Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 12/1 p. 4-7
  • Aha nke Na-eduga n’Ezi Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Aha nke Na-eduga n’Ezi Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Aha Jisọs Na-anọchi Anya Ya
  • Okwukwe n’Ebe Jisọs Nọ Ka Ọ̀ Bụ n’Ebe Siza Nọ?
  • Iṅomi Ndị Kraịst Oge Mbụ Taa
  • Ihe Inwe Okwukwe n’Aha Jisọs Pụtara
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Otú Anyị Kwesịrị Ijiru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Aha Chineke
    Teta!—2017
  • Otú Jizọs Jiruru Aha Jehova Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 12/1 p. 4-7

Aha nke Na-eduga n’Ezi Okwukwe

“UNU ekweghị na Jisọs na ọbara mgbapụta ya,” ka otu nwanyị gwara otu n’ime Ndịàmà Jehova. Otu nwoke ji olu ike kwuo, sị: “Unu na-akpọ onwe unu Ndịàmà Jehova, ma abụ m onye àmà Jisọs.”

Echiche bụ́ na Ndịàmà Jehova ekweghị na Jisọs ma ọ bụ na ha adịghị eme ka ọ na-ewu ewu otú kwesịrịnụ, zuru ebe nile. Otú ọ dị, olee ihe bụ eziokwu?

Ọ bụ eziokwu na Ndịàmà Jehova na-enwe mmetụta siri ike banyere aha Chineke, bụ́ Jehova.a Itamar, bụ́ Onyeàmà nọ na Brazil, na-echeta, sị: “Oge oké mgbanwe ná ndụ m bịara mgbe m mụtara aha Chineke. Mgbe m gụrụ ya ná nke mbụ ya, ọ dị nnọọ ka a ga-asị na etetawo m n’oké ụra. Aha ahụ bụ́ Jehova kpaliri m, kwaliekwa m ime ihe; o metụtara akụkụ kasị mie emi nke mkpụrụ obi m.” Otú o sina dị, ọ na-agbakwụnye, sị: “Obi m na-ejupụtakwa n’ịhụnanya n’ebe Jisọs nọ.”

Ee, Ndịàmà Jehova na-aghọta na iji nweta ndụ ebighị ebi, ha aghaghị inwe okwukwe “n’aha Ọkpara Chineke,” bụ́ Jisọs. (1 Jọn 5:13) Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘n’aha Jisọs’ pụtara?

Ihe Aha Jisọs Na-anọchi Anya Ya

A na-achọta “n’aha Jisọs” na okwu ndị yiri ya n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke ndị Kraịst, ma ọ bụ “Agba Ọhụrụ” nile. N’ezie, okwu ahụ bụ́ “aha” nke e ji mee ihe n’izo aka n’ebe ọrụ Jisọs dị na-apụta ihe karịrị ugboro 80, ihe dị ka ugboro 30 n’akwụkwọ Ọrụ Ndị Ozi nanị. Ndị Kraịst narị afọ mbụ mere baptism n’aha Jisọs, gwọọ ọrịa n’aha ya, kụzie ihe n’aha ya, kpọkuo aha ya, taa ahụhụ n’ihi aha ya, buliekwa aha ya elu.—Ọrụ 2:38; 3:16; 5:28; 9:14, 16; 19:17.

Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu Bible si kwuo, a na-ejikarị okwu Grik maka “aha” eme ihe n’ime Bible “maka ihe nile aha gụnyere, nke ịbụisi, omume, ọkwá, ebube, ike, ịma mma, na ihe ndị ọzọ, nke ihe nile aha ahụ gụnyere.” Ya mere, aha Jisọs na-anọchị anya ikike ọchịchị dị ebube, dịkwa ukwuu nke Jehova Chineke nyefere ya. Jisọs n’onwe ya kwuru, sị: “E werewo ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa nye m.” (Matiu 28:18) Mgbe Pita na Jọn gwọsịworo otu nwoke dara ngwụrọ, ndị ndú okpukpe ndị Juu jụrụ, sị: “N’aha ike gịnị, ma ọ bụ n’aha [ònye, NW], ka unu onwe unu mere nke a?” Mgbe ahụ, Pita ji anyaike kwupụta okwukwe ya n’ịbụisi na ike nke aha Jisọs nọchiri anya ya mgbe o mere ka a mara na ọ bụ “n’aha Jisọs Kraịst Onye Nazaret, . . . ọ bụ n’aha nke a ka onye a ji ahụ dị mma guzo n’ihu unu n’ebe a.”—Ọrụ 3:1-10; 4:5-10.

Okwukwe n’Ebe Jisọs Nọ Ka Ọ̀ Bụ n’Ebe Siza Nọ?

Otú ọ dị, ikwupụta okwukwe dị otú ahụ n’ebe Jisọs nọ agaghị adị mfe. Dị ka Jisọs buworo n’amụma, ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ ‘ndị mba nile ga-akpọ asị n’ihi aha ya.’ (Matiu 24:9) N’ihi gịnị? N’ihi na aha Jisọs na-anọchị anya ọkwá ya dị ka Onye Ọchịchị Chineke họpụtara, Eze nke ndị eze, bụ́ onye mba nile kwesịrị ido onwe ha n’okpuru ya, bụ́ ihe ha na-adịghị njikere ma ọ bụ na-enweghị ọchịchọ ime.—Abụ Ọma 2:1-7.

