bụ ihe ndekọ ego ezumike nká nke ndị mmadụ n’otu n’otu dịrị ná ntụkwasị obi n’aka ma ọ bụ nke a ga-akwụnye Watch Tower Society mgbe onye debere ya nwụrụ, n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ahụ na-agbaso. E kwesịrị ime ka Society mara banyere ndokwa ọ bụla dị otú a.
Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: A pụrụ inye Watch Tower Society ihe ndị nọchiri anya ego dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ ná ndokwa nke bụ na onye nyere ha ga-anọgide na-enweta ego a na-akwụ maka ha.
Ala na Ụlọ: A pụrụ inye Watch Tower Society ala na ụlọ nke a pụrụ ire ere site n’inye ya dị ka onyinye kpam kpam ma ọ bụ site n’inye onye ahụ nyere ya ohere nke ịnọgide na-ebi n’ebe ahụ n’oge nile ọ dị ndụ. Mmadụ kwesịrị ime ka Society mara tupu o denyere Society ala na ụlọ ọ bụla.
Ike Ekpe na Ihe Ntụkwasị Obi: A pụrụ idenye Watch Tower Society ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e deziri nke ọma n’ụzọ iwu kwadoro, ma ọ bụ a pụrụ ịkpọ Society aha dị ka ndị ga-erite uru ná ndokwa atụmatụ ego. Atụmatụ ego ndị e mere ka ha baara òtù okpukpe uru pụrụ ime ka e sepụtụrụ mmadụ ego ụtụ isi ọ ga-akwụ. E kwesịrị izijere Society otu n’ime akwụkwọ ike ekpe ma ọ bụ nke ndokwa atụmatụ ego ma ọ bụ ihe onwunwe dị otú ahụ.
Dị ka okwu ahụ bụ “inye ihe e mere atụmatụ ya” na-enye echiche ya, ụdị onyinye ndị a chọrọ nnọọ ime atụmatụ ụfọdụ n’aka onye ahụ na-enye onyinye. Iji nyere ndị na-achọ ime ka Society rite uru site n’ụdị ụfọdụ nke inye ihe e mere atụmatụ ya aka, a kwadebewo otu broshuọ a kpọrọ Planned Giving to Benefit Kingdom Service Worldwide. E dere broshuọ ahụ ná nzaghachi nye ọtụtụ ajụjụ ndị Society nataworo metụtara onyinye, ike ekpe, na ihe ntụkwasị obi. O nwekwara n’ime ya ihe ọmụma ndị ọzọ ndị bara uru metụtara ime atụmatụ ala na ụlọ, ego, na ụtụ isi, a hazikwara ya iji nyere ndị bi na United States aka bụ́ ndị chọrọ ime ihe maka ọdịmma Alaeze n’ụwa dum ịhọrọ ụzọ ndị kasị baa uru, ndị kasịkwa dị irè isi mee otú ahụ na-eburu ọnọdụ onwe onye na nke ezinụlọ ha n’uche. Site n’ịgụ broshuọ ahụ na isoro ndị na-arụ ọrụ na Ngalaba Inye Ihe E Mere Atụmatụ Ya kparịta ụka, ọtụtụ ndị enwewo ike ịkwado Society ma n’otu mgbe ahụ mụbaa ihe e sepụrụ n’ụtụ isi site n’ime otú ahụ. A pụrụ inweta broshuọ ahụ ma a rịọ maka ya, ma ọ bụ site n’akwụkwọ ozi ma ọ bụ site na telifon.
Ndị nwere mmasị na nke ọ bụla n’ime ndokwa inye ihe e mere atụmatụ ha ndị a kwesịrị ịkpọtụrụ Planned Giving Desk, Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania, 100 Watchtower Drive, Patterson, New York 12563-9204, telifon (914) 878-7000, ma ọ bụ ha kwesịrị ịkpọtụrụ ụlọ ọrụ Society na-elekọta mba ha.