Ị̀ Na-eji Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ya Ezi Ha Ozi Ọma?
1. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-eme n’ihi otú ihe si na-agbanwe n’ụwa?
1 Ná 1 Ndị Kọrịnt 7:31, Baịbụl ji ụwa tụnyere ebe a na-eme ihe nkiri. Ị manụ na ọ bụghị naanị otu agba ka ihe nkiri na-enwe. Ọ bụghịkwa naanị otu ndị na-eme ya. Otú ahụ ka ihe si na-agbanwe n’ụwa. N’ihi ya, o kwesịrị ịbụ anyị gụrụ, anyị elebara otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma anya. Anyị kwesịkwara iwepụtakwu oge na-aga ozi ọma. Ihe ọzọ anyị kwesịrị ịna-elebara anya bụ otú anyị si amalite ozi anyị. Ị̀ na-eji ihe ndị mmadụ na-ekwu gbasara ya ezi ha ozi ọma?
2. Mgbe ọ bụla nzukọ Jehova gwara anyị gbanwee otú anyị si ezi ndị mmadụ ozi ọma, gịnị mere anyị kwesịrị iji rube isi?
2 Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma: Kemgbe ụwa, ọ na-abụ nzukọ Jehova gụrụ, ya agbanwee ihe ụfọdụ. Mgbe mbụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ọ gwara ha ewerela akpa nri ma ọ bụ ego. (Mat. 10:9, 10) Ma, o mechara gwa ha were ihe ndị a n’ihi na ọ ma na ọtụtụ ndị agaghị anabata ha. Ihe ọzọ o kwo sị ha were ha bụ na ha ga-aga kwusaa ozi ọma n’obodo ndị ọzọ. (Luk 22:36) Kemgbe ihe karịrị otu narị afọ, anyị ejirila ụzọ dị iche iche zie ndị mmadụ ozi ọma. O nweela mgbe anyị na-eji kaadị, nweekwa mgbe anyị nwere ụlọ ọrụ redio anyị ji ezi ozi ọma. O nwekwara mgbe anyị na-eji ụgbọala a rụnyere ígwè okwu. Ma taa, anyị na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ụlọ ha. Anyị na-ezikwa ha ozi ọma n’ebe ọ bụla anyị hụrụ ha, ma mgbe anyị na-anọghị n’ozi. A na-agwakwa anyị ka anyị gbaa mbọ na-aga ozi ọma ụlọ n’ụlọ ná mgbede ma ọ bụrụ na ọ bụ mgbe ahụ ka anyị na-enwetakarị ndị mmadụ n’ụlọ. Anyị kwesịrị iso nzukọ Jehova na-aga ụkwụ na ụkwụ. Mgbe ọ bụla ọ gbanwere ihe, anyị esoro ya gbanwee.—Ezik. 1:20, 21.
3. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị jiri ihe ndị nọ n’ókèala anyị na-ekwukarị na-ezi ha ozi ọma?
3 Ihe Anyị na Ha Na-ekwurịta: Olee ihe ndị bi n’ókèala unu na-ekwukarị gbasara ya? Ọ̀ bụ otú ihe si sie ike n’ụwa? Ọ̀ bụ gbasara ezinụlọ? Ka hà na-ekwu gbasara otú ime mpụ si ju n’ebe niile? Ka ọ̀ bụ gbasara agha a na-alụ n’ọtụtụ ebe? Anyị kwesịrị ịgbalị mara ihe na-eme n’ókèala anyị ma jiri ya na-ezi ha ozi ọma. (1 Kọr. 9:20-23) Ndị mmadụ gwa anyi ihe na-enye ha nsogbu n’obi, ọ ga-aka mma ka anyị na ha kwurịta ihe ahụ kama ịgwawa ha ihe anyị bubu n’obi ịgwa ha.
4. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji jiri ihe ndị mmadụ na-ekwukarị gbasara ya zie ha ozi ọma?
4 “Oge fọdụrụ dị ntakịrị.” (1 Kọr. 7:29) Anyị kwuburu na Baịbụl ji ụwa a tụnyere ebe a na-eme ihe nkiri. Ọ gaghị adị anya e mechaa agba nke ikpeazụ, oké mkpagbu amalitekwa. N’ihi ya, anyị gaa ozi ọma chọpụta ihe ndị mmadụ na-ekwukarị gbasara ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ jiri ihe ahụ zie ha ozi ọma. Nke a ga-enyere anyị aka iji obere oge fọrọnụ nyere ọtụtụ ndị aka.