Ndị ndú okpukpe nke oge Jisọs achọghịkwa ido onwe ha n’okpuru Jisọs. Ha kwuru, sị: “Anyị enweghị eze ma ọ bụghị Siza,” wee si otú a na-ajụ Ọkpara Chineke. (Jọn 19:13-15) Kama nke ahụ, ha tinyere okwukwe ha n’aha—ike na ịbụisi—nke Siza na ọchịchị alaeze ukwu ya. Ha kpebidịrị na Jisọs kwesịrị ịnwụ ka ha wee nwee ike ijigide ọnọdụ na ọkwá ha.—Jọn 11:47-53.

N’ime ọtụtụ narị afọ mgbe Jisọs nwụsịrị, ọtụtụ n’ime ndị zọọrọ na ha bụ ndị Kraịst mewara omume yiri nke ndị ndú ndị Juu. Ndị a a sị na ha bụ ndị Kraịst tinyere okwukwe ha n’ike na n’ịbụisi nke ọchịchị, tinyekwa aka n’agha ya. Dị ka ihe atụ, na narị afọ nke 11, mgbe chọọchị hazisịrị ndị dike na-enweghị ọrụ gaa na militia Christi, ma ọ bụ ndị knight bụ́ ndị Kraịst, “a napụrụ ọchịchị Krisendọm ibu ọrụ nke iduzi agha ezi omume ma nyefezie ya chọọchị site n’aka ndị knight ya bụ́ ndị Kraịst.” (The Oxford History of Christianity) Ihe ndekọ ahụ na-agbakwụnye na nkwupụta okwu ụfọdụ nke popu dugara ihe ka ọtụtụ ná ndị agha ntụte ikwere na site n’ikere òkè n’agha ntụte, “ha na Chineke enwewo nkwekọrịta, na ha ejidewokwa n’aka inwe ọnọdụ na Paradaịs.”

Ụfọdụ pụrụ ịrụ ụka na ọ ga-ekwe omume iguzosi ike n’ihe nye Jisọs ma n’otu oge ahụ na-ekere òkè n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị, nakwa n’agha dị iche iche nke mba. Ha pụrụ iche na ọ bụ ọrụ onye Kraịst ịlụso ihe ọjọọ ọgụ n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ya nakwa na nke a na-agụnye ịlụ agha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa. Ma ndị Kraịst oge mbụ hà nwere echiche a?

“Ndị Kraịst oge mbụ ejeghị ozi n’òtù ndị agha,” ka otu isiokwu dị na magazin bụ́ The Christian Century na-ekwu. Ọ na-akọwa na ruo afọ iri nke 170-180 O.A., e nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na ndị Kraịst jere ozi n’usuu ndị agha. Mgbe ahụ, isiokwu ahụ na-agbakwụnye, sị: “Ọ bụ nanị nwayọọ nwayọọ ka ndị Kraịst ji gbahapụ mmegide ha na-emegide ije ozi agha.”

Gịnị bụ ihe ndị siworo na ya pụta? “Ikekwe ọ dịghị ihe meworo ka e ledaa Iso Ụzọ Kraịst anya karịa omume ya nke inwe nguzo fọrọ nke nta ka ọ ghara ịdị iche n’ebe nke ndị na-abụghị ndị Kraịst dị n’ihe metụtara ịlụ agha,” ka isiokwu ahụ dị na The Christian Century na-arịba ama. “Na ndị Kraịst n’otu akụkụ na-akwado okwukwe nke Onye Nzọpụta ahụ dị nwayọọ ebe n’aka nke ọzọ ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado agha okpukpe ma ọ bụ nke ịhụ mba n’anya emebiwo okwukwe n’ụzọ dị ukwuu.”

Iṅomi Ndị Kraịst Oge Mbụ Taa

Ọ̀ ga-ekwe omume ndị Kraịst taa iṅomi ihe nlereanya magburu onwe ya nke ndị Kraịst oge mbụ? Ndịàmà Jehova nke narị afọ a egosiwo na ọ ga-ekwe omume. N’ikwu banyere ha, onye nchịkọta akụkọ nke Holocaust Educational Digest kwuru, sị: “Ọ dịghị Onyeàmà Jehova ọ bụla ga-eje agha mgbe ọ bụla. . . . Ọ bụrụ na onye ọ bụla nke nọ n’ọkwá ọchịchị n’ụwa so n’okpukpe a, a garaghị alụ [Agha Ụwa nke Abụọ].”

A pụrụ ikwu otu ihe ahụ banyere agha ógbè ndị a lụrụ n’oge na-adịbeghị anya, dị ka nke ahụ kpọtụrụ na Northern Ireland. Afọ ole na ole gara aga, otu n’ime Ndịàmà Jehova nọ na-eme nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ n’ógbè ndị Protestant n’obodo Belfast. Otu onye nwe ụlọ, mgbe ọ nụsịrị na Onyeàmà ahụ bụbu onye Katọlik, jụrụ, sị: “Mgbe ị bụ onye Katọlik, ị kwadoro IRA [Òtù Ndị Agha Mba Ireland]?” Onyeàmà ahụ chọpụtara na nwoke ahụ pụrụ ime ihe ike n’ihi na a kpọchiwo ya mgbe e jidesịrị ya ka o ji egbe na-aga igbu onye Katọlik, a ka tọhapụkwara ya atọhapụ. Ya mere Onyeàmà ahụ zaghachiri, sị: “Abụghị m onye Katọlik ugbu a. Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Dị ka ezi onye Kraịst, ọ dịghị mgbe m ga-egburu gọọmenti ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mmadụ.” N’ihi nke ahụ onye ahụ nwe ụlọ kwere ya n’aka ma kwuo, sị: “Ụdị igbu mmadụ nile dịcha njọ. Unu na-arụ ezigbo ọrụ. Jidenụ nke unu ji.”

Ihe Inwe Okwukwe n’Aha Jisọs Pụtara

Otú ọ dị, inwe okwukwe n’aha Jisọs pụtara ihe karịrị nanị izere agha. Ọ pụtara irube isi n’ihe nile Kraịst nyere n’iwu. E kwuwerị, Jisọs kwuru, sị: “Unu onwe unu bụ ndị enyi m, ma ọ bụrụ na unu emee ihe Mụ onwe m na-enye unu n’iwu,” otu n’ime ihe ndị o nyere n’iwu bụkwa ka anyị “hụrịta ibe [anyị] n’anya.” (Jọn 15:14, 17) Ịhụnanya na-achọ imere ndị ọzọ ihe ọma. Ọ na-ewepụ ajọ mbunobi nile nke agbụrụ, okpukpe, na nke ọha na eze. Jisọs gosiri otú o si eme ya.

Ndị Juu nọ n’ụbọchị Jisọs nwere mmetụta siri ike megide ndị Sameria. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs gwara nwanyị Sameria okwu, n’ihi ya kwa, nwanyị ahụ na ọtụtụ ndị ọzọ kweere n’aha ya. (Jọn 4:39) Jisọs kwukwara na ndị na-eso ụzọ ya ga-abụ ndị àmà ya “n’ime Jerusalem, na n’ime Judia na Sameria nile, ruokwa ebe ụwa sọtụrụ.” (Ọrụ 1:8) Ozi ya na-enye ndụ abụghị nanị maka ndị Juu. N’ihi ya, e nyere Pita ntụziaka ileta ọchịagha Rom bụ́ Kọniliọs. Ọ bụ ezie na o zighị ezi n’iwu bụ́ onye Juu ileta onye agbụrụ ọzọ, Chineke gosiri Pita na ‘o kwesịghị ịkpọ mmadụ ọ bụla ihe rụrụ arụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ọcha.’—Ọrụ 10:28.

N’iṅomi Jisọs, Ndịàmà Jehova ji ọchịchọ obi na-enyere mmadụ nile aka—n’agbanyeghị ebo, okpukpe, ma ọ bụ ọnọdụ akụ na ụba ha—ịmụta banyere nzọpụta nke na-abịa site n’aha Jisọs. Okwukwe n’aha Jisọs na-akpali ha ‘iwere ọnụ ha kwupụta Jisọs na Ọ bụ Onyenwe anyị.’ (Ndị Rom 10:8, 9) Anyị na-agba gị ume ịnabata enyemaka ha ka gị onwe gị wee nweekwa ike ịmụta inwe okwukwe n’aha Jisọs.

Aha Jisọs kwesịrị n’ezie ịkpali mmetụta nke nsọpụrụ, nkwanye ùgwù, na nrubeisi. Pọl onyeozi kwuru, sị: “N’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, nke ihe nile dị n’eluigwe na ihe nile dị n’elu ụwa na ihe nile dị n’okpuru ala, ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke, bụ́ Nna, otuto.” (Ndị Filipaị 2:10, 11) Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ n’ime ndị bi n’ụwa nwere ike ghara ịdị njikere ido onwe ha n’okpuru ịchịisi Jisọs, Bible na-egosi na oge ahụ dị nso mgbe mmadụ nile na-aghaghị ime otú ahụ ma ọ bụ laa n’iyi. (2 Ndị Tesalonaịka 1:6-9) Ya mere, ugbu a bụ oge inwe okwukwe n’aha Jisọs site n’idebe ihe nile o nyere n’iwu.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee broshuọ bụ́ Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, peji nke 28-31, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara, 1987.

[Foto dị na peeji nke 6]

N’aha Jisọs, ọtụtụ nde mmadụ egbuwo ọchụ, e gbuwokwa ọtụtụ nde mmadụ

[Foto dị na peeji nke 7]

Jisọs enweghị ajọ mbunobi agbụrụ. Ì nwere?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